Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ihe E Mere 33:1-25

33  Manase+ gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri ise na ise na Jeruselem.+  O wee mee ihe jọrọ njọ n’anya Jehova,+ dị ka ihe arụ+ nke mba ndị ahụ Jehova chụpụrụ n’ihu ụmụ Izrel si dị.+  O wee wughachi ebe ndị dị elu+ Hezekaya nna ya kwaturu,+ wukwaara Bel+ ebe ịchụàjà+ ma mee ogwe osisi ndị dị nsọ.+ O wee malite ịkpọrọ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe+ isiala,+ na-efekwa ha ofufe.+  O wukwara ebe ịchụàjà+ dị iche iche n’ụlọ Jehova, bụ́ ụlọ Jehova kwuru banyere ya, sị: “Ọ bụ na Jeruselem ka aha m ga-adị ruo mgbe a na-akaghị aka.”+  O wukwaara ìgwè ihe niile dị n’eluigwe+ ebe ịchụàjà dị iche iche n’ogige abụọ+ dị n’ụlọ Jehova.+  O surekwara* ụmụ ya n’ọkụ+ na ndagwurugwu nwa Hinọm.+ O mekwara anwansi,+ gbaa afa+ ma mee mgbaasị,+ o mekwara ka e nwee ndị na-eme mgbaasị+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu.+ O mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova nke ukwuu iji kpasuo ya iwe.+  O debekwara ihe oyiyi a pịrị apị+ o mere n’ụlọ ezi Chineke,+ bụ́ ụlọ Chineke gwara Devid, gwakwa Sọlọmọn nwa ya banyere ya, sị: “Ọ bụ n’ụlọ a nakwa na Jeruselem, bụ́ ebe m họọrọ+ n’etiti ebo niile nke Izrel, ka m ga-eme ka aha m dịrị+ ruo mgbe a na-akaghị aka.+  Agaghịkwa m eme ka ụkwụ Izrel pụọ ọzọ n’ala m kenyere+ ndị nna nna ha,+ ma ọ bụrụhaala na ha elezie anya mee ihe niile m nyere ha n’iwu+ site n’aka Mozis,+ bụ́ iwu dum+ na ụkpụrụ+ na mkpebi ikpe dị iche iche.”+  Manase+ wee na-arafu Juda+ na ndị bi na Jeruselem ime ihe ọjọọ karịa+ mba ndị ahụ Jehova lara n’iyi n’ihu ụmụ Izrel.+ 10  Jehova wee na-agwa Manase na ndị ya okwu, ma ha aṅaghị ntị.+ 11  N’ikpeazụ, Jehova mere ka ndị isi agha nke eze Asiria+ buso ha agha.+ Ha wee nwụde Manase n’ọgba+ wee tụọ ya ịgà+ abụọ e ji ọla kọpa mee ma kpụga ya Babịlọn. 12  Ma ozugbo ọ nọ n’oké ahụhụ,+ o mere ka obi Jehova bụ́ Chineke ya jụrụ,+ o wee na-eweda onwe ya ala+ nke ukwuu n’ihi Chineke nna nna ya hà. 13  O wee na-ekpeku ya ekpere, nke mere na ọ nabatara+ arịrịọ ya. O wee nụ arịrịọ ọ na-arịọ ka e meere ya amara. O wee mee ka ọ lọghachi Jeruselem, n’ọchịchị ya;+ Manase wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+ 14  Mgbe nke a gasịrị, o wuru mgbidi ọzọ n’ihu+ mgbidi Obodo Devid,+ n’ebe ọdịda anyanwụ Gaịhọn+ nke dị na ndagwurugwu, o wuru ya ruo Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀,+ wuo ya gburugburu ruo Ofel.+ O wulikwara ya elu nke ukwuu. O debekwara ndị ọchịagha n’obodo niile e wusiri ike dị na Juda.+ 15  O wee wepụ chi ndị mba ọzọ+ na ihe oyiyi arụsị+ n’ụlọ Jehova, wepụkwa ebe ịchụàjà niile+ o wuru n’ugwu nke ụlọ Jehova nakwa na Jeruselem, o mekwara ka e kpofuo ha ná mpụga obodo. 16  O dozikwara ebe ịchụàjà Jehova+ wee malite ịchụ àjà udo+ na àjà ekele+ n’elu ya. O wee gwa Juda ka ha fee Jehova bụ́ Chineke Izrel ofufe.+ 17  Otú o sina dị, ndị mmadụ nọ na-achụ àjà n’ebe ndị dị elu;+ kama ọ bụ Jehova bụ́ Chineke ha ka ha na-achụrụ ya. 18  Ma ihe ndị ọzọ metụtara Manase na ekpere+ o kpekuru Chineke ya na okwu ndị ọhụụ+ nọ na-agwa ya n’aha Jehova bụ́ Chineke Izrel, lee, ha so n’ihe ndị e dere n’akwụkwọ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Izrel.+ 19  Ma ekpere ya+ na otú e si meere ya ihe ọ rịọrọ n’arịrịọ+ na mmehie ya dum+ na ekwesịghị ntụkwasị obi ya+ na ebe ndị o wuru ebe ndị dị elu+ ma debe ogwe osisi ndị dị nsọ+ na ihe oyiyi a pịrị apị+ tupu ya eweda onwe ya ala,+ lee, ha so n’ihe e dere n’okwu ndị ọhụụ ya. 20  N’ikpeazụ, Manase sooro nna nna ya hà dinaa,+ ha wee lie ya+ n’ụlọ ya; Emọn+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya. 21  Emọn+ gbara afọ iri abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ abụọ na Jeruselem.+ 22  O wee mee ihe jọrọ njọ n’anya Jehova,+ dị nnọọ ka Manase nna ya mere;+ Emọn chụụrụ ihe oyiyi niile a pịrị apị+ nna ya Manase+ mere àjà,+ ọ nọkwa na-efe ha ofufe.+ 23  O wedaghịkwa onwe ya ala+ n’ihi Jehova otú Manase nna ya wedara onwe ya ala,+ n’ihi na ọ bụ Emọn mere ka ikpe ọmụma dị ukwuu.+ 24  N’ikpeazụ, ndị na-ejere ya ozi gbaara ya izu+ wee gbuo ya n’ụlọ ya.+ 25  Ma ndị ala ahụ gburu+ ndị niile ahụ gbaara+ Eze Emọn izu.+ Ndị+ ala ahụ wee mee Josaya+ nwa ya eze n’ọnọdụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mee ka ụmụ ya gabiga n’ọkụ.”