Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 11:1-16

11  Alaka+ ga-esi n’úkwù osisi Jesi+ puo; ome+ nke si na mgbọrọgwụ ya pulite ga-amị mkpụrụ.+  Mmụọ Jehova ga-adakwasị ya,+ bụ́ mmụọ amamihe+ na nke nghọta,+ mmụọ ndụmọdụ na nke ịdị ike,+ mmụọ ihe ọmụma+ na nke egwu Jehova.+  Ihe na-atọ ya ụtọ ga-abụ ịtụ egwu Jehova.+ Ọ bụghị naanị ihe anya ya hụrụ ka ọ ga-eji na-ekpe ikpe, ọ gaghịkwa adọ aka ná ntị naanị dị ka ihe ntị ya nụrụ si dị.+  Ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume,+ ọ ga na-enyekwa ịdọ aka ná ntị n’izi ezi n’ihi ndị dị umeala n’obi n’ụwa. Ọ ga-apịa ụwa ụtarị nke si n’ọnụ ya;+ ọ ga-ejikwa mmụọ nke egbugbere ọnụ ya gbuo onye ajọ omume.+  Ezi omume ga-abụ ájị̀ ọ na-eke n’úkwù,+ ikwesị ntụkwasị obi ga-abụkwa ájị̀ ọ na-eke n’úkwù.+  Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọ,+ agụ owuru na nwa ewu ga-amakpukọkwa, nwa ehi na nwa ọdụm tojuru etoju+ na anụ mara abụba ga-anọkọkwa;+ nwatakịrị ga na-edukwa ha.  Nne ehi na anụ ọhịa bea ga-atakọ nri; ụmụ ha ga-amakpukọkwa. Ọbụna ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka oké ehi.+  Nwa na-aṅụ ara ga-egwurikwa egwu n’elu ọnụ ebe agwọ ubí nọ;+ nwatakịrị a kwụsịrị ara ga-atụkwasịkwa aka ya n’ọnụ ebe agwọ ọjọọ nọ.  Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+ ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum;+ n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.+ 10  Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ+ na a ga-enwe mgbọrọgwụ Jesi+ nke ga-eguzo ọtọ dị ka ihe mgbaàmà dịịrị ndị dị iche iche.+ Ọ bụkwa ya ka ọbụna mba niile ga-echigharịkwuru ma jụọ ase.+ Ebe izu ike ya ga-adịkwa ebube.+ 11  Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na Jehova ga-esetị aka ya ọzọ, nke ugboro abụọ,+ inweta ndị fọdụrụ n’etiti ndị ya, bụ́ ndị ga-afọdụ site n’Asiria+ na Ijipt+ na Patrọs+ na Kush+ na Ilam+ na Shaịna+ na Hemat nakwa agwaetiti nke oké osimiri.+ 12  Ọ ga-ewelikwara mba niile ihe mgbaàmà wee kpọkọta ndị Izrel a chụsara achụsa.+ Ọ ga-esikwa na nsọtụ anọ nke ụwa kpọkọta ndị Juda a chụsara achụsa.+ 13  Ekworo Ifrem ga-akwụsị,+ a ga-ebipụkwa ọbụna ndị na-ebuso Juda iro. Ifrem agaghị ekwoso Juda ekworo, Juda agaghịkwa ebuso Ifrem iro.+ 14  Ha ga-efedata n’ubu ndị Filistia n’ebe ọdịda anyanwụ;+ ha ga-agbakọ aka bukọrọ ihe ụmụ Ebe Ọwụwa Anyanwụ.+ Ha ga-esetị aka ha megide Idọm na Moab.+ Ụmụ Amọn ga-abụkwa ndị ha na-achị.+ 15  Jehova ga-ebepụ ire oké osimiri Ijipt,+ jirikwa okpomọkụ nke mmụọ ya tụọ Osimiri Yufretis+ aka. Ọ ga-etikwa iyi asaa ya ihe, ọ ga-emekwa ka ndị mmadụ yiri akpụkpọ ụkwụ ha na-eje ije.+ 16  A ga-enwekwa okporo ụzọ+ ga-esi n’Asiria pụta maka ndị fọdụrụ+ n’etiti ndị ya, bụ́ ndị ga-afọdụ,+ dị nnọọ ka e nwere maka Izrel n’ụbọchị o si n’ala Ijipt pụta.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji