Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 3:1-26

3  N’ihi na, lee! ezi Onyenwe anyị,+ bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, na-anapụ Jeruselem+ na Juda ihe na-akwado ha na ihe ha dabeere na ya, bụ́ nri na mmiri,+  tinyere dike na onye agha, onyeikpe na onye amụma,+ na onye na-agba afa na okenye,+  onyeisi nke ndị agha iri ise+ nakwa onye a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu na onye ndụmọdụ na ọkà n’ime anwansi, na onye nwere nkà n’ịra agwọ ụrà.+  M ga-emekwa ka ụmụ okoro bụrụ ndị isi ha, ndị na-achị n’aka ike ga-achịkwa ha.+  Ha ga-achị ibe ha n’aka ike, onye ọ bụla ga na-achị mmadụ ibe ya n’aka ike.+ Ha ga-ebili megide ibe ha, nwa okoro megide agadi,+ onye a na-ejighị kpọrọ ihe megidekwa onye e kwesịrị ịkwanyere ùgwù.+  N’ihi na onye ọ bụla ga-ejide nwanne ya n’ụlọ nna ya, sị: “I nwere ákwà mgbokwasị. Onye ọchịchị dị ike+ ka ị ga-aghọrọ anyị, chịwa mkpọmkpọ ebe a nke a kwaturu akwatu.”  Ọ ga-ekwu okwu n’olu dara ụda n’ụbọchị ahụ, sị: “Agaghị m aghọ onye na-ekechi ọnyá; nri ma ọ bụ ákwà mgbokwasị adịghịkwa n’ụlọ m. Unu emela m onye ọchịchị dị ike nke ga na-achị ndị mmadụ.”  N’ihi na Jeruselem asụwo ngọngọ, Juda adawokwa,+ n’ihi na ọnụ ha na omume ha na-emegide Jehova,+ site n’inupụ isi n’ihu Onye dị ebube.+  Otú ihu ha dị na-agbagide ha akaebe,+ ha na-ekwukwa banyere mmehie ha nke dị ka nke Sọdọm.+ Ha adịghị ezo ya ezo. Ahụhụ ga-adịrị mkpụrụ obi ha! N’ihi na ha ewetaworo onwe ha ọdachi.+ 10  Kwuonụ na ihe ga-agaziri onye ezi omume,+ n’ihi na ha ga-enweta ihe si n’omume ha pụta.+ 11  Ahụhụ ga-adịrị onye ajọ omume!—Ka ọdachi dakwasị ya; n’ihi na ihe o mere ndị ọzọ ka a ga-eme ya!+ 12  Ndị na-ekenye ndị m ọrụ na-emesi ha ike, ọ bụkwa ndị inyom na-achị ha.+ Unu ndị m, ndị na-edu unu na-eme ka unu kpafuo,+ ha emewokwa ka ụzọ unu kwesịrị iso gbagwojuo unu anya.+ 13  Jehova anọdụwo ala ikpe ikpe, o guzowokwa ikwupụta ikpe ya n’ahụ́ ndị dị iche iche.+ 14  Jehova na ndị okenye nke ndị ya na ndị isi ha ga-aba n’ikpe.+ “Unu onwe unu agbawo ubi vaịn ọkụ. Ihe a pụnaara onye nọ n’ahụhụ dị n’ụlọ unu.+ 15  Gịnị mere unu ji na-emegbu ndị m, na-echikwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ọnụ n’ala?”+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru. 16  Jehova wee sị: “N’ihi na ụmụ nwaanyị Zayọn dị mpako, ha na-agbatịkwa olu ha mgbe ha na-eje ije, na-elekwa anya iji rata ndị ikom, ha na-eje ije nganga, na-emekwa ka ọla ụkwụ ha na-eme mkpọtụ,+ 17  Jehova ga-emekwa ka akpụkpa dịrị n’opu isi ụmụ nwaanyị Zayọn,+ Jehova ga-ekpughekwa egedege ihu ha.+ 18  N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-ewepụ ịma mma ha: ọla ụkwụ ha na ihe ha na-eke n’isi, na ihe ịchọ mma ha ndị yiri ọnwa,+ 19  iyeri ntị na ọla aka na ákwà mkpuchi ihu ha,+ 20  ákwà isi na ọla ụkwụ ha na ákwà ha na-eke n’obi,+ na mkpọ̀ ihe na-esi ísì ụtọ ha, na ọgwụ ha na-anya n’olu,+ 21  mgbaaka na ọla imi ha,+ 22  uwe ememme ha, uwe elu ha na uwe ha na-enweghị aka na obere akpa ego ha, 23  enyo ha na-eji n’aka+ na uwe ime ha na ákwà ha na-eke n’isi+ na nnukwu ákwà mkpuchi ihu ha.+ 24  “Ọ ga-erukwa na a ga na-anụ ísì ihe rere ure kama ịnụ ísì mmanụ bọlsọm;+ a ga-enwe eriri kama inwe ájị̀; a ga-enwe isi nkwọcha+ kama inwe ntutu isi a kpara nke ọma; a ga-eke ákwà iru uju n’úkwù+ kama ike ákwà dara oké ọnụ; kama ịbụ ndị mara mma, a ga-egbu ha egbugbu n’ahụ́.+ 25  A ga-eji mma agha gbuo ndị ikom gị, a ga-egbukwa ndị dike gị n’agha.+ 26  Ọnụ ụzọ ya niile ga-enwe mwute,+ ruokwa uju, a ga-emekwa ka ọ tọgbọrọ n’efu. Ọ ga-anọdụ n’ala nkịtị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji