Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 45:1-25

45  Nke a bụ ihe Jehova gwara onye o tere mmanụ,+ bụ́ Saịrọs, onye m seere n’aka nri ya,+ ka m wee zọda mba dị iche iche n’ihu ya,+ ka m wee tọpụ ndị eze ihe ha kere n’úkwù; ka m wee megheere ya ọnụ ụzọ nwere ibo abụọ, ka a ghara imechi ọbụna ọnụ ụzọ ámá ya emechi:  “M ga-ebutere gị ụzọ,+ m ga-eme ka ala dị mkputamkpu dị larịị.+ M ga-akụri ibo ụzọ ndị e ji ọla kọpa rụọ, m ga-agbajikwa ígwè e ji atụchi ha.+  M ga-enyekwa gị akụ̀+ ndị dị n’ọchịchịrị na akụ̀ ndị e zoro n’ebe dị iche iche zoro ezo, ka i wee mara na mụ onwe m bụ Jehova, Onye na-akpọ gị n’aha gị,+ bụ́ Chineke Izrel.  M kpọrọ gị aha n’ihi ohu m Jekọb, n’ihi Izrel bụ́ onye m họọrọ;+ m wee gụọ gị aha nwere ùgwù, ọ bụ ezie na ị maghị m.+  Abụ m Jehova, e nweghị onye ọzọ.+ E wezụga m, ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ.+ M ga-eke gị ihe n’úkwù, ọ bụ ezie na ị maghị m,  ka ndị mmadụ wee mara, malite n’ebe ọwụwa anyanwụ, malitekwa n’ebe ọdịda ya na e nweghị onye ọzọ ma e wezụga m.+ Abụ m Jehova, e nweghị onye ọzọ.+  Onye na-akpụ ìhè,+ na-ekekwa ọchịchịrị,+ onye na-eme udo,+ na-ekekwa ọdachi,+ ọ bụ m bụ́ Jehova na-eme ihe a niile.+  “Gị eluigwe, mee ka ezi omume si n’elu zoo ka mmiri;+ ka ezi omume+ si n’ígwé ojii na-atasị. Ka ala meghee, ka ọ mịa nzọpụta dị ka mkpụrụ, ka o meekwa ka ezi omume pulite+ n’otu mgbe ahụ. Mụ onwe m bụ́ Jehova ekewo ya.”+  Ahụhụ ga-adịrị onye na-alụso Onye kpụrụ ya ọgụ,+ dị ka ibe eju nke na-alụso ibe eju ndị ọzọ e ji ájá kpụọ ọgụ! Ụrọ+ ò kwesịrị ịsị onye kpụrụ ya: “Gịnị ka ị na-akpụ?” Ihe ị rụrụ ò kwesịkwara ịsị: “O nweghị aka”? 10  Ahụhụ ga-adịrị onye na-asị nna ya: “Gịnị ka ị mụrụ?” onye na-asịkwa nne ya: “Ọ̀ bụ ime gịnị na-eme gị?”+ 11  Nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ Onye Nsọ Izrel+ na Onye kpụrụ+ ya: “Jụọ m ọbụna ihe na-aga ime+ banyere ụmụ m;+ unu ga-enyekwa m iwu banyere ọrụ aka m.+ 12  Ọ bụ m kere ụwa,+ keekwa ọbụna mmadụ n’elu ya.+ Ọ bụ aka m setịrị eluigwe,+ enyewokwa m ìgwè ihe niile dị n’ime ya iwu.”+ 13  “Akpaliwo m otu onye n’ezi omume,+ m ga-emekwa ka ụzọ ya niile kwụrụ ọtọ.+ Ọ bụ ya ga-ewu obodo m,+ ọ ga-ahapụkwa ndị m a dọọrọ n’agha ka ha laa,+ ọ bụghị ka e wee kwụọ ya ụgwọ,+ ọ bụghịkwa ka e wee nye ya ngarị,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 14  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ndị ọrụ Ijipt a na-adịghị akwụ ụgwọ+ na ndị ahịa Itiopia na ndị Siba,+ bụ́ ndị toro ogologo,+ ga-abịakwute gị onwe gị. Ha ga-aghọkwa nke gị.+ Ha ga na-eso gị n’azụ. Ha ga-ebu ịgà a tụrụ ha bịa.+ Ha ga-akpọrọ gị isiala.+ Ha ga-arịọ gị arịrịọ, sị, ‘N’ezie, gị na Chineke dị n’otu,+ e nweghị onye ọzọ; ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ.’”+ 15  N’eziokwu, ị bụ Chineke nke na-ezobe onwe ya,+ Chineke Izrel, Onye Nzọpụta.+ 16  Ihere ga-eme ha, a ga-emechukwa ha ihu, ha niile. Ndị niile na-arụpụta ihe oyiyi arụsị ga na-ejegharị ná mmechuihu.+ 17  Ma a ga-enye Izrel nzọpụta ga-adịru mgbe ebighị ebi+ n’ihi na ya na Jehova dị n’otu.+ Ihere agaghị eme unu,+ a gaghịkwa emechu unu ihu+ ruo mgbe niile ebighị ebi. 18  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ Onye kere eluigwe,+ Onye bụ́ ezi Chineke,+ Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya,+ Onye mere ka o guzosie ike,+ onye na-ekeghị ya n’efu, onye kpụrụ ya ka e biri n’ime ya:+ “Abụ m Jehova, e nweghị onye ọzọ.+ 19  Anọghị m n’ebe zoro ezo kwuo okwu,+ n’ebe gbara ọchịchịrị n’ụwa; agwaghịkwa m mkpụrụ Jekọb, sị, ‘Chọọnụ m+ n’efu.’ Abụ m Jehova, onye na-ekwu ihe bụ́ ezi omume, na-akọkwa ihe ziri ezi.+ 20  “Zukọtanụ bịa.+ Gbakọtanụ bịa nso, unu ndị si ná mba dị iche iche gbapụ.+ Ndị na-ebugharị ihe oyiyi ha e ji osisi pịa amaghị ihe ọ bụla, otú ahụkwa ka ọ dị ndị na-ekpeku chi nke na-apụghị ịzọpụta mmadụ ekpere.+ 21  Kwuwenụ, kwuonụ ihe unu nwere ikwu.+ Ee, ka ha jiri otu obi gbaa izu. Ònye mere ka a nụ ihe a malite n’oge dị anya gara aga?+ Ònye kọrọ ya malite n’otu oge ahụ?+ Ọ́ bụghị mụ onwe m, Jehova, onye a na-enweghị Chineke ọzọ ma e wezụga ya;+ Chineke bụ́ onye ezi omume na Onye Nzọpụta,+ e nweghị ọzọ ma e wezụga m?+ 22  “Bịakwutenụ m ka a zọpụta unu,+ unu niile ndị nọ na nsọtụ ụwa; n’ihi na abụ m Chineke, e nweghị ọzọ.+ 23  Ejiriwo m onwe m ṅụọ iyi+—okwu ahụ esiwokwa n’ọnụ m pụta n’ezi omume,+ ya mere, ọ gaghị alaghachi azụ+—na ikpere niile ga-egburu m n’ala.+ Ire niile ga-aṅụkwara m iyi,+ 24  sị, ‘N’ezie, e nwere ezi omume dị ukwuu na ike n’ime Jehova.+ Ndị niile na-eweso ya iwe ga-abịa kpọmkwem n’ebe ọ nọ, ihere ga-emekwa ha.+ 25  Mkpụrụ niile+ nke Izrel ga-abụ ndị ziri ezi+ n’ime Jehova, ọ bụkwa n’ime ya ka ha ga na-anya isi.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji