Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ákwá 1:1-22

א [Alef] 1  Ewoo, lee ka obodo nke ndị mmadụ jupụtaburu+ na ya si tọgbọrọ n’efu!+Lee ka nwaanyị nke nweburu ụba mmadụ n’etiti mba niile+ si yie nwaanyị di ya nwụrụ!+Lee ka onye bụbu eze nwaanyị n’etiti ógbè dị iche iche sizi bụrụ onye a na-amanye ịrụ ọrụ!+ ב [Bet]   Ọ na-akwagbu onwe ya n’ákwá n’abalị,+ anya mmiri na-asọda ya na ntì.+Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị niile hụrụ ya n’anya nke na-akasi ya obi.+Ndị enyi ya niile aghọgbuwo ya.+ Ha aghọwo ndị iro ya.+ ג [Gimel]   Juda agawo biri n’ala ọzọ n’ihi ahụ́ e mekpara ya+ nakwa n’ihi ajọ ohu ọ na-agba.+Ya onwe ya ebiriwo n’etiti mba dị iche iche.+ Ọ hụghị ebe ọ ga-ezu ike.Ndị niile na-akpagbu ya akparawo ya aka n’ọnọdụ ọjọọ ọ nọ na ya.+ ד [Dalet]   Ụzọ niile e si aga Zayọn na-eru uju, n’ihi na ọ dịghị onye na-abịa ememme.+E mewo ka ọnụ ụzọ ámá ya niile tọgbọrọ n’efu;+ ndị nchụàjà ya na-asụ ude.+Ụmụ agbọghọ ya na-amaghị nwoke na-eru uju, ya onwe ya nọkwa n’obi ilu.+ ה [Hee]   Ndị na-emegide ya abụrụwo ndị isi.+ Ndị iro ya na-eme ka ọ gbasaghị ha.+Ebe ọ bụ na Jehova mere ka o ruo uju n’ihi ọtụtụ iwu o mebiri,+A dọrọwo ụmụ ya n’agha na-aga n’ihu onye mmegide.+ ו [Wọọ]   Ịma mma niile nke ada bụ́ Zayọn esiwo n’ahụ́ ya pụọ.+Ndị isi ya dị ka oké ele ndị na-ahụghị ebe ha ga-ata ahịhịa;+Ha na-eje ije n’enweghị ume ọ bụla n’ihu onye na-achụ ha.+ ז [Zayin]   N’oge Jeruselem nọ n’ahụhụ nakwa n’oge ndị ya nọ n’enweghị ebe obibi, o chetawoIhe ya niile dị oké ọnụ ahịa ndị dịwara kemgbe ogologo oge gara aga.+Mgbe ndị ya dabara n’aka onye mmegide, mgbe ọ na-enweghịkwa onye inyeaka,+Ndị na-emegide ya hụrụ ya. Ha chịrị ya ọchị mgbe ọ dara.+ ח [Het]   Jeruselem emewo ihe doro anya na ọ bụ mmehie.+ Ọ bụ ya mere o ji ghọọ ihe na-asọ oyi.+Ndị niile na-akwanyere ya ùgwù ejikwaghị ya kpọrọ ihe,+ n’ihi na ha ahụwo ọtọ ya.+Ya onwe ya kwa na-asụ ude,+ chee ihu n’ebe ọzọ. ט [Tet]   Adịghị ọcha ya dị n’uwe mwụda ya.+ O chetaghị ọdịnihu ya,+O wee daa ọdịda dị egwu. O nweghị onye nkasi obi ọ bụla.+Jehova, lee mmekpa ahụ́ m,+ n’ihi na onye iro m ebuliwo onwe ya elu.+ י [Yod] 10  Onye na-emegide ya agbasawo aka ya ibukọrọ ihe ya niile a na-achọsi ike.+N’ihi na ọ hụwo mba ndị batara n’ebe nsọ ya,+Ndị i nyere iwu ka ha ghara ịbata n’ọgbakọ gị. כ [Kaf] 11  Ndị ya niile na-asụ ude; ha na-achọgharị ihe oriri.+Ha ejiriwo ihe ha niile a na-achọsi ike gbanweta ihe ha ga-eri, ka mkpụrụ obi ha nwee ume.+Jehova, biko, lee, n’ihi na m dịzi ka nwaanyị na-abaghị uru.+ ל [Lamed] 12  Ọ̀ bụ na o nweghị ihe nke a bụụrụ unu niile ndị na-agafe n’ụzọ? Leenụ anya hụrụ.+È nwere ihe mgbu yiri ihe mgbu e mere ka m nwee,+Bụ́ iru uju Jehova kpatara n’ụbọchị oké iwe ya?+ מ [Mem] 13  O siwo n’elu mee ka ọkụ banye n’ọkpụkpụ m,+ ọ na-emerikwa nke ọ bụla.Ọ gbasawo ụgbụ ka o jide ụkwụ m.+ O mewo ka m laghachi azụ.O mewo ka m ghọọ nwaanyị tọgbọrọ n’efu. Ọrịa na-arịa m ụbọchị niile.+ נ [Nun] 14  Ọ na-ahụzu iwu niile m na-emebi.+ Ha kekọtara onwe ha n’aka ya.Ha erutewo m n’olu.+ Ike agwụla m.Jehova enyefewo m n’aka ndị ka m ike.+ ס [Samek] 15  Jehova esiwo n’ime m tụpụsịa ndị m niile dị ike.+Ọ kpọwo òkù ka e zukọta megide m, iji kụrisịa ụmụ okorobịa m.+Jehova azọchawo mkpụrụ n’ebe nzọchapụta mmanya+ nke ada Juda na-amaghị nwoke.+ ע [Ayin] 16  M na-akwara ihe ndị a ákwá.+ Anya mmiri na-agbapụta m n’anya.+N’ihi na onye nkasi obi nọ m n’ebe dị anya, bụ́ onye ga-eme ka mkpụrụ obi m nwee ume.Ụmụ m aghọwo ndị e mere ka ha tọgbọrọ n’efu,+ n’ihi na onye iro ebuliwo onwe ya elu.+ פ [Pee] 17  Zayọn agbasapụwo aka ya.+ O nweghị onye nkasi obi ọ bụla.+Jehova enyewo ndị niile gbara Jekọb gburugburu, bụ́ ndị na-emegide ya, iwu banyere ya.+Jeruselem abụrụwo ihe na-asọ oyi n’etiti ha.+ צ [Sadee] 18  Jehova bụ onye ezi omume,+ n’ihi na m nupụrụ isi n’ihe o kwuru.+Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị niile, hụkwanụ ihe mgbu m.A dọrọwo ụmụ agbọghọ m na-amaghị nwoke na ụmụ okorobịa m n’agha.+ ק [Kof] 19  Akpọkuwo m ndị niile hụrụ m n’anya nke ukwuu.+ Ha aghọwo m aghụghọ.Ndị nchụàjà m na ndị agadi m ekubiwo ume n’ime obodo,+Mgbe ha na-achọgharị ihe ha ga-eri ka mkpụrụ obi ha nwee ume.+ ר [Resh] 20  Jehova, lee, anọ m n’oké ihe isi ike. Afọ agbarụwo m.+Obi agbawaala m+ n’ihi na m nupụrụ isi nke ukwuu.+Mma agha emewo ka m gbara aka nwa n’èzí.+ Otu ọnwụ ahụ ka a na-anwụ n’ime ụlọ.+ ש [Shin] 21  Ndị mmadụ anụwo otú m si na-asụ ude.+ Ọ dịghị onye na-akasi m obi.+Ndị iro m niile anụwo banyere ọdachi dakwasịrị m.+ Ha aṅụrịwo ọṅụ n’ihi na ọ bụ gị mere ka ọ dakwasị m.+Ị ga-eme ka ụbọchị nke ị kpọsara bịa,+ ka ha wee dịrị ka m.+ ת [Tọọ] 22  Ka ihe ọjọọ niile ha na-eme rute n’ihu gị, mesiekwa ha ike,+Dị nnọọ ka i mesiri m ike n’ihi njehie m niile.+N’ihi na m na-asụ ude nke ukwuu,+ obi m na-arịakwa ọrịa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji