Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 2:1-32

2  O wee ruo, mgbe e mesịrị, na Devid jụrụ Jehova ase,+ sị: “Ọ̀ bụ m gbagoo n’otu n’ime obodo ndị dị na Juda?” Jehova wee sị ya: “Gbagoo.” Devid wee sị: “Olee ebe m ga-agbago?” O wee sị: “Hibrọn.”+  Devid wee gbagoo n’ebe ahụ, ya na ndị nwunye ya abụọ, Ahịnoam+ nwaanyị Jezril na Abigel+ nwunye Nebal onye Kamel.  Devid kpọkwa ndị ikom+ ya na ha nọ gbagoo, onye nke ọ bụla na ezinụlọ ya; ha wee biri n’obodo ndị dị n’ókèala Hibrọn.  Ndị Juda+ wee bịa tee Devid mmanụ+ n’ebe ahụ ịbụ eze ụlọ Juda.+ Ha wee bịa sị Devid: “Ọ bụ ndị Jebesh-gilied liri Sọl.”  N’ihi ya, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gakwuru ndị Jebesh-gilied+ wee sị ha: “Ka Jehova gọzie unu,+ n’ihi na unu gosiri onyenwe unu, bụ́ Sọl, obiọma*+ dị otú a, n’ihi na unu liri ya.+  Ugbu a, ka Jehova gosi unu obiọma+ na ikwesị ntụkwasị obi, mụ onwe m kwa ga-egosi unu ịdị mma nke a n’ihi na unu emewo ihe a.+  Ugbu a, meenụ ka aka unu dị ike, bụrụkwanụ ndị dike,+ n’ihi na Sọl onyenwe unu anwụwo, ọ bụkwa mụ onwe m ka ụlọ Juda teworo mmanụ ịbụ eze+ ha.”  Ma Abna+ nwa Nee, bụ́ onyeisi ndị agha Sọl, kpọọrọ Ish-boshet+ nwa Sọl wee kpọfee ya Mahaneyim,+  meekwa ya eze ka ọ chịwa Gilied+ na ndị Ashọraịt na Jezril+ na Ifrem+ na Benjamin+ na Izrel, ha niile. 10  Ish-boshet, nwa Sọl, gbara afọ iri anọ mgbe ọ ghọrọ eze Izrel, ọ chịkwara dị ka eze ruo afọ abụọ. Ọ bụ naanị ụlọ Juda+ bụ ndị sooro Devid. 11  Ụbọchị niile Devid chịrị ụlọ Juda dị ka eze na Hibrọn wee bụrụ afọ asaa na ọnwa isii.+ 12  Ka oge na-aga, Abna nwa Nee na ndị na-ejere Ish-boshet, nwa Sọl, ozi, si Mahaneyim+ gaa Gibiọn.+ 13  Ma Joab+ nwa Zeruya+ na ndị na-ejere Devid ozi pụrụ wee mesịa zute n’akụkụ ọdọ mmiri Gibiọn; ha wee nọrọ ọdụ, ndị nke a n’otu akụkụ ọdọ mmiri ahụ, ndị nke ọzọ kwa n’akụkụ nke ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. 14  N’ikpeazụ, Abna sịrị Joab: “Biko, ka ụmụ okorobịa ndị a bilie, ka ha lụọ ọgụ n’ihu anyị.” Joab wee sị: “Ka ha bilie.” 15  Ha wee bilie. Ìgwè abụọ ahụ wee gụpụta ndị nke ha. Ha wee gafere. Mmadụ iri na abụọ bụ ndị nke Benjamin na Ish-boshet,+ nwa Sọl, mmadụ iri na abụọ bụkwa ndị si n’etiti ndị na-ejere Devid ozi. 16  Ha wee malite ijide ibe ha n’isi, onye nke ọ bụla wee na-ama ibe ya mma n’akụkụ, nke mere ka ha niile daa n’otu. E wee kpọọ ebe ahụ Helkat-hazurim, nke dị na Gibiọn.