Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

3 Jọn 1:1-14

 Mụ onwe m bụ́ okenye+ na-edegara Geyọs, bụ́ onye a hụrụ n’anya, akwụkwọ. Ọ bụ onye m hụrụ n’anya n’ezie.+  Onye m hụrụ n’anya,+ m na-ekpe ekpere ka ị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ihe niile,+ na-enwekwa ezi ahụ́ ike,+ dị nnọọ ka mkpụrụ obi gị na-enwe ihe ịga nke ọma.+  N’ihi na m ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ụmụnna bịara gbaa àmà na i jisiri eziokwu ahụ ike, dị nnọọ ka ị na-eje ije n’eziokwu ahụ.+  Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.+  Onye m hụrụ n’anya, ị na-arụ ọrụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe ọ bụla ị na-emere ụmụnna,+ ndị bụkwa ndị bịara abịa,+  ndị gbara àmà n’ihu ọgbakọ banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-ala, meso ha omume n’ụzọ Chineke kwadoro.+  N’ihi na ha gawara n’ihi aha ya, n’anaraghị+ ndị mba ọzọ ihe ọ bụla.  Ya mere, anyị ji ụgwọ ịnabata ndị dị otú ahụ nke ọma,+ ka anyị wee ghọọ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ n’eziokwu ahụ.+  Ọ dị ihe m degaara ọgbakọ akwụkwọ banyere ya, ma Dayọtrefis, onye na-achọ ịnọ n’ọkwá mbụ+ n’etiti ha, adịghị eji nkwanye ùgwù+ anabata ihe ọ bụla nke si n’aka anyị.+ 10  Ya mere, ọ bụrụ na mụ abịa, m ga-echeta ọrụ ya ndị ọ na-arụ,+ na-ekwu okwu ọjọọ banyere anyị.+ Ihe ndị a ejughịkwa ya afọ, ọ dịghịkwa eji nkwanye ùgwù anabata ụmụnna,+ ọ na-anwakwa igbochi+ ndị na-achọ ịnabata+ ha, na-achụpụkwa+ ha n’ọgbakọ. 11  Onye m hụrụ n’anya, bụrụ onye na-eṅomi ihe ọma,+ ọ bụghị ihe ọjọọ. Onye na-eme ihe ọma sitere na Chineke.+ Onye na-eme ihe ọjọọ ahụbeghị Chineke.+ 12  Ha niile gbaara Dimitriọs àmà,+ eziokwu ahụ gbakwaara ya àmà. N’ezie, anyị onwe anyị na-agbara ya àmà,+ ị makwaara na àmà anyị na-agba bụ eziokwu.+ 13  M nwere ọtụtụ ihe m ga-edetara gị akwụkwọ banyere ha, ma achọghị m iji ink na mkpịsị akwụkwọ na-edetara gị ha.+ 14  Ma m nwere olileanya ịhụ gị n’oge na-adịghị anya, anyị ga-ekwurịtakwa okwu ihu na ihu.+ Udo dịrị gị.+ Ndị enyi anyị na-ekele gị.+ Keleere m+ ndị enyi anyị n’otu n’otu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji