Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ákwá 5:1-22

5  Jehova, biko, cheta ihe mere anyị.+ Lee anya hụ nkọcha a kọchara anyị.+   E werewo ihe nketa anyị nyefee ndị ala ọzọ, werekwa ụlọ anyị nyefee ndị mba ọzọ.+   Anyị aghọwo ụmụ mgbei na-enweghị nna.+ Nne anyị hà dịzi ka ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ.+   Mmiri anyị ka anyị na-ejizi ego azụrụ.+ Nkụ anyị ka anyị na-akwụ ụgwọ iji nweta.   Ọ fọla ntakịrị ka ndị na-achụ anyị jide anyị.+ Ike agwụla anyị. Ezumike adịrịghị anyị.+   Anyị na-asaghere Ijipt+ aka;+ anyị na-asaghekwara Asiria aka+ ka ha nyejuo anyị nri afọ.   Ọ bụ ndị nna nna anyị mehiere.+ Ha anọkwaghị. Anyị na-ata ahụhụ njehie ha.+   Ọ bụ ndị ohu na-achị anyị.+ Ọ dịghị onye na-anapụta anyị n’aka ha.+   Anyị na-etinye mkpụrụ obi anyị n’ihe ize ndụ iji nweta ihe anyị ga-eri,+ n’ihi mma agha nke dị n’ala ịkpa. 10  Akpụkpọ ahụ́ anyị adịwo ọkụ dị ka ekwú ọkụ, n’ihi ụfụ ịnọ agụụ na-afụ.+ 11  Ha metọrọ ndị nwunye nọ na Zayọn,+ tinyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke nọ n’obodo ndị dị na Juda. 12  A kwụgbuola ndị isi site n’ịkwụwa naanị aka ha n’elu.+ A sọpụrụghị ọbụna ihu ndị agadi.+ 13  Ọbụna ụmụ okorobịa eburula nkume igwe nri,+ ụmụ okoro bu nkụ na-adagbugharịkwa.+ 14  Ndị agadi akwụsịwo ịnọ n’ọnụ ụzọ ámá,+ ụmụ okorobịa akwụsịwokwa egwú ha na-akụ.+ 15  Obi anyị akwụsịwo ịṅụrị ọṅụ. Egwú anyị na-agba aghọwo naanị iru uju.+ 16  Okpueze anyị kpu n’isi adapụla.+ Anyị efuola, n’ihi na anyị emehiewo!+ 17  N’ihi ya, obi anyị na-arịa ọrịa.+ Anya anyị na-ahụzi inyoghi inyoghi n’ihi ihe ndị a,+ 18  N’ihi ugwu Zayọn nke e mere ka ọ tọgbọrọ n’efu;+ nkịta ọhịa na-ejegharị na ya.+ 19  Ma gị onwe gị, Jehova, ị ga-anọdụ n’ocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.+ Ọ ga-adịru ọgbọ niile.+ 20  Gịnị mere i ji chefuo anyị ruo mgbe ebighị ebi,+ gịnịkwa mere i ji gbahapụ anyị ruo ọtụtụ ụbọchị?+ 21  Jehova, biko, kpọghachite anyị+ n’ebe ị nọ, anyị ga-alọghachikwa ozugbo. Wetara anyị ụbọchị ọhụrụ dị ka n’ogologo oge gara aga.+ 22  Otú ọ dị, ị jụwo anyị kpamkpam.+ I wesowo anyị iwe nke ukwuu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji