Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 113:1-9

113  Toonụ Jaa!+Nyenụ ya otuto, unu ndị ohu Jehova,+Toonụ aha Jehova.+   Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi+Malite ugbu a gaa n’ihu, ruo mgbe ebighị ebi.+   Malite n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda ya,+A ga na-eto aha Jehova.+   Jehova dị elu karịa mba niile;+Ebube ya dị elu karịa eluigwe.+   Ònye dị ka Jehova Chineke anyị,+Bụ́ onye mere ka ebe obibi ya dịrị n’ebe dị elu?+   Ọ na-ewetu onwe ya ala iji lee eluigwe na ụwa anya,+   Ọ na-esi n’ájá kulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya;+Ọ na-esi n’olulu ntụ bulie ogbenye elu,+   Iji mee ka o soro ndị a ma ama nọdụ ala,+Bụ́ ndị a ma ama n’etiti ndị Chineke.+   Ọ na-eme ka nwaanyị aga biri n’ụlọ,+Dị ka nne nwere obi ụtọ, nke mụrụ ọtụtụ ụmụ.+Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji