Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 29:1-24

29  “Ahụhụ ga-adịrị Ariel,+ ee, Ariel, bụ́ obodo Devid mara ụlọikwuu!+ Tụkwasịnụ afọ n’afọ; ka ememme niile+ na-abịakwa n’oge ha.  M ga-eme ka ihe siere Ariel ike,+ ọ ga-erukwa uju, kwaa ákwá arịrị,+ ọ ga-aghọkwara m ekwú nke ebe ịchụàjà Chineke.+  M ga-ama ụlọikwuu gburugburu iji buso gị agha, m ga-ejikwa osisi pịrị ọnụ wuo ogige gburugburu gị wee nọchibido gị, m ga-ewukwa ihe m ga-eji nọchibido gị.+  Ị ga-ada wee nọrọ n’ala na-ekwu okwu, ụda olu gị ga-adị ala dị ka nke onye si n’ime ala na-ekwu okwu.+ Dị ka olu onye na-agba afa, olu gị ga-esi n’ala na-adapụta, okwu gị ga-esikwa n’ime ala na-adapụta nwayọọ nwayọọ.+  Ìgwè mmadụ ị na-amaghị ndị ha bụ ga-adị nnọọ ka ntụ.+ Ìgwè ndị na-achị n’aka ike+ ga-adịkwa nnọọ ka igbogbo ọka nke na-agabiga agabiga.+ Ọ ga-emekwa n’otu ntabi anya, na mberede.+  Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-eji égbè eluigwe na ala ọma jijiji na oké ụda, oké ifufe mmiri na oké ifufe, na ire ọkụ nke ọkụ na-erepịa ihe+ chee ihu n’ebe ị nọ wee napụta gị.”  Banyere ìgwè mmadụ si ná mba niile bụ́ ndị na-ebuso Ariel agha,+ ọbụna ndị niile na-ebuso ya agha, na ụlọ elu nnọchibido ndị e wuru iji nọchibido ya nakwa ndị na-eme ka ihe siere ya ike,+ ihe ga-eme ha ga-adị ka ọ̀ bụ ná nrọ, n’ọhụụ nke abalị.  Ee, ọ ga-adị nnọọ ka mgbe onye agụụ na-agụ rọrọ nrọ ebe ọ na-eri nri, o wee teta, ma agụụ ka na-agụ mkpụrụ obi ya;+ ọ dịkwa ka mgbe onye akpịrị na-akpọ nkụ rọrọ nrọ ebe ọ na-aṅụ mmiri, o wee teta, ma, lee, ike ka gwụrụ ya, akpịrị ka na-akpọkwa mkpụrụ obi ya nkụ; otú ahụ ka ọ ga-adị ìgwè mmadụ si ná mba niile bụ́ ndị na-ebuso Ugwu Zayọn agha.+  Gbuonụ oge, ka o jukwa unu anya;+ nyachienụ anya unu, ka unu ghara ịhụ ụzọ.+ Ha na-eme ka ndị mmanya na-egbu,+ ma ọ bụghị mmanya ka ha ṅụrụ; ha adagharịwokwa, ma ọ bụghị n’ihi mmanya na-egbu egbu.+ 10  N’ihi na Jehova awụkwasịwo unu mmụọ nke oké ụra;+ ọ na-emechikwa anya unu, unu ndị amụma.+ O kpuchiwokwa ọbụna isi unu,+ unu ndị ọhụụ.+ 11  Ọhụụ banyere ihe niile dịkwa unu ka okwu dị n’akwụkwọ a kachiri akara,+ nke e nyere onye nwere ike ịgụ ihe, sị: “Biko, gụpụta ihe a n’olu dara ụda,” o wee sị: “Agaghị m agụli ya, n’ihi na a kachiri ya akara”;+ 12  a ga-ewerekwa akwụkwọ ahụ nye onye na-enweghị ike ịgụ ihe, mmadụ asị ya: “Biko, gụpụta ihe a n’olu dara ụda,” o wee sị: “Amaghị m otú e si agụ ihe ma ọlị.” 13  Jehova wee sị: “Ebe ọ bụ na ọ bụ n’ọnụ ka ndị a bịakwuteworo m, ọ bụkwa naanị egbugbere ọnụ ha ka ha ji nye m otuto,+ ha emewo ka obi ha dị anya n’ebe m nọ,+ egwu ha na-atụ m bụkwa ihe mmadụ nyere n’iwu nke a na-akụziri ha,+ 14  ya mere, lee, ọ bụ m ga-eme ndị a ihe dị ịtụnanya ọzọ,+ n’ụzọ dị ịtụnanya, ee, ihe dị ịtụnanya; amamihe nke ndị ha maara ihe ga-alakwa n’iyi, nghọta nke ndị ha nwere uche ga-ezo onwe ya.”+ 15  Ahụhụ ga-adịrị ndị na-agami nnọọ agami iji zonahụ Jehova atụmatụ ha,+ ndị meworo omume ha n’ebe gbara ọchịchịrị.+ Ha na-asịkwa: “Ònye na-ahụ anyị, ònyekwa maara ihe anyị na-eme?”+ 16  Lee ka unu si bụrụ ndị rụrụ arụ! È kwesịrị ile ọkpụite anya dị ka e si ele ụrọ anya?+ N’ihi na ihe a rụrụ arụ ò kwesịrị ikwu banyere onye rụrụ ya, sị: “Ọ bụghị ya rụrụ m”?+ Ihe a kpụrụ akpụ ọ̀ na-ekwu banyere onye kpụrụ ya, sị: “O nweghị nghọta”?+ 17  Ọ́ bụghị naanị ntakịrị oge fọdụrụ ka e mee ka Lebanọn ghọọ ubi mkpụrụ osisi,+ ka e werekwa ubi mkpụrụ osisi dị ka oké ọhịa?+ 18  N’ụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe e kwuru n’akwụkwọ a,+ ọbụna anya ndị ìsì ga-ahụ ụzọ n’itiri nakwa n’ọchịchịrị.+ 19  Ndị dị umeala n’obi+ ga-emekwa ka ọṅụ ha na-enwe n’ime Jehova dị ukwuu karị, ọbụna ndị ogbenye n’etiti ụmụ mmadụ ga-aṅụrị ọṅụ n’Onye Nsọ Izrel,+ 20  n’ihi na onye na-achị n’aka ike ga-anwụ,+ onye na-etu ọnụ ga-ala n’iyi,+ a ga-ebipụkwa ndị niile na-amụ anya iji mee ihe ọjọọ,+ 21  ndị na-eme ka mmadụ banye ná mmehie site n’okwu ọnụ ya,+ ndị na-ewere ihe ụrà debere onye na-enye ịdọ aka ná ntị n’ọnụ ụzọ ámá,+ ndị na-ejikwa arụmụka na-enweghị isi akwapụ onye ezi omume n’akụkụ.+ 22  Ya mere, nke a bụ ihe Jehova, bụ́ onye gbapụtara Ebreham,+ gwara ụlọ Jekọb: “Ihere agaghị eme Jekọb ugbu a, ihu ya agaghịkwa agbarụ agbarụ;+ 23  n’ihi na mgbe ọ hụrụ ụmụ ya, bụ́ ọrụ aka m, n’etiti ya,+ ha ga-edo aha m nsọ,+ ha ga-edokwa Onye Nsọ nke Jekọb nsọ,+ ha ga-atụ egwu Chineke Izrel.+ 24  Ndị na-ejehie na mmụọ ha ga-enwe nghọta, ọbụna ndị na-atamu ntamu ga-anata ntụziaka.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji