Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 10:1-19

10  O wee ruo mgbe e mesịrị na eze ụmụ Amọn+ nwụrụ, nwa ya Henọn wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.+  Devid wee sị: “M ga-egosi Henọn nwa Nehash obiọma,* dị nnọọ ka nna ya gosiri m obiọma.”+ Devid wee si n’ọnụ ndị na-ejere ya ozi+ ziga ozi ka ha kasie ya obi maka nna ya, ndị na-ejere Devid ozi wee bata n’ala ụmụ Amọn.  Otú ọ dị, ndị isi ụmụ Amọn gwara Henọn onyenwe ha, sị: “N’anya gị, ọ̀ bụ ùgwù ka Devid na-akwanyere nna gị, nke mere o ji zitere gị ndị nkasi obi? Ọ́ bụghị inyocha obodo a na iledo+ ya na ịkwatu ya mere Devid ji zitere gị ndị na-ejere ya ozi?”+  Henọn wee kpọrọ ndị na-ejere Devid ozi kpụchapụ ọkara ajị agba ha+ ma chawaa uwe mwụda ha ruo n’ikè wee hapụ ha ka ha lawa.+  E mesịa, ndị mmadụ kọọrọ ya Devid, o wee zipụ ndị mmadụ ozugbo ka ha gaa zute ha, n’ihi na ihere ji ndị ikom ahụ nke ukwuu; eze wee sị ha: “Nọrọnụ na Jeriko+ ruo mgbe ajị agba unu rujuru. Mgbe ahụ, unu ga-alọta.”  Ka oge na-aga, ụmụ Amọn hụrụ na ha na-esizi ísì ọjọọ+ n’ebe Devid nọ, ụmụ Amọn wee dunye ndị ozi, ha wee gaa goo ndị Siria nke Bet-rihọb+ na ndị Siria nke Zoba,+ puku ndị ikom iri abụọ ji ụkwụ aga, gookwa otu puku ndị ikom site n’aka eze Meaka,+ nakwa puku ndị ikom iri na abụọ site n’aka Ishtọb.  Mgbe Devid nụrụ ya, o zipụrụ Joab na ndị agha niile na ndị dike.+  Ụmụ Amọn wee malite ịpụta na ịhazi onwe ha n’usoro iji buo agha n’ọnụ ụzọ ámá, ndị Siria nke Zoba na nke Rihọb,+ tinyere Ishtọb na Meaka, nọkwa naanị ha n’ọhịa.+  Mgbe Joab hụrụ na e si n’ihu, sikwa n’azụ na-abịa ibuso ya agha, ozugbo, ọ họọrọ ụfọdụ n’ime ndị niile kasị ike+ n’Izrel wee hazie ha n’usoro izute ndị Siria. 10  O nyefekwara Abishaị+ nwanne ya ndị fọdụrụnụ, ka ọ hazie ha n’usoro izute ụmụ Amọn.+ 11  O wee sị: “Ọ bụrụ na ndị Siria akarịa m ike, ị ga-abụrụ m onye nzọpụta; ma ọ bụrụ na ụmụ Amọn akarịa gị ike, m ga-abịa zọpụta gị.+ 12  Dị ike, ka anyị nweekwa obi ike+ n’ihi ndị ala anyị nakwa n’ihi obodo niile nke Chineke anyị;+ Jehova ga-emekwa ihe dị mma n’anya ya.”+ 13  Joab na ndị ya na ha so wee gaa ibuso ndị Siria agha, ha wee si n’ihu ya gbaa ọsọ.+ 14  Ma ụmụ Amọn hụrụ na ndị Siria agbaala ọsọ, ha onwe ha si n’ihu Abishaị gbaa ọsọ wee gbaba n’obodo.+ E mesịa, Joab si n’ibuso ụmụ Amọn agha lọta wee bịa Jeruselem.+ 15  Mgbe ndị Siria hụrụ na ndị Izrel emeriwo ha, ha malitere izukọta. 16  Hadadiza+ wee zie ozi ma kpọpụta ndị Siria nọ n’ógbè Osimiri Yufretis;+ ha wee bịa na Hilam, Shobak,+ bụ́ onyeisi ndị agha Hadadiza, dukwa ha. 17  Mgbe a kọọrọ ya Devid, ọ kpọkọtara Izrel dum ozugbo gafee Jọdan wee bịarute Hilam. Ndị Siria wee hazie onwe ha n’usoro izute Devid, ha wee malite ibuso ya agha.+ 18  Ndị Siria wee si n’ihu Izrel gbaa ọsọ;+ Devid wee gbuo n’ime ndị Siria narị mmadụ asaa ndị na-anya ụgbọ ịnyịnya na puku mmadụ iri anọ ndị na-agba ịnyịnya,+ o gbukwara Shobak onyeisi ndị agha ha, o wee nwụọ n’ebe ahụ.+ 19  Mgbe ndị eze niile,+ ndị na-ejere Hadadiza ozi, hụrụ na Izrel emeriwo ha,+ ngwa ngwa ha mere ka ha na Izrel dị n’udo, ha wee malite ijere ha ozi;+ egwu wee jide ndị Siria ịnwa ịzọpụta ụmụ Amọn ọzọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”