Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ákwá 3:1-66

א [Alef] 3  Abụ m dimkpa nke nọ n’ahụhụ+ n’ihi mkpanaka nke oké iwe ya.   Ọ bụ m ka o duuru wee mee ka m na-eje ije n’ọchịchịrị, ọ bụghị n’ìhè.+   N’ezie, ọ bụ m ka ọ tụgharịrị aka ya ugboro ugboro megide ogologo ụbọchị dum.+ ב [Bet]   O mewo ka anụ ahụ́ m na akpụkpọ ahụ́ m laa n’iyi.+ Ọ gbajisịala ọkpụkpụ m.+   O wuola mgbidi iji nọchibido m,+ ka o wee jiri ahịhịa na-egbu mmadụ+ nakwa ihe isi ike gbaa m gburugburu.   O mewo ka m nọdụ n’ebe gbara ọchịchịrị+ dị ka ndị nwụrụ kemgbe.+ ג [Gimel]   O jiriwo nkume wuchibido m mgbidi, ka m ghara ịpụ.+ Ọ tụwo m ịgà dị aro ndị e ji ọla kọpa mee.+   Mgbe ọ bụla m kpọrọ òkù ka o nyere m aka, tiekwa mkpu enyemaka, ọ naghị ekwe ka ekpere m ruo ya ntị.+   O jiriwo nkume a wara awa dochie n’ụzọ m.+ Ọ gbagọọla okporo ụzọ m.+ ד [Dalet] 10  N’ebe m nọ, ọ dị ka anụ ọhịa bea nke gara zoo chebiri m,+ dịrịkwa ka ọdụm nọ n’ebe zoro ezo.+ 11  O meghasịala ụzọ m, o mewokwa ka m tọgbọrọ nkịtị. O mewo m ka m bụrụ ihe tọgbọrọ n’efu.+ 12  O kwewo ụta+ ya wee tụgide m akụ́ ya.+ ה [Hee] 13  Ọ gbawo akụ́ niile dị n’akpa akụ́ ya n’akụrụ m.+ 14  Ndị niile na-emegide m na-achị m ọchị,+ ha na-eji m agụ egwú ogologo ụbọchị dum.+ 15  O mewo ka m rijuo ihe ilu afọ.+ O mewo ka m tajuo ahịhịa ilu afọ.+ ו [Wọọ] 16  Ọ na-eme ka m taa ajịrịja nkume tajisịa ezé.+ O mewo ka m tụrụọ ná ntụ.+ 17  Ị jụwokwa m wee mee ka mkpụrụ obi m ghara inwe udo. Echefuola m ihe dị mma.+ 18  M nọ na-asị: “Ịma mma m alawo n’iyi, ihe m na-atụ anya inweta n’aka Jehova alawokwa n’iyi.”+ ז [Zayin] 19  Cheta na m nọ ná mmekpa ahụ́, na enweghị m ebe obibi.+ Chetakwa na m na-ata ahịhịa ilu na ahịhịa na-egbu mmadụ.+ 20  Mkpụrụ obi gị aghaghị icheta m wee hulata n’ebe m nọ.+ 21  Nke a bụ ihe m ga-echeta.+ Ọ bụ ya mere m ga-eji chere.+ ח [Het] 22  Ọ bụ obiọma*+ Jehova mere na anyị anwụchabeghị,+ n’ihi na ebere ya agaghị agwụ agwụ.+ 23  Ha na-adị ọhụrụ kwa ụtụtụ.+ Ikwesị ntụkwasị obi gị bara ụba.+ 24  Mkpụrụ obi m kwuru, sị, “Jehova bụ òkè m,+ ọ bụ ya mere m ga-eji chere ya.”+ ט [Tet] 25  Jehova dị mma nye onye nwere olileanya n’ebe ọ nọ,+ nye mkpụrụ obi nke na-achọ ya.+ 26  Ọ dị mma ka mmadụ gba nkịtị+ chere+ nzọpụta Jehova.+ 27  Ọ dị mma ka nwoke buru yok ya n’oge ọ bụ okorobịa.+ י [Yod] 28  Ya nọrọ ọdụ naanị ya gbachie nkịtị,+ n’ihi na o bowo ya ibu arọ.+ 29  Ya sọnye ọnụ n’ájá.+ Ma eleghị anya, olileanya dị.+ 30  Ya cheziere onye na-ama ya ụra ntì ya.+ Ka nkọcha ju ya afọ.+ כ [Kaf] 31  N’ihi na Jehova agaghị ajụ anyị ruo mgbe ebighị ebi.+ 32  N’ihi na ọ bụ ezie na ọ kpatara iru uju,+ ọ ga-emekwa ebere dị ka obiọma ya si dị ukwuu.+ 33  N’ihi na ahụhụ ọ na-enye ụmụ mmadụ na uju ọ na-eme ka ha ruo esighị ya n’obi.+ ל [Lamed] 34  Iji ụkwụ+ zọpịa ndị mkpọrọ niile nke ụwa,+ 35  Ịgbagọ ikpe nwoke n’ihu Onye Kasị Elu,+ 36  Na ịgbagọ ikpe mmadụ bụcha ihe Jehova na-akwadoghị.+ מ [Mem] 37  Ònye kwuru ka ihe mee mgbe Jehova na-enyeghị iwu ka o mee?+ 38  Ihe ọjọọ na ihe ọma anaghị esi n’ọnụ Onye Kasị Elu apụta.+ 39  Gịnị mere mmadụ dị ndụ, bụ́ dimkpa mmadụ, ga-eji na-eme mkpesa+ n’ihi mmehie ya?+ נ [Nun] 40  Ka anyị chọọ ụzọ anyị, nyochaakwa ya,+ ka anyị laghachikwuru Jehova.+ 41  Ka anyị gbasapụrụ Chineke bi n’eluigwe obi anyị na ọbụ aka anyị,+ sị: 42  “Anyị onwe anyị emebiwo iwu, anyị enupụwokwa isi.+ Gị onwe gị agbagharaghị.+ ס [Samek] 43  I jiriwo iwe gị gbochie anyị ịbịakwute gị,+ ị na-achụpụkwa anyị.+ I gbuwo ndị mmadụ n’enweghị ọmịiko.+ 44  I jiriwo ígwé ojii gbochie anyị ịbịakwute gị,+ ka ekpere ghara ịgafe ya.+ 45  I mere ka anyị bụrụ ihe a wụfuru awụfu na ihe e kpofuru ekpofu n’etiti ndị dị iche iche.”+ פ [Pee] 46  Ndị iro anyị niile ekwuwo okwu megide anyị.+ 47  Ụjọ na olulu abụrụwo nke anyị,+ tinyere ntọgbọrọ n’efu na mbibi.+ 48  Anya mmiri si m n’anya na-asọpụta dị ka iyi n’ihi mbibi e bibiri ada bụ́ ndị m.+ ע [Ayin] 49  Anya mmiri na-awụpụta m n’anya n’akwụsịghị akwụsị,+ 50  Ruo mgbe Jehova si n’eluigwe ledata anya wee hụ anyị.+ 51  Anya m emesiwo mkpụrụ obi m ike,+ n’ihi obodo nta niile nke obodo m.+ צ [Sadee] 52  Ndị iro m na-achụ nta m dị ka à ga-asị na m bụ nnụnụ,+ n’enweghị ihe m mere ha.+ 53  Ha alawo ndụ m n’iyi n’ime olulu,+ ha nọkwa na-atụ m nkume. 54  Mmiri asọfewo m n’isi.+ Asịwo m: “A ga-ebipụrịrị m!”+ ק [Kof] 55  Jehova, esiwo m n’ime ime olulu kpọkuo aha gị.+ 56  Nụrụ olu m.+ Ewepụla ntị gị wee ghara ịnapụta m, wee ghara ịnụ mkpu enyemaka m na-eti.+ 57  Ị bịakwutere m n’ụbọchị m kpọkuru gị.+ Ị sịrị: “Atụla egwu.”+ ר [Resh] 58  Jehova, i kpechiteworo mkpụrụ obi m ọnụ ya.+ Ị gbapụtawo ndụ m.+ 59  Jehova, ị hụwo ihe ọjọọ e mere m.+ Biko, kpeere m ikpe.+ 60  Ị hụwo ọbọ niile ha bọrọ, bụ́ ihe niile ha na-eche n’echiche megide m.+ ש [Sin] ma ọ bụ [Shin] 61  Jehova, ị nụwo nkọcha ha na-akọcha m, ihe niile ha na-eche n’echiche megide m,+ 62  Ị nụkwara okwu na-esi n’egbugbere ọnụ nke ndị na-ebili megide m+ nakwa izu ha na-agba megide m ogologo ụbọchị dum.+ 63  Hụrụ mgbe ha nọdụrụ ala na mgbe ha biliri ọtọ.+ Ha ji m agụ egwú.+ ת [Tọọ] 64  Jehova, ị ga-emeso ha dị ka ọrụ aka ha si dị.+ 65  Ị ga-eme ka obi ha dị nganga,+ bụ́ ọnụ ị bụrụ ha.+ 66  Jehova, ị ga-eji iwe chụọ ha ọsọ wee kpochapụ ha+ n’okpuru eluigwe gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ákw 3:22*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”