Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 18:1-7

18  Ewoo, ala ụkpara, nke dị n’ógbè osimiri ndị dị n’Itiopia!+  Ọ bụ ya na-ezipụ ndị ozi+ ka ha si n’oké osimiri gaa, ka ha jiri ụgbọ mmiri ndị na-ese n’elu mmiri, bụ́ ndị e ji ahịhịa papaịrọs rụọ, gaa, sị: “Unu ndị ozi nwere ụkwụ ọsọ, gakwurunụ mba ndị toro ogologo, ndị ahụ́ ha na-akwọ mụrụmụrụ, ndị a na-atụ egwu n’ebe niile, mba dị ike nke ukwuu, nke na-azọdakwa ndị ọzọ, ndị osimiri buuru ala ha.”+  Unu niile ndị bi n’elu ala+ na unu ndị bi n’ụwa, unu ga-ahụ ihe yiri mgbe a na-egwunye ihe mgbaàmà n’elu ugwu,+ unu ga-anụkwa ụda nke na-ada ka mgbe a na-afụ opi.+  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova gwara m: “M ga-anọ jụụ wee lekwasị anya n’ebe m nke guzosiri ike,+ dị ka oké okpomọkụ nke na-adị n’oge ehihie,+ dị ka ígwé ojii nke igirigi n’okpomọkụ nke na-adị n’oge owuwe ihe ubi.+  N’ihi na tupu owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru nọzuworo oge ya, okooko ya aghọọkwa mkpụrụ vaịn ka na-acha acha, mmadụ ga-ejikwa mma ịkwa osisi gbupụ ntakịrị alaka ya, gbupụkwa ome ya, gbukapụ ha.+  A ga-ahapụ ha ka nnụnụ na-eri anụ rie ha, hapụkwa ha ka anụ ọhịa nke ụwa rie ha.+ Nnụnụ na-eri anụ ga-anọ n’elu ha n’ọkọchị, anụ ọhịa niile nke ụwa ga-anọkwa n’elu ha n’oge owuwe ihe ubi.+  “N’oge ahụ, a ga-ewetara Jehova nke ụsụụ ndị agha onyinye,+ site n’aka ndị toro ogologo, ndị akpụkpọ ahụ́ ha na-akwọ mụrụmụrụ,+ ndị a na-atụ egwu n’ebe niile, mba dị ike nke ukwuu, nke na-azọdakwa ndị ọzọ, ndị osimiri buuru ala ha, n’ebe a kpọkwasịrị aha Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Ugwu Zayọn.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji