Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 57:1-21

57  Onye ezi omume alawo n’iyi,+ ma ọ dịghị onye ọ na-emetụ n’obi.+ Ndị obiọma* na-anwụ,+ ma ọ dịghị onye na-amata na ihe mere onye ezi omume ji nwụọ bụ iji mee ka o zere ọdachi.+  Ọ na-enwe udo;+ onye ọ bụla nke na-eje ije n’ụzọ kwụ ọtọ+ na-ezuru ike+ n’ihe ndina ya.+  “Ma unu onwe unu, bịanụ ebe a,+ unu ụmụ nke nwaanyị na-akọ ọdịnihu,+ mkpụrụ nke onye na-akwa iko na mkpụrụ nke nwaanyị na-agba akwụna:+  Ùnu na-ekpori ndụ iji megide onye?+ Ùnu na-emeghe ọnụ, na-arapụtakwa ire, iji megide onye?+ Ọ̀ bụ na unu abụghị ụmụ nke mmebi iwu, mkpụrụ nke okwu ụgha,+  ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’etiti osisi ukwu dị iche iche,+ n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ,+ ndị na-egbu ụmụaka n’iyi ndagwurugwu dị iche iche, n’ebe ndị gbawara agbawa na nkume dị elu?+  “Òkè gị bụ nkume na-akwọ mụrụmụrụ ndị si n’iyi ndagwurugwu.+ Ọ bụ ha bụ òkè gị.+ Ọ bụkwa ha ka ị wụsaara àjà ihe ọṅụṅụ,+ ị chụkwaara ha onyinye n’àjà. M̀ ga-eji ihe ndị a kasie onwe m obi?+  I debere ihe ndina gị n’elu ugwu dị elu nke e mekwara ka ọ dị elu.+ Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ị gbagooro ịga chụọ àjà.+  N’azụ ibo ụzọ na awara ụzọ ka i debere ihe ncheta gị.+ N’ihi na ị hapụrụ m, gbara ọtọ gbagoo; i mere ka ihe ndina gị saa mbara.+ I mere ka gị na ha gbaa ndụ maka ọdịmma nke gị. Ọ na-atọgbu gị atọgbu ka gị na ha dinaa.+ Ị hụrụ ihe ha ji bụrụ nwoke.  I wee jiri mmanụ gbadakwuru Melek, na-emekwa ka mmanụ otite gị buo ibu.+ Ị nọkwa na-eziga ndị ozi gị n’ebe dị anya, i wee mee ka ọnọdụ gị dịrị ala ruo Shiol.+ 10  Ị dọgbuwo onwe gị n’ọrụ n’ụzọ gị ndị dị ọtụtụ.+ Ị sịghịkwa, ‘Ọ baghị uru!’ I nwetaghachiwo ike gị.+ Ọ bụ ya mere na ị daghị ọrịa.+ 11  “Ònye ka ụjọ ya bịara gị, i wee tụwa egwu,+ nke mere i ji malite ịgha ụgha?+ Ma, ọ bụghị m ka i chetara.+ Ọ dịghị ihe i chebaara echiche.+ Ọ̀ bụ na mụ agbachighị nkịtị, zochiekwa ihe i mere?+ Ya mere, ị tụghị egwu m.+ 12  Mụ onwe m ga-akọsa ezi omume gị+ na ọrụ gị niile,+ na ha agaghị abara gị uru.+ 13  Mgbe i tiri mkpu enyemaka, ihe dị iche iche i kpokọtara agaghị anapụta gị,+ kama nke ahụ, ifufe ga-ebufu ha niile.+ Ume e kupụrụ ekupụ ga-eburu ha, ma onye gbabara n’ime m+ ga-eketa ala a, nwetakwa ugwu nsọ m.+ 14  A ga-asịkwa, ‘Wụọnụ ájá n’ụzọ, wụọnụ ájá n’ụzọ! Wepụnụ ihe nọchiri ụzọ.+ Wepụnụ ihe ọ bụla nọchiiri ndị m ụzọ.’”+ 15  N’ihi na nke a bụ ihe Onye Dị Elu na Onye Ukwu,+ onye na-ebi ruo mgbe ebighị ebi+ na onye aha ya dị nsọ,+ kwuru: “Ọ bụ ebe dị elu na ebe dị nsọ ka m bi,+ mụ na onye e gburu mmụọ ya na onye mmụọ ya dị ala bikwa,+ iji mee ka a tụtee mmụọ nke ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, meekwa ka obi nke ndị e gburu mmụọ ha nwee ume.+ 16  N’ihi na ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka m ga na-alụ ọgụ, ọ bụghịkwa ruo mgbe niile ka m ga na-ewe iwe;+ n’ihi na ike ga-agwụ mmụọ mmadụ n’ihi m,+ ọbụna ihe na-eku ume ndị mụ onwe m kere.+ 17  “Iwe were m n’ihi otú uru na-ezighị ezi ọ na-enweta si dị njọ.+ M wee tie ya ihe otiti, wepụ ihu m,+ mgbe iwe na-ewe m. Ma, ọ bụ onye nnupụisi+ nke na-eje ije n’ụzọ obi ya gwara ya. 18  Ahụwo m ụzọ ya; m wee gwọọ ya,+ na-eduzi ya,+ tiekwa ya aka n’obi site n’ịkasi+ ya na ndị ya na-eru uju+ obi.” 19  “Ana m eke mkpụrụ egbugbere ọnụ.+ Onye nọ n’ebe dị anya na onye nọ nso ga-enwe udo nke na-agaghị akwụsị akwụsị,”+ ka Jehova kwuru, “m ga-agwọkwa ya.”+ 20  “Ma ndị ajọ omume yiri oké osimiri nke na-amali elu, nke na-enweghị ike ịdajụ, nke mmiri ya na-abọlite ahịhịa mmiri na apịtị. 21  Udo adịghịrị ndị ajọ omume,”+ ka Chineke m kwuru.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Aịz 57:1*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”