Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 8:1-18

8  O wee ruo mgbe e mesịrị na Devid meriri ndị Filistia+ wee mee ka ha nọrọ n’okpuru ya,+ Devid wee nara ndị Filistia Meteg-ama.  O wee merie ndị Moab,+ ma jiri ụdọ e ji atụ̀ ihe tụọ ha, o mere ka ha dinara ala ka o wee jiri ụdọ ahụ tụta ụzọ abụọ ka e gbuo ha, tụtakwa otu ụzọ zuru ezu ka e debe ha ndụ;+ ndị Moab wee ghọọ ndị na-ejere Devid ozi+ ka ha wee na-atụrụ ya ụtụ.+  Devid wee gbuo Hadadiza+ nwa Rihọb bụ́ eze Zoba+ ka ọ na-aga inwetaghachi osimiri Yufretis.+  Devid wee jide otu puku na narị mmadụ asaa ya bụ́ ndị na-agba ịnyịnya nakwa puku mmadụ abụọ bụ́ ndị ji ụkwụ aga;+ Devid wee see+ ịnyịnya ụgbọala+ niile ha akwara, ma ọ hapụrụ otu narị ịnyịnya ụgbọala n’ime ha.  Mgbe Siria nke Damaskọs+ bịara inyere Hadadiza eze Zoba aka, Devid gburu puku ndị ikom iri abụọ na abụọ n’ime ndị Siria.+  Devid debekwara ndị agha na-eche nche+ na Siria nke Damaskọs. Ndị Siria wee ghọọ ndị na-ejere Devid ozi ka ha wee na-atụrụ ya ụtụ.+ Jehova wee na-azọpụta Devid n’ebe ọ bụla ọ gara.+  Devid bukọkwaara ọta ọlaedo dị okirikiri+ ndị na-ejere Hadadiza ozi bu wee bute ha na Jeruselem.  Eze Devid sikwa na Bita na Berotai, bụ́ obodo Hadadiza, buru ọla kọpa dị nnọọ ukwuu.+  Toaị eze Hemat+ wee nụ na Devid egbuwo ndị agha niile nke Hadadiza.+ 10  Toaị wee zipụ Joram nwa ya ka ọ gakwuru Devid wee jụọ ya otú o mere,+ jaakwa ya ike maka na o busoro Hadadiza agha wee gbuo ya (n’ihi na e nyere Hadadiza ọzụzụ ibuso Toaị agha); o jikwa ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee na ihe ndị e ji ọla kọpa mee jee.+ 11  Eze Devid dokwara ihe ndị a nsọ nye Jehova, tinyere ọlaọcha na ọlaedo ndị o doworo nsọ, bụ́ ndị si ná mba niile o meriri,+ 12  ya bụ, site na Siria na Moab+ nakwa site n’aka ụmụ Amọn na ndị Filistia+ na Amalek,+ na ihe a kwatara n’aka Hadadiza nwa Rihọb eze Zoba.+ 13  Devid wee meere onwe ya aha mgbe o si n’igbu ndị Idọm na Ndagwurugwu Nnu+ lọta—puku mmadụ iri na asatọ.+ 14  O wee debe ndị agha na-eche nche n’Idọm.+ O debere ndị agha na-eche nche n’Idọm dum, ndị Idọm niile wee ghọọ ndị na-ejere Devid ozi;+ Jehova wee na-azọpụta Devid n’ebe ọ bụla ọ gara.+ 15  Devid wee na-achị Izrel dum;+ Devid nọkwa na-ekpere ndị ya+ niile ikpe ziri ezi, na-emekwara ha ihe ziri ezi.+ 16  Joab+ nwa Zeruya bụ onyeisi ndị agha; Jehọshafat+ nwa Ahaịlọd bụ onye na-edekọ ihe. 17  Zedọk+ nwa Ahaịtọb na Ahimelek+ nwa Abayata bụ ndị nchụàjà, Seraya bụ odeakwụkwọ. 18  Benaya+ nwa Jehoyada bụ onyeisi ndị Keretaịt+ na ndị Peletaịt.+ Ma ụmụ Devid ghọrọ ndị nchụàjà.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji