Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 22:1-51

22  Devid wee gwa Jehova okwu ndị dị n’abụ+ a n’ụbọchị Jehova napụtara ya n’ọbụ aka ndị iro+ ya niile nakwa n’ọbụ aka Sọl;+  o wee sị:“Jehova bụ nkume m dị elu+ na ebe m e wusiri ike+ na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.+   Chineke m bụ oké nkume m.+ M ga-agbaba n’ime ya,Ọta+ m na mpi+ nzọpụta m, bụ́ ebe m dị elu nke e wusiri ike,+Na ebe mgbaba m,+ Onye Nzọpụta m;+ ị na-azọpụta m n’ihe ike.+   M ga-akpọku Jehova, bụ́ Onye e kwesịrị inye otuto,+A ga-azọpụtakwa m n’aka ndị iro m.+   N’ihi na ebili mmiri nke na-egbu mmadụ gbara m gburugburu;+E nwere oké idei mmiri nke ndị na-abaghị n’ihe nke nọ na-emenye m ụjọ.+   Ụdọ Shiol gbara m gburugburu;+Ọnyà ọnwụ chere m ihu.+   N’oge m nọ n’ahụhụ, m nọ na-akpọku Jehova,+Ọ bụkwa Chineke m ka m nọ na-akpọku.+O wee nọrọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m,+Mkpu enyemaka m tiri rukwara ya ntị.+   Ụwa wee malite ịṅagharị na ịma jijiji;+Ntọala eluigwe wee maa jijiji,+Ha wee na-aṅagharị n’ihi na a kpasuwo ya iwe.+   Anwụrụ ọkụ wee si n’oghere imi ya kwụgoo, ọkụ nke si ya n’ọnụ nọkwa na-erepịa ihe;+Icheku ọkụ sikwa n’ebe ọ nọ na-apụta.+ 10  O wee bịada eluigwe rịdata;+Oké ọchịchịrị dịkwa n’okpuru ụkwụ ya.+ 11  Ọ nọ n’elu cherọb+ gbara bịa, ferekwa efe bịa;E wee hụ ya n’elu nku otu mmụọ.+ 12  O wee mee ka ọchịchịrị gbaa ya gburugburu dị ka ụlọ ndò,+Meekwa ka mmiri rujuru eruju na ígwé ojii+ gbaa ya gburugburu. 13  Icheku ọkụ si n’ìhè dị n’ihu ya na-enwu.+ 14  Jehova si n’eluigwe malite ibigbọ,+Onye Kasị Elu malitekwara ime ka a nụ olu ya.+ 15  O wee na-agbapụ akụ́, ka o wee chụsaa ha;+Meekwa ka àmụ̀mà gbuo, ka o wee tinye ha n’ọgba aghara.+ 16  A hụrụ ala oké osimiri,+E kpughere ntọala nke elu ala,+Mgbe Jehova bara mba, site n’ume nke si n’oghere imi ya.+ 17  O si n’elu matịa aka ya kpọrọ m,+Ọ dọpụtara m ná nnukwu mmiri.+ 18  Ọ napụtara m n’aka onye iro m dị ike,+N’aka ndị kpọrọ m asị; n’ihi na ha ka m ike.+ 19  Ha nọ na-emegide m n’ụbọchị m nwere ọdachi,+Ma Jehova ghọrọ onye na-akwado m.+ 20  O wee kpọpụta m kpọba m n’ebe sara mbara;+Ọ napụtara m, n’ihi na ihe m masịrị ya.+ 21  Jehova na-akwụ m ụgwọ dị ka ezi omume m si dị:+Ọ bụkwa dị ka aka m si dị ọcha ka ọ na-akwụ m ụgwọ.+ 22  N’ihi na edebewo m ụzọ Jehova,+Emeghị m omume ọjọọ nke bụ́ ịhapụ Chineke m.+ 23  N’ihi na mkpebi ikpe+ ya niile dị m n’ihu;Agaghịkwa ahapụ ụkpụrụ ya.+ 24  M ga-abụ onye na-enweghị ntụpọ+ n’ebe ọ nọ,Mụ onwe m ga-ezerekwa njehie.+ 25  Ka Jehova kwụọ m ụgwọ dị ka ezi omume m si dị,+Dị ka m si dị ọcha n’ihu ya.+ 26  Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe;+Ị ga-emeso onye na-enweghị ntụpọ, bụ́ dike, ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ;+ 27  Ị ga-egosi onye na-edebe onwe ya ọcha na gị onwe gị dị ọcha,+Ị ga-emesokwa onye gbagọrọ agbagọ ihe dị ka à ga-asị na ị dị iberiibe.+ 28  Ị ga-azọpụtakwa ndị dị umeala n’obi;+Ma ị na-ele ndị mpako anya ọjọọ, ka i wee weda ha ala.+ 29  N’ihi na ị bụ oriọna m, Jehova,+Ọ bụkwa Jehova na-eme ka ìhè nwuo n’ọchịchịrị m.+ 30  N’ihi na site n’enyemaka gị, m pụrụ ịchụ ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ọsọ;+Site n’enyemaka Chineke m, m pụrụ ịrị mgbidi.+ 31  Ezi Chineke, ụzọ ya zuru okè;+Okwu Jehova bụ okwu a nụchara anụcha.+Ọ bụ ọta nye ndị niile na-agbaba n’ime ya.+ 32  N’ihi na ònye bụ Chineke ma e wezụga Jehova,+Ònyekwa bụ oké nkume ma e wezụga Chineke anyị?+ 33  Ezi Chineke bụ ebe m e wusiri ike,+Ọ ga-emekwa ka ụzọ m zuo okè,+ 34  Mee ka ụkwụ m na-awụ ọsọ dị ka ụkwụ nne ele;+Ọ na-emekwa ka m guzoro n’ebe dịịrị m elu.+ 35  Ọ na-akụziri aka m otú e si ebu agha;+Ogwe aka m ekwewo ụta ọla kọpa.+ 36  Ị ga-enyekwa m ọta nzọpụta gị,+Ọ bụkwa ịdị umeala n’obi gị na-eme ka m dị ukwuu.+ 37  Ị ga-eme ohere sara mbara nke ga-aba ụkwụ m;+Nkwonkwo ụkwụ m agaghịkwa ama jijiji.+ 38  M ga-achụ ndị iro m ọsọ, ka m wee laa ha n’iyi,Agaghị m alaghachi azụ ruo mgbe e kpochapụrụ ha.+ 39  M ga-ekpochapụ ha ma tipịasịa ha,+ ka ha wee ghara ibili;+Ha ga-adakwa, mụ azọọ ha ụkwụ.+ 40  Ị ga-eke m ike n’úkwù maka ibu agha;+Ị ga-eme ka ndị na-ebili imegide m daa n’okpuru m.+ 41  Ị ga-eme ka ndị iro m gbaa ọsọ;+M ga-ebibikwa ndị kpọrọ m oké asị.+ 42  Ha na-eti mkpu enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha;+Ha na-etiku Jehova, ma ọ dịghị aza ha.+ 43  M ga-asụri ha ka ha dị ka uzuzu dị n’ala;M ga-egweri ha ka ha dị ka apịtị dị n’okporo ámá;+M ga-akụ ha ka ha dị mbadamba. 44  Ị ga-emere m ụzọ m ga-esi gbanahụ nkatọ nke ndị m na-akatọ m.+Ị ga-echebe m ka m bụrụ onyeisi nke mba dị iche iche;+Ndị m na-amaghị ga-ejere m ozi.+ 45  Ndị mba ọzọ ga-eji egwu bịakwute m;+Nrubeisi ga-eme ka ntị ha nụrụ okwu m.+ 46  Ike ga-agwụ ndị mba ọzọ,Ha ga-amarakwa jijiji si ná mgbidi ha siri ike pụta.+ 47  Jehova dị ndụ;+ ka Oké Nkume+ m bụrụ onye a gọziri agọzi;Ka e buliekwa Chineke bụ́ oké nkume nke nzọpụta m elu.+ 48  Ezi Chineke bụ Onye na-abọrọ m ọbọ+Na Onye na-ewetu ndị dị iche iche n’okpuru m,+ 49  Nakwa Onye na-akpọpụta m n’aka ndị iro m.+Ị ga-ebulikwa m elu ka m karịa ndị na-ebili imegide m;+Ị ga-anapụta m n’aka onye na-eme ihe ike.+ 50  Ọ bụ ya mere m ga-eji kelee gị, Jehova, n’etiti mba dị iche iche;+M ga-abụkukwa aha gị abụ olu ụtọ:+ 51  Onye na-eme ka eze ya nwee nzọpụta dị ukwuu,+Na-egosikwa onye o tere mmanụ,+ bụ́ Devid, na mkpụrụ ya, obiọma,*Ruo mgbe ebighị ebi.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”