+ 17  Ọgụ ahụ wee sie oké ike n’ụbọchị ahụ, n’ikpeazụ, ndị na-ejere Devid ozi meriri Abna+ na ndị ikom Izrel. 18  Ụmụ ndị ikom atọ nke Zeruya+ nọ n’ebe ahụ, Joab+ na Abishaị+ na Asahel;+ Asahel nwere ụkwụ ọsọ, dị ka nne mgbada+ nke bi n’ọhịa. 19  Asahel wee chụwa Abna, ọ chọghịkwa ịga n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe wee kwụsị ịchụ Abna. 20  E mesịa, Abna lere anya n’azụ wee sị: “Ọ̀ bụ gị, Asahel?” o wee zaa, sị: “Ọ bụ m.” 21  Abna wee sị ya: “Gaa n’aka nri gị ma ọ bụ n’aka ekpe gị jide otu n’ime ụmụ okorobịa ndị ahụ ka ọ bụrụ nke gị, werekwa ihe i yipụrụ+ n’ahụ́ ya ka ọ bụrụ nke gị.” Ma Asahel achọghị ịkwụsị ịchụ ya. 22  Abna wee gwa Asahel ọzọ, sị: “Kwụsị ịchụ m. Ị̀ chọrọ ka m gbuo gị?+ Oleezi ihu m ga-eji zute Joab nwanne gị?” 23  Ma ọ jụrụ ịkwụsị; Abna wee maa ya isi ube n’afọ,+ ube ahụ wee si ya n’azụ pụta; o wee daa nwụọ n’ebe ahụ. O wee ruo na ndị niile bịarutere n’ebe ahụ Asahel dara nwụọ na-akwụsị guzoro.+ 24  Joab na Abishaị wee chụwa Abna. Ka anyanwụ na-ada, ha onwe ha bịarutere n’ugwu Ama, nke dị n’ihu Gaya n’ụzọ gara n’ala ịkpa Gibiọn.+ 25  Ụmụ Benjamin wee zukọta n’azụ Abna, ha wee bụrụ otu ìgwè ma guzoro n’elu otu ugwu. 26  Abna wee malite ịkpọ Joab, sị: “Mma agha ọ̀ ga na-eripịa+ ndị mmadụ n’akwụsịghị akwụsị? Ọ̀ bụ na ị maghị na obi ilu bụ ihe ga-esi na ya pụta n’ikpeazụ?+ Olee mgbe ọ ga-eru tupu gị agwa ndị gị ka ha kwụsị ịchụ ụmụnne ha?”+ 27  Joab wee sị: “Dị nnọọ ka ezi Chineke dị ndụ,+ a sị na i kwughị okwu,+ ọ gaara abụ n’ụtụtụ ka onye ọ bụla n’ime ndị m ga-akwụsị ịchụ nwanne ya.” 28  Joab wee fụọ opi,+ ndị ya niile wee kwụsị, ha agaghịkwa n’ihu ịchụ Izrel, ha alụghịkwa ọgụ ahụ ọzọ. 29  Ma Abna na ndị ikom ya gara ije abalị ahụ dum gabiga Araba+ ma gafere Jọdan,+ gabigakwa ndagwurugwu ya dum, e mesịa, ha bịarutere Mahaneyim.+ 30  Ma Joab kwụsịrị ịchụ Abna wee malite ịkpọkọta ndị ya niile. Ndị a na-ahụkwaghị n’ime ndị na-ejere Devid ozi dị ndị ikom iri na itoolu, tinyere Asahel. 31  Ndị na-ejere Devid ozi gbukwara ndị nke Benjamin na ndị ikom Abna—ndị nwụrụnụ dị narị ndị ikom atọ na iri isii.+ 32  Ha wee buru Asahel+ lie n’ebe e liri nna ya,+ nke dị na Betlehem.+ Joab na ndị ikom ya wee gaa ije abalị ahụ dum, chi wee bọkwuru ha na Hibrọn.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”