Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 11:1-7

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid. 11  Agbabawo m n’ime Jehova.+ Olee ihe mere unu ji na-asị mkpụrụ obi m: “Felaanụ n’ugwu unu dị ka nnụnụ!+   N’ihi na, lee! ndị ajọ omume na-ekwe ụta,+ Ha na-etinye akụ́ ha n’eriri ụta, Ka ha nọrọ n’ọchịchịrị gbaa ya ndị obi ha ziri ezi.+   Mgbe e bibiri ntọala,+ Gịnị ka onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume ga-eme?”   Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+ Jehova—n’eluigwe ka ocheeze ya dị.+ Anya ya na-ahụ, anya ya nke na-enwu gbaa na-enyocha+ ụmụ mmadụ.   Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume,+ Mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.+   Ọ ga-eme ka ọnyà ma ndị ajọ omume, meekwa ka ọkụ na sọlfọ zokwasị ha dị ka mmiri,+ Meekwa ka ifufe nke na-amịkpọ mmadụ bụrụ iko ha ga-aṅụ.+   N’ihi na Jehova bụ onye ezi omume;+ ọ hụrụ ezi omume n’anya.+ Ọ bụ ndị ziri ezi ga-ahụ ihu ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji