Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 52:1-15

52  Teta, teta, yiri ike gị dị ka uwe,+ gị Zayọn! Yiri uwe gị mara mma,+ gị Jeruselem, bụ́ obodo nsọ!+ N’ihi na onye a na-ebighị úgwù na onye na-adịghị ọcha agaghị abata n’ime gị ọzọ.+  Bilie, tichapụ onwe gị ájá+ ma nọrọ n’oche, gị Jeruselem. Tọpụ agbụ e kere gị n’olu, gị ada bụ́ Zayọn a dọọrọ n’agha.+  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru: “E rere unu n’anataghị ego,+ a gaghịkwa eji ego gbapụta unu.”+  Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Na nke mbụ, ọ bụ n’Ijipt ka ndị m gara biri dị ka ndị ọbịa.+ Asiria megbukwara ha n’enweghị ihe kpatara ya.”  “Ugbu a kwa, gịnị ka m nwere n’ebe a?” ka Jehova kwuru. “N’ihi na a kpọọrọ ndị m n’akwụghị ihe ọ bụla.+ Ndị na-achị ha nọ na-eti mkpu,”+ ka Jehova kwuru, “a nọkwa na-elelị aha m ogologo ụbọchị dum.+  N’ihi ya, ndị m ga-amata aha m,+ ee, n’ihi ya, ha ga-amata ya n’ụbọchị ahụ, n’ihi na ọ bụ m na-ekwu.+ Lee! Ọ bụ m.”  Lee ka o si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ+ nke onye na-eweta ozi ọma,+ bụ́ onye na-ekwusa udo,+ onye na-eweta ozi ọma nke ihe ka mma,+ onye na-ekwusa nzọpụta,+ onye na-asị Zayọn: “Chineke gị aghọọla eze!”+  Gee ntị! Ndị nche gị+ etiwo mkpu.+ Ha ji otu olu na-eti mkpu ọṅụ; n’ihi na ha ga-eji anya ha+ hụ mgbe Jehova ga-akpọlata ndị Zayọn.+  Nweenụ obi ụtọ, werenụ otu olu tie mkpu ọṅụ, unu ebe niile tọgbọrọ n’efu na Jeruselem,+ n’ihi na Jehova akasiwo ndị ya obi;+ ọ gbapụtawo Jeruselem.+ 10  Jehova emewo ka mba niile hụ ogwe aka ya dị nsọ.+ Nsọtụ niile nke ụwa ga-ahụkwa nzọpụta nke Chineke anyị.+ 11  Pụọnụ, pụọnụ, sinụ n’ebe ahụ pụọ,+ unu emetụla ihe na-adịghị ọcha aka;+ sinụ n’etiti ya pụọ,+ debenụ onwe unu ọcha, unu ndị bu arịa Jehova.+ 12  N’ihi na unu agaghị eji ụjọ pụọ, unu agaghịkwa eji ọsọ gbapụ.+ N’ihi na Jehova ga-ebutere unu ụzọ,+ Chineke nke Izrel ga-ekpekwara unu azụ.+ 13  Lee! Ohu m+ ga na-eji nghọta+ eme ihe. Ọ ga-anọ n’ọkwá dị elu. A ga-ebuli ya elu, ọ ga-adịkwa elu nke ukwuu.+ 14  Dị nnọọ ka ọtụtụ ndị kporopụrụ anya na-ele ya+—e bibiri ọdịdị ya nke ukwuu+ karịa ka e metụworo mmadụ ọ bụla ọzọ, bibiekwa ọdịdị onye ukwu o nwere+ karịa ka e metụworo ụmụ mmadụ— 15  otú ahụ ka ọ ga-eme ka ọtụtụ mba kụja.+ Ọnụ ga-emechi ndị eze+ n’ihi ya, n’ihi na ha ga-ahụ ihe a na-akọtụbeghịrị ha, ha ga-atụgharịkwa uche n’ihe ha na-anụtụbeghị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji