Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 59:1-21

59  Lee! Aka Jehova adịghị mkpụmkpụ nke na ọ pụghị ịzọpụta unu,+ ọ bụghịkwa onye ntị ike nke na ọ pụghị ịnụ ihe.+  Ee e, kama ọ bụ njehie unu bụ ihe na-ekewa unu na Chineke unu,+ ọ bụkwa mmehie unu mere o ji wepụ ihu ya n’ebe unu nọ ka ọ ghara ige unu ntị.+  N’ihi na ọbụ aka unu jupụtara n’ọbara,+ mkpịsị aka unu jupụtakwara ná njehie. Egbugbere ọnụ unu ekwuwo okwu ụgha.+ Ire unu na-atamukwa naanị ajọ omume.+  Ọ dịghị onye na-eti mkpu n’ezi omume,+ ọ dịghịkwa onye ọ bụla jeworo n’ụlọikpe n’ikwesị ntụkwasị obi. Unu na-atụkwasị obi n’ihe na-enweghị ihe ọ bụ,+ na-ekwukwa ihe efu.+ Unu atụrụwo ime nsogbu, mụọkwa ihe ọjọọ.+  Ọ bụ àkwá nke agwọ ọjọọ ka ha bụworo, ha na-akpakwa ọnyà ududo.+ Onye ọ bụla nke riri àkwá ya ga-anwụ, ajụala ga-esikwa n’àkwá ya nke kụwara akụwa pụta.+  Ọnyà ududo ha agaghị abụrụ ha uwe, ha agaghịkwa eji ọrụ aka ha kpuchie onwe ha.+ Ọrụ ha bụ ọrụ ọjọọ, ọbụ aka ha jupụtara n’ime ihe ike.+  Ụkwụ ha na-agbaba naanị n’ihe ọjọọ,+ ha na-emekwa ngwa ngwa ịwụfu ọbara na-emeghị ihe ọjọọ.+ Echiche ha bụ echiche ọjọọ.+ Ibukọrọ ihe mmadụ na itikpọ ihe mmadụ dịkwa n’okporo ụzọ ha.+  Ha elegharawo ụzọ udo anya,+ ọ dịghịkwa ikpe ziri ezi dị n’ụzọ ha.+ Ha emewo ka okporo ụzọ ha niile gbagọọrọ ha agbagọ.+ Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-eje ije na ha nke ga-enwe udo.+  Ọ bụ ya mere ikpe ziri ezi ji dị anya n’ebe anyị nọ, ezi omume adịghịkwa erute n’ebe anyị nọ. Anyị na-ele anya ìhè, ma, lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ; anyị na-ele anya ka ebe niile nwuo gbaa, ma, ọ bụ n’ọchịchịrị na-adịghị akwụsị akwụsị ka anyị nọ na-ejegharị.+ 10  Anyị na-asọgharị ìsì ná mgbidi dị ka ndị ìsì, anyị na-asọgharịkwa ìsì dị ka ndị na-enweghị anya.+ Anyị akpọwo ụkwụ n’ihe n’etiti ehihie dị ka à ga-asị na ọ bụ mgbe chi jiri. N’etiti ndị gbasiri ike, anyị dị ka ndị nwụrụ anwụ.+ 11  Anyị na-asụ ude, anyị niile, dị ka anụ ọhịa bea; anyị na-na-eru uju, na-ebe ubé dị ka nduru.+ Anyị nọ na-ele anya ikpe ziri ezi,+ ma ọ dịghị nke dịnụ; anyị nọkwa na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya n’ebe anyị nọ.+ 12  N’ihi na nnupụisi anyị adịla ọtụtụ n’ihu gị;+ nke ọ bụla n’ime mmehie anyị agbawo akaebe megide anyị.+ N’ihi na anyị na nnupụisi anyị nọ; anyị makwaara njehie anyị nke ọma.+ 13  Anyị emebiwo iwu, gọnahụkwa Jehova;+ anyị hapụkwara Chineke laa azụ, na-ekwu okwu banyere mmegbu na nnupụisi,+ na-echepụta okwu ụgha, na-atamukwa ya n’obi.+ 14  Anyị kwaghachiri ikpe ziri ezi azụ,+ ezi omume gara guzoro n’ebe dị anya.+ N’ihi na eziokwu asụwo ngọngọ n’ámá, ihe ziri ezi apụghịkwa ịbata.+ 15  Eziokwu alaala,+ a na-ebukọrọkwa ihe onye ọ bụla nke sepụrụ aka n’ihe ọjọọ.+ Jehova wee hụ ya, o wee bụrụ ihe ọjọọ n’anya ya na ikpe ziri ezi adịghị.+ 16  Mgbe ọ hụrụ na ọ dịghị onye nọnụ, o juru ya anya na ọ dịghị onye na-agbachitere ya.+ Ogwe aka ya wee wetara ya nzọpụta, ọ bụkwa ezi omume ya kwadoro ya.+ 17  O wee yiri ezi omume dị ka uwe agha,+ kpurukwa okpu agha nke nzọpụta n’isi ya.+ O yiiri uwe ịbọ ọbọ,+ werekwa ịnụ ọkụ n’obi kpuchie onwe ya dị ka uwe elu na-enweghị aka.+ 18  Ọ ga-akwụ ndị mmadụ ụgwọ dị ka omume ha si dị.+ Ndị na-emegide ya ga-enweta ọnụma, ndị iro ya ga-enweta mmeso kwesịrị ha.+ Ọ ga-akwụ agwaetiti niile ụgwọ kwesịrị ha.+ 19  Malite n’ebe ọdịda anyanwụ, a ga-ebido ịtụ egwu aha Jehova,+ malitekwa n’ebe ọwụwa anyanwụ, a ga-ebido ịtụ egwu ebube ya,+ n’ihi na ọ ga-abata dị ka osimiri nke na-akpata nsogbu, nke mmụọ Jehova mere ka ọ na-asọ asọ.+ 20  “Onye Mgbapụta+ ga-abịa na Zayọn,+ bịakwutekwa ndị na-esepụ aka ná mmebi iwu n’ime Jekọb,”+ ka Jehova kwuru. 21  “Nke a bụ ndụ mụ na ha gbara,”+ ka Jehova kwuru. “Mmụọ m nke dị n’ahụ́ gị+ nakwa okwu m nke m tinyere n’ọnụ gị+—a gaghị ewepụ ya n’ọnụ gị ma ọ bụ n’ọnụ ụmụ gị ma ọ bụ n’ọnụ ụmụ ụmụ gị, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi,”+ ka Jehova kwuru.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji