Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 23:1-39

23  Ihe ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru:+ “Ihe si n’ọnụ Devid nwa Jesi pụta,+ Ihe si n’ọnụ nwoke dị elu pụta,+ Onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ,+ Na onye ọma nke na-abụrụ Izrel abụ olu ụtọ.+   Ọ bụ mmụọ Jehova kwuru okwu site n’ọnụ m,+ Okwu ya dịkwa n’ire m.+   Chineke Izrel sịrị, Oké Nkume Izrel gwara m, sị,+ ‘Mgbe onye na-achị ụmụ mmadụ bụ onye ezi omume,+ Na-achị n’egwu Chineke,+   Mgbe ahụ, ọ na-adị ka ìhè ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-awa,+ Ụtụtụ nke ígwé ojii na-adịghị. Site n’ìhè, site na mmiri ozuzo, ahịhịa na-epulite n’ala.’+   Ọ̀ bụ na ezinụlọ m adịghị otú ahụ n’ebe Chineke nọ?+ N’ihi na ndụ mụ na ya gbara bụ ọgbụgba ndụ na-adịru mgbe ebighị ebi,+ Nke e doro nnọọ n’usoro n’ihe niile ma chekwaa ya.+ N’ihi na ọ bụ nzọpụta+ m dum na ọṅụ m dum, Ọ́ bụghị ya mere ọ ga-eji mee ka o too?+   Ma a na-achụpụ+ ndị na-abaghị n’ihe,+ ndị dị ka osisi ogwu,+ ha niile; N’ihi na a gaghị eji aka chịrị ha.   Mgbe mmadụ ga-emetụ ha aka, Ọ ga-ejikere nke ọma wee jiri ígwè na ube, A ga-ejikwa ọkụ rechapụ ha kpamkpam.”+  Ndị a bụ aha ndị dike+ Devid: Josheb-bashibet+ onye Takimọnaịt, onyeisi mmadụ atọ ahụ. O ji ube ya gbuo narị mmadụ asatọ otu mgbe.  Onye na-esote ya, bụ́ Elieza+ nwa Dodo+ nwa Ahohaị, bụ otu n’ime ndị dike atọ ha na Devid nọ mgbe ha kwara ndị Filistia emo. Ha zukọtara n’ebe ahụ ibu agha, ndị ikom Izrel wee gbaghachi azụ.+ 10  Ọ bụ ya biliri wee na-egbu ndị Filistia ruo mgbe aka ya na-adịkwaghị ike, aka ya wee jidesie mma agha ya ike,+ Jehova wee zọpụta ha n’ụzọ dị ukwuu n’ụbọchị ahụ;+ ma ndị Izrel so ya laghachi gaa yipụ ndị e gburu egbu ihe ha yi.+ 11  Onye na-esote ya bụ Shama nwa Egi onye Hararaịt.+ Ndị Filistia wee zukọta na Lihaị, bụ́ ebe e nwere ibé ala nke ahịhịa lentil jupụtara na ya;+ ndị Izrel gbakwara ọsọ n’ihi ndị Filistia. 12  Ma o guzoro n’etiti ibé ala ahụ napụta ya wee na-egbu ndị Filistia, Jehova wee zọpụta ha n’ụzọ dị ukwuu.+ 13  Mmadụ atọ n’ime mmadụ iri atọ bụ́ ndị isi+ wee gbadakwuru Devid n’ọgba Adọlam+ n’oge owuwe ihe ubi; ebe ndị Filistia mara ụlọikwuu dịkwa na ndagwurugwu Refeyim.+ 14  N’oge ahụ, Devid nọ n’ebe siri ike mbanye;+ ebe ndị agha ndị Filistia na-anọ eche nche+ dịkwa na Betlehem n’oge ahụ. 15  Mgbe nwa oge gasịrị, Devid kwupụtara ihe na-agụ ya agụụ wee sị: “A sị nnọọ na m ga-aṅụ mmiri si n’olulu mmiri Betlehem nke dị n’ọnụ ụzọ ámá!”+ 16  Ndị dike atọ ahụ wee waba n’ebe ndị Filistia mara ụlọikwuu, sere mmiri n’olulu mmiri Betlehem nke dị n’ọnụ ụzọ ámá wee buru ya butere Devid;+ ma o kweghị ịṅụ ya, kama ọ wụpụụrụ+ ya Jehova. 17  O wee sị: “Tụfịakwa!+ Agaghị m eme ihe a, Jehova. M̀ ga-aṅụ ọbara+ ndị ikom ndị tinyere mkpụrụ obi ha n’ihe ize ndụ gaa seta mmiri?” O kweghị ịṅụ ya. Ọ bụ ihe ndị a ka ndị dike atọ ahụ mere. 18  Ma Abishaị+ nwanne Joab nwa Zeruya+ bụ onyeisi ndị ikom iri atọ ahụ, o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ, aha ya na-edekwa ude dị ka nke mmadụ atọ ahụ.+ 19  Ọ bụ ezie na ọ bụ onye a na-akwanyere ùgwù karịa ọbụna ndị ọzọ n’ime mmadụ iri atọ ahụ, bụrụkwa onyeisi ha, ọ harughị ka mmadụ atọ ndị mbụ ahụ.+ 20  Ma, ọ bụ Benaya,+ nwa Jehoyada,+ nwa otu nwoke bụ́ dike, onye mere ọtụtụ ihe na Kabzil,+ gburu ụmụ ndị ikom abụọ nke Ariel onye Moab; ọ bụkwa ya gbadara wee gbuo ọdụm+ n’ime olulu mmiri n’ụbọchị snoo na-ada.+ 21  Ọ bụkwa ya gburu nwoke Ijipt ahụ gbara ajọ dimkpa.+ Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ube n’aka, o ji mkpara gbadakwuru ya wee napụ onye Ijipt ahụ ube o ji ma were ube ya gbuo ya.+ 22  Ihe ndị a ka Benaya+ nwa Jehoyada mere; aha ya na-edekwa ude dị ka nke ndị dike atọ ahụ.+ 23  Ọ bụ ezie na a na-akwanyere ya ùgwù karịa ọbụna mmadụ iri atọ ahụ, ọ harughị ka mmadụ atọ ahụ; ma Devid họpụtara ya ịbụ onye nche ya.+ 24  Asahel+ nwanne Joab bụ otu n’ime mmadụ iri atọ ahụ; Elhenan+ nwa Dodo onye Betlehem, 25  Shama+ onye Herọd, Elaịka onye Herọd, 26  Hilez+ onye Paltaịt, Aịra+ nwa Ikesh+ onye Tekoa, 27  Abi-iza+ onye Anatọt,+ Mebọnaị onye si n’agbụrụ Husha,+ 28  Zalmọn onye si n’agbụrụ Ahohaị,+ Meharaị+ onye Netofa, 29  Hileb+ nwa Beana onye Netofa, Ịtaị+ nwa Raịbaị onye Gibia nke ụmụ Benjamin, 30  Benaya+ onye Piratọn, Hidaị onye si na ndagwurugwu Geash,+ 31  Ebaị-albọn onye Bet-araba, Azmavet+ onye Bahurim, 32  Elayaba onye Shealbim, ụmụ Jeshen, Jọnatan,+ 33  Shama onye Hararaịt, Ahayam+ nwa Shera onye Hararaịt, 34  Elifelet nwa Ahasbaị nwa onye Meakat, Elayam nwa Ahitofel+ onye Gaịlo. 35  Hezro+ onye Kamel, Pearaị onye obodo Arab, 36  Aịgal nwa Netan+ onye Zoba, Benaị onye Gad, 37  Zilek+ onye Amọn, Neharaị onye Bierọt, bụ́ ndị na-eburu Joab nwa Zeruya ihe agha, 38  Aịra onye Itraịt,+ Gereb+ onye Itraịt, 39  Yuraya+ onye Het—ha niile dị iri atọ na asaa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji