Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 5:1-30

5  Biko, ka m bụọrọ onye m hụrụ n’anya abụ banyere ubi vaịn ya,+ ya bụ, abụ banyere onye m hụrụ n’anya. Ọ dị ubi vaịn onye m hụrụ n’anya nwere n’akụkụ ugwu nke na-eme nri.  O wee gburie ya, wepụsịakwa nkume na ya wee kụọ ezi mkpụrụ vaịn uhie na ya, wuokwa ụlọ nche n’etiti ya.+ O gwukwara ebe nzọchapụta mmanya n’ime ya.+ O wee na-atụ anya ka ọ mịa ezi mkpụrụ vaịn,+ ma ọ mịrị mkpụrụ vaịn ọhịa.+  “Unu ndị bi na Jeruselem na unu ndị Juda, biko, kpeenụ ikpe n’etiti mụ na ubi vaịn m.+  Olee ihe ọzọ m kwesịrị ime n’ubi vaịn m nke m na-emebeghị na ya?+ Gịnị mere m ji na-atụ anya ka ọ mịa ezi mkpụrụ vaịn, ya amịa mkpụrụ vaịn ọhịa?  Ugbu a, biko, ka m gwa unu ihe m ga-eme ubi vaịn m: A ga-ewepụ ogige ya,+ a ghaghịkwa ịgba ya ọkụ.+ A ga-akwatu mgbidi ya e ji nkume wuo, ọ ghaghịkwa ịghọ ebe a ga na-azọtọ azọtọ.+  M ga-emekwa ka ọ bụrụ ihe e bibiri ebibi.+ A gaghị akwacha alaka vaịn ya akwacha, a gaghịkwa abọ ya ahịhịa.+ Ogwu na ahịhịa ga-epu na ya;+ m ga-enye ígwé ojii iwu ka ọ ghara izokwasị ya mmiri.+  N’ihi na ụlọ Izrel bụ ubi vaịn+ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ndị Juda bụkwa ubi nke na-eme ya obi ụtọ.+ O wee na-atụ anya ikpe ziri ezi,+ ma, lee! ọ bụ mmebi iwu ka ọ hụrụ; ọ tụrụ anya ezi omume, ma, lee! ọ bụ iti mkpu ákwá ka ọ nụrụ.”+  Ahụhụ ga-adịrị ndị na-agbakwụnye ụlọ n’ụlọ ha,+ ndị na-agbakwụnyekwa ubi n’ubi ha ruo mgbe ọ na-enweghị ebe fọdụrụ,+ unu wee biri naanị unu n’ala a!  Jehova nke ụsụụ ndị agha aṅụwo iyi ná ntị m na ọtụtụ ụlọ ga-aghọ nnọọ ihe ijuanya, n’enweghị onye bi ha,+ n’agbanyeghị na ha bụ oké ụlọ ndị dị mma. 10  N’ihi na ọbụna ubi vaịn nke dị eka iri+ ga-emepụta naanị ihe ga-eju otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat,+ ọbụna mkpụrụ juru otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ homa ga-amịta naanị otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa.+ 11  Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ịga chọọ mmanya na-egbu egbu,+ ndị na-anọ ruo mgbe chi jiri ka mmanya wee mee ka ahụ́ nwuru ha ọkụ!+ 12  Une na ụbọ akwara na obere ịgbà na ọjà, na mmanya na-adị n’oriri ha;+ ma ha adịghị ele anya n’ihe Jehova na-eme, ha adịghịkwa ahụ ọrụ aka ya.+ 13  Ya mere, a ga-adọrọ ndị m n’agha n’ihi enweghị ihe ọmụma;+ agụụ ga-agụgbukwa ndị ha dị ebube,+ akpịrị ga-akpọsikwa ìgwè mmadụ nọ n’etiti ha nkụ ike.+ 14  Ya mere, Shiol emewo ka mkpụrụ obi ya saa mbara, o meghewokwa ọnụ ya gabiga ókè;+ ihe mara mma nke dị n’ime obodo ahụ, tinyere ìgwè mmadụ nke nọ n’ime ya na mkpọtụ ya nakwa onye na-enwe aṅụrị, ga-agbada n’ime ya.+ 15  A ga-ewedakwa mmadụ ala, mee ka mmadụ dị ala, a ga-emekwa ka ọbụna anya nke ndị dị elu dị ala.+ 16  Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-adị elu site n’ikpe ikpe ziri ezi,+ ezi Chineke, bụ́ Onye Nsọ,+ ga-edokwa onwe ya nsọ site n’ezi omume.+ 17  Ebule ga-atakwa nri dị ka ọ̀ bụ n’ebe ịta nri ha; ndị mbịarambịa ga-eri ihe+ n’ebe dị iche iche tọgbọrọ n’efu anụ mara abụba na-anọbu. 18  Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eji ụdọ okwu ụgha na-adọkpụ njehie, ndị na-adọkpụkwa mmehie dị ka hà ji ụdọ ụgbọala na-adọkpụ ya;+ 19  ndị na-asị: “Ya rụọ ọrụ ya ngwa ngwa; ya bịa ọsọ ọsọ, ka anyị wee hụ ya; ka nzube nke Onye Nsọ Izrel mezuo, ka anyị wee mara ọrụ ya!”+ 20  Ahụhụ ga-adịrị ndị na-asị na ihe ọma bụ ihe ọjọọ, na ihe ọjọọ bụ ihe ọma,+ ndị na-ewere ọchịchịrị mere ìhè, were ìhè mere ọchịchịrị, ndị na-ewere ihe na-elu ilu dị ka ihe na-atọ ụtọ, werekwa ihe na-atọ ụtọ dị ka ihe na-elu ilu!+ 21  Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe n’anya onwe ha na ndị nwere uche ọbụna n’anya onwe ha!+ 22  Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ́ dike n’ịṅụ mmanya, na ndị dị ike n’ịgwa mmanya na-egbu egbu,+ 23  ndị na-akpọ onye ajọ omume onye ezi omume n’ihi iri ngarị,+ ndị na-anapụ onye ezi omume ọbụna ezi omume ya!+ 24  Ya mere, dị nnọọ ka ire ọkụ si erepịa ahịhịa ọka,+ dịkwa ka ọkụ ya si erekpọ ahịhịa kpọrọ nkụ, mgbọrọgwụ ha ga na-esikwa ísì ka ihe rere ure,+ ifuru ha ga-ekusasị dị ka ntụ, n’ihi na ha ajụwo iwu Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ ha elelịwokwa okwu Onye Nsọ Izrel.+ 25  Ọ bụ ya mere Jehova ji na-eweso ndị ya iwe dị ọkụ, ọ ga-esetịkwa aka ya mee ha ihe wee gbuo ha.+ Ugwu ga-ama jijiji,+ ozu ha ga-adịkwa ka ihe e kpofuru ekpofu n’etiti okporo ámá.+ N’ihi ihe a dum, iwe ya adajụbeghị, kama aka ya ka setịrị esetị. 26  O gwunyeworo mba ukwu nke dị n’ebe dị anya+ ihe mgbaàmà, ọ fụwokwara mba nke nọ na nsọtụ ụwa+ mkpọrọhịhị; ma, lee! ọ ga-eji ọsọ bata ngwa ngwa.+ 27  Ọ dịghị onye ike gwụrụ, ọ dịghịkwa onye na-asụ ngọngọ n’etiti ha. Ọ dịghị onye na-ero ụra, ọ dịghịkwa onye na-ehi ụra. A gaghịkwa atọpụ ájị̀ ha kere n’úkwù atọpụ, a gaghịkwa adọbi eriri akpụkpọ ụkwụ ha; 28  n’ihi na a pịrị akụ́ ha apị, kweekwa ụta ha niile ekwe.+ A ga-ewerekwa akpụkpọ ụkwụ ịnyịnya ha dị ka nkume siri ike,+ werekwa ụkwụ ụgbọala ha dị ka oké ifufe.+ 29  Mbigbọ ha yiri nke ọdụm, ha na-ebigbọkwa dị ka nwa ọdụm tojuru etoju.+ Ha ga na-aba mba, nwụde anụ oriri wee buru ya pụọ, a gaghịkwa enwe onye nnapụta.+ 30  Ha ga na-aba mba n’elu ya n’ụbọchị ahụ dị ka mbigbọ oké osimiri.+ Mmadụ ga na-ele ala a anya, ma, lee! e nwere ọchịchịrị na-agbawa obi;+ ọbụna ìhè agbawo ọchịchịrị n’ihi mmiri nke na-ezokwasị ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji