Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 1:1-6

1  Obi ụtọ na-adịrị+ onye na-adịghị eje ije na ndụmọdụ ndị ajọ omume,+Onye na-adịghịkwa eso ụzọ ndị mmehie,+Onye na-adịghịkwa anọ n’etiti ndị na-akwa emo.+   Kama iwu Jehova na-atọ ya ụtọ,+Ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị.+   Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,+Nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya,+Akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ,+Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.+   Ndị ajọ omume adịghị otú ahụ,Kama ha dị ka igbogbo ọka nke ifufe na-efesasị.+   Ọ bụ ya mere na ndị ajọ omume agaghị eguzo n’ikpe,+Ndị mmehie agaghịkwa eguzo ná nzukọ ndị ezi omume.+   N’ihi na Jehova maara ụzọ ndị ezi omume,+Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-ala n’iyi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji