Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Timoti 2:1-26

2  Ya mere, gị onwe gị, nwa m,+ na-enweta ike+ n’obiọma na-erughịrị mmadụ+ nke dị n’ime Kraịst Jizọs.  Ihe ị nụrụ n’ọnụ m, nke ọtụtụ ndị gbara àmà ya,+ nyefee ya n’aka ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị ga-erukwa eru nke ọma ịkụziri ya ndị ọzọ.+  Dị ka ezi onye agha+ nke Kraịst Jizọs, kere òkè nke gị n’ịhụju anya.+  Onye ọ bụla nke na-eje ozi dị ka onye agha+ adịghị etinye aka n’ọrụ ego a na-arụ ná ndụ,+ ka ihe ya wee masị onye debara aha ya dị ka onye agha.  Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla asọọ mpi n’egwuregwu,+ a dịghị ekpuwe ya okpu mmeri ma ọ bụrụ na ọ sọghị mpi dị ka iwu si dị.  Onye ọrụ ubi nke na-arụsi ọrụ ike aghaghị ịbụ onye mbụ ga-eri mkpụrụ ya.+  Na-echebara ihe m na-ekwu echiche mgbe niile; Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta+ n’ihe niile.  Cheta na e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Jizọs Kraịst+ nakwa na o sitere ná mkpụrụ Devid,+ dị ka ozi ọma ahụ m na-ekwusa si dị;+  nke ọ bụ n’ihi ya ka m na-ahụju anya ruo n’ókè nke ịnọ n’agbụ n’ụlọ mkpọrọ+ dị ka onye ajọ omume. Ka o sina dị, e keghị okwu Chineke agbụ.+ 10  Ọ bụ ihe a mere m ji nọgide na-atachi obi n’ihe niile n’ihi ndị a họọrọ,+ ka ha onwe ha kwa wee nweta nzọpụta ahụ nke metụtara Kraịst Jizọs tinyere ebube ebighị ebi.+ 11  Okwu a kwesịrị ntụkwasị obi:+ N’ezie, ọ bụrụ na anyị na ya nwụkọrọ ọnwụ, anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ;+ 12  ọ bụrụ na anyị anọgide na-atachi obi, anyị na ya ga-achịkwa achị dị ka ndị eze;+ ọ bụrụ na anyị agọnahụ ya,+ ya onwe ya ga-agọnahụkwa anyị; 13  ọ bụrụ na anyị aghọọ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ọ na-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi,+ n’ihi na ọ pụghị ịgọnahụ onwe ya. 14  Na-echetara+ ha ihe ndị a, na-enye ha iwu+ dị ka onye àmà n’ihu Chineke,+ ka ha ghara ịlụ ọgụ banyere okwu,+ nke bụ́ ihe na-abaghị uru ma ọlị n’ihi na ọ na-ekpu okwukwe nke ndị nụrụ ya ihu. 15  Gbalịsie ike ka i chee onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye ihe ya dị ya mma,+ onye ọrụ+ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere,+ onye na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.+ 16  Ma zere okwu nzuzu nke na-emerụ ihe dị nsọ;+ n’ihi na ha ga-aghọwanye ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke,+ 17  okwu ha ga-agbasakwa dị ka ọnyá na-aba aba.+ Haịmeniọs na Faịlitọs so n’ime ha.+ 18  Ndị a esiwo n’eziokwu dapụ,+ na-asị na e nwechaalarị mbilite n’ọnwụ;+ ha na-ekpukwa okwukwe nke ụfọdụ ndị ihu.+ 19  N’agbanyeghị nke ahụ, ntọala siri ike nke Chineke tọrọ na-eguzosi ike,+ ebe o nwere akara nke bụ́: “Jehova maara ndị bụ́ ndị ya,”+ nakwa: “Ka onye ọ bụla nke na-akpọ aha Jehova+ jụ ajọ omume.”+ 20  Ma n’ime ụlọ buru ibu, e nwere arịa dị iche iche, ọ bụghị naanị nke ọlaedo na ọlaọcha kamakwa nke osisi na nke ụrọ, ụfọdụ bụkwa maka nzube kwesịrị nsọpụrụ ma ndị ọzọ bụ maka nzube nsọpụrụ na-adịghị na ya.+ 21  Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla ezere ndị nke ikpeazụ ahụ, ọ ga-abụ arịa bụ́ maka nzube kwesịrị nsọpụrụ, nke e doro nsọ, nke baara onye nwe ya uru, nke a kwadebere maka ezi ọrụ ọ bụla.+ 22  N’ihi ya, gbaara ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa ọsọ,+ kama chụsoo ezi omume,+ okwukwe, ịhụnanya, udo,+ gị na ndị ji obi dị ọcha+ na-akpọku Onyenwe anyị. 23  Jụ ajụjụ nzuzu na nke na-enweghị isi,+ ebe ị maara na ha na-akpata ịlụ ọgụ.+ 24  Ma ohu nke Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ,+ kama o kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ,+ onye ruru eru izi ihe,+ onye na-ejide onwe ya mgbe ọnọdụ dị njọ,+ 25  jiri nwayọọ na-ezi ndị isi ike ihe;+ n’ihi na, ma eleghị anya, Chineke pụrụ ime ka ha nwee nchegharị+ nke na-eduga n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu,+ 26  anya ewee doo ha, ha ewee si n’ọnyà Ekwensu pụọ,+ ebe ha hụrụ na o jidewo ha ná ndụ+ ka ha wee mee uche ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji