Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ákwá 2:1-22

א [Alef] 2  Ewoo, lee ka Jehova si were ígwé ojii kpuchie ada bụ́ Zayọn n’iwe ya!+ O siwo n’eluigwe tụda ịma mma Izrel+ n’ala.+ O chetaghịkwa ihe mgbakwasị ụkwụ+ ya n’ụbọchị iwe ya. ב [Bet]   Jehova elodawo ebe obibi niile nke Jekọb, o nweghịkwara nke ọ bụla n’ime ha ọmịiko.+ N’oké iwe ya, ọ kwatuwo ebe niile e wusiri ike+ nke ada bụ́ Juda. O mewo ka ọ daruo ala,+ o merụwo alaeze ya+ na ndị isi ya.+ ג [Gimel]   N’oké iwe ya, o gbutuwo mpi niile dị n’Izrel.+ O serewo aka nri ya mgbe onye iro na-ebuso Izrel agha;+ N’ime Jekọb ka ọ na-ere dị ka ọkụ nke repịaworo ihe niile gbara ya gburugburu.+ ד [Dalet]   O kwewo ụta ya dị ka onye iro.+ Aka nri ya+ adịwo njikere Dị ka onye mmegide,+ ọ nọkwa na-egbu ndị niile mara mma.+ Ọ wụsawo ụlọikwuu+ nke ada bụ́ Zayọn ọnụma ya nke dị ka ọkụ.+ ה [Hee]   Jehova adịwo ka onye iro.+ O lodawo Izrel.+ O lodawo ụlọ elu ya niile;+ o bibiwo ebe ya niile e wusiri ike.+ O mekwara ka e nwee oké iru uju na ịkwa ákwá arịrị n’ime ada bụ́ Juda.+ ו [Wọọ]   Ọ na-emesokwa ụlọ ndò ya+ ihe ike dị ka ụlọ akịrịka dị n’ubi.+ Ọ lawo ememme ya n’iyi. Jehova emewo ka e chefuo ememme+ na ụbọchị izu ike n’ime Zayọn, N’oké iwe ya, ọ dịghị akwanyere eze na onye nchụàjà ùgwù.+ ז [Zayin]   Jehova ajụwo ebe ịchụàjà ya.+ O legharawo ebe nsọ ya anya.+ O nyefewo mgbidi niile nke ụlọ elu ya n’aka onye iro.+ Ha na-eme mkpọtụ n’ụlọ Jehova, dị ka à ga-asị na ọ bụ ụbọchị ememme.+ ח [Het]   Jehova echewo echiche ịla mgbidi+ nke ada bụ́ Zayọn n’iyi. O setịala eriri e ji atụ̀ ihe.+ O sepụghị aka n’ibibi ihe.+ Ọ na-emekwa ka ékpè na mgbidi ruwe uju.+ Ha adakasịala. ט [Tet]   Ọnụ ụzọ ámá ya+ niile emiela ala. O bibiwo ihe niile e ji atụchi ha, kụriekwa ha. Eze ya na ndị isi ya nọ n’ime mba dị iche iche.+ E nweghị iwu ọ bụla.+ Ndị amụma ya ahụghịkwa ọhụụ ọ bụla site n’aka Jehova.+ י [Yod] 10  Ndị okenye nke ada bụ́ Zayọn nọ ọdụ n’ala nkịtị, bụ́ ebe ha deere duu.+ Ha kpokwasịrị onwe ha ájá n’isi.+ Ha kere ákwà iru uju n’úkwù.+ Ụmụ agbọghọ Jeruselem ekpudowo ihu n’ala.+ כ [Kaf] 11  Anya akpọọla m ebe m na-akwa ákwá.+ Afọ agbarụwo m.+ Imeju m awụsarala n’ala dị ka mmiri,+ n’ihi na e bibiwo ada bụ́ ndị m,+ N’ihi na ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara na-ada mbà n’ámá obodo.+ ל [Lamed] 12  Ha nọ na-ajụ nne ha, sị: “Olee nri na mmanya?”+ N’ihi na ha na-ada mbà dị ka ndị e gburu n’ámá obodo, N’ihi na a na-awụpụ mkpụrụ obi ha mgbe ha nọ n’obi nne ha. מ [Mem] 13  Gịnị ka m ga-ewetara gị ka ọ bụrụ ihe akaebe? Gịnị ka m ga-asị na ị dị ka ya, gị ada bụ́ Jeruselem?+ Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị, ka m wee kasie gị obi, gị ada na-amaghị nwoke bụ́ Zayọn?+ N’ihi na mbibi gị+ dị nnọọ ukwuu dị ka oké osimiri. Ònye ga-agwọ gị?+ נ [Nun] 14  Ndị amụma gị ahụwo ọhụụ ihe na-abaghị uru na ihe na-adịghị enye afọ ojuju,+ Ha ekpugheghị njehie gị iji mee ka a ghara ịdọrọ gị n’agha,+ Kama nke ahụ, ha nọ na-ahụtara gị okwu na-abaghị uru na nke na-eduhie eduhie n’ọhụụ.+ ס [Samek] 15  Ndị niile na-agabiga n’okporo ụzọ na-akụrụ gị aka ịkwa emo.+ Ha afụwo mkpọrọhịhị,+ na-efufekwa isi+ n’ihi ada bụ́ Jeruselem, na-asị: “Ihe a ọ̀ bụ obodo ahụ ndị mmadụ na-asịbu, ‘Ọ bụ ebe mma ruru gwụ, ebe na-eme ka ụwa dum ṅụrịa ọnụ’?”+ פ [Pee] 16  Ndị iro gị niile emeghewo ọnụ ha megide gị.+ Ha afụwo mkpọrọhịhị, na-atakwa ikikere ezé.+ Ha asịwo: “Anyị ga-eloda ya.+ Taa bụ n’ezie ụbọchị anyị nọ na-atụ anya ya.+ Anyị enwetawo ya! Anyị ahụwo ya!”+ ע [Ayin] 17  Jehova emewo ihe o bu n’obi.+ O mezuwo ihe o kwuru,+ Bụ́ ihe o nyere n’iwu ogologo oge gara aga.+ O tidawo ihe niile n’enweghị ọmịiko ọ bụla.+ O mekwara ka onye iro na-aṅụrị ọṅụ n’ihe mere gị.+ O mewo ka mpi nke ndị na-emegide gị dị elu.+ צ [Sadee] 18  Obi ha etikuwo Jehova,+ gị mgbidi nke ada bụ́ Zayọn.+ Mee ka anya mmiri na-asọ dị ka iyi, ehihie na abalị.+ Emela ka ahụ́ sie gị. Ka nwa anya gị ghara ịkwụsị ịgbapụta anya mmiri. ק [Kof] 19  Bilie! Tie mkpu n’abalị ná mmalite nche ụtụtụ.+ Wụpụ ihe dị gị n’obi dị ka mmiri+ n’ihu+ Jehova. Gbasapụrụ ya ọbụ aka gị+ n’ihi mkpụrụ obi ụmụ gị, Bụ́ ndị na-ada mbà n’ihi ụnwụ dị n’isi okporo ámá niile.+ ר [Resh] 20  Jehova, biko, lee+ ma hụ onye i mesiworo ike otú a. Ò kwesịrị ka ndị inyom na-eri mkpụrụ nke afọ ha, bụ́ ụmụ ha ahụ́ dị mma,+ Ka è kwesịrị igbu onye nchụàjà na onye amụma n’ebe nsọ Jehova?+ ש [Shin] 21  Nwa okoro na agadi+ atọgbọrọwo n’ala, n’okporo ámá.+ E jiriwo mma agha gbuo ụmụ agbọghọ m na ụmụ okorobịa m.+ I gbuwo ha n’ụbọchị iwe gị.+ I gbuwo ha+ n’enweghị ọmịiko.+ ת [Tọọ] 22  Dị ka n’ụbọchị ememme,+ i si n’obodo niile ndị m bi dị ka ndị mbịarambịa kpọkọta ha. E nweghịkwa onye lanahụrụ ma ọ bụ onye gbapụrụ+ n’ụbọchị ọnụma Jehova; Onye iro m gbuchapụrụ ụmụ m ahụ́ dị mma, bụ́ ndị m zụlitere.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji