Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 26:1-21

26  N’ụbọchị ahụ,+ a ga-abụ abụ a+ n’ala Juda:+ “Anyị nwere obodo siri ike.+ O mewo ka nzọpụta bụrụ mgbidi na ékpè ya.+  Megheenụ ọnụ ụzọ ámá+ ka mba ezi omume nke kwesịrị ntụkwasị obi bata.+  Ị ga-echebe onye nwere ọchịchọ siri ike ka o nwee udo na-adịghị akwụsị akwụsị,+ n’ihi na ọ bụ gị ka e mere ka ọ tụkwasị obi.+  Tụkwasịnụ Jehova obi+ mgbe niile, n’ihi na Jaa Jehova bụ Oké Nkume+ mgbe ebighị ebi.  “N’ihi na o wetuwo ndị bi n’ebe dị elu,+ bụ́ obodo dị elu.+ Ọ na-ewetu ya, ọ na-eweturu ya ala; ọ na-eme ka ọ daruo ala.+  Ụkwụ nke onye nọ n’ahụhụ ga-azọda ya, ee, nzọụkwụ nke ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha.”+  Ụzọ onye ezi omume ziri ezi.+ Ebe ọ bụ na i ziri ezi, ị ga-eme ka ụzọ onye ezi omume dị larịị.+  Ee, Jehova, anyị enwewo olileanya n’ebe ị nọ+ n’ihi ụzọ ikpe ziri ezi gị. Aha gị na ihe ncheta gị+ anọwo na-agụ mkpụrụ obi anyị agụụ.+  Agụụ gị agụsiwo mkpụrụ obi m ike n’abalị;+ ee, m na-achọsi gị ike n’ime mmụọ m;+ n’ihi na, mgbe ị na-ekpe ụwa ikpe,+ ọ bụ ezi omume+ ka ndị bi n’elu ala ga-amụta.+ 10  Ọ bụrụgodị na e meere onye ajọ omume amara, ọ gaghị amụta ezi omume.+ N’ala nke izi ezi, ọ ga-eme omume na-ezighị ezi,+ ọ gaghịkwa ahụ ịdị ukwuu Jehova.+ 11  Jehova, aka gị adịwo elu,+ ma ha anaghị ahụ ya.+ Ha ga-ahụ ekworo ị na-ekwo n’ihi ndị gị, ihere ewee mee ha.+ Ee, ọkụ+ nke ga-erepịa ndị iro gị ga-erepịa ha. 12  Jehova, ị ga-ekpere anyị ikpe udo,+ n’ihi na ị rụworo anyị ọbụna ọrụ anyị niile.+ 13  Jehova bụ́ Chineke anyị, ndị ọzọ bụ́ ndị nna ukwu ma e wezụga gị emewo ka ọ̀ bụ ha nwe anyị.+ Ọ bụ naanị site n’enyemaka gị ka anyị ga-akpọ aha gị.+ 14  Ha anwụọla; ha agaghị adị ndụ.+ Ha bụ ndị na-adịghị ndụ,+ ha agaghị ebili.+ N’ihi ya, ị tụgharịwo chee ihu n’ebe ha nọ ka i wee laa ha n’iyi, ka a ghara ịkpọtụkwa ha aha.+ 15  I mewo ka mba a mụbaa; Jehova, i mewo ka mba a mụbaa;+ i wetaworo onwe gị otuto.+ Ị gbatịwo ókè niile nke ala a ruo n’ebe dị anya.+ 16  Jehova, ha atụgharịwo ihu n’ebe ị nọ n’oge ahụhụ;+ ha ekpewo ekpere n’olu dị ala mgbe ị dọrọ ha aka ná ntị.+ 17  Dị nnọọ ka oge na-eru mgbe nwaanyị dị ime ga-amụ nwa, ime ana-eme ya, ya ana-eti mkpu n’ihi ime na-eme ya, otú ahụ ka anyị dị n’ihi gị, Jehova.+ 18  Anyị adịwo ime, ime emewo anyị;+ dị ka a pụrụ ikwu ya, anyị amụwo ifufe. Ọ dịghị ezigbo nzọpụta anyị wetawooro ala a,+ a mụghịkwa ndị ga-ebi n’elu ala.+ 19  “Ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ.+ Ozu m niile ga-ebili.+ Tetanụ tie mkpu ọṅụ, unu ndị bi n’ájá!+ N’ihi na igirigi gị+ dị ka igirigi nke ahịhịa malo,+ ala ga-amụpụtakwa ndị na-adịghị ndụ.+ 20  “Ndị m, gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime, mechiekwanụ ọnụ ụzọ mgbe unu banyesịrị.+ Zoonụ ruo nwa mgbe nta, ruo mgbe oké iwe gafere.+ 21  N’ihi na, lee! Jehova si n’ebe ọ nọ na-abịa ime ka ndị bi n’ala a zaa ajụjụ maka njehie ha.+ Ala a ga-ekpughekwa ọbara ndị ọ wụfuru,+ ọ gakwaghị ekpuchi ndị ya e gburu egbu ọzọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji