Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 NdịTesalonaịka 3:1-18

3  N’ikpeazụ, ụmụnna anyị, na-ekpenụ ekpere n’ihi anyị,+ ka okwu Jehova+ wee na-aga n’ihu ọsọ ọsọ,+ bụrụkwa nke a na-enye otuto dị nnọọ ka ọ dị n’ebe unu nọ n’ezie;  ka e wee napụta anyị n’aka ndị ajọ mmadụ, ndị na-emerụ mmadụ ahụ́,+ n’ihi na ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe.+  Ma Onyenwe anyị kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-emekwa ka unu guzosie ike, na-echekwa unu nche n’ihi ajọ onye ahụ.+  Anyị nwekwara obi ike+ n’ebe unu nọ n’ime Onyenwe anyị, na unu na-eme ihe anyị nyere n’iwu, na unu ga na-emekwa ya.+  Ka Onyenwe anyị na-eduzi obi unu n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ya bụ, ka unu wee hụ Chineke n’anya,+ ka unu wee na-atachikwa obi+ n’ihi Kraịst.  Ụmụnna anyị, anyị na-enye unu iwu+ n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ka unu zere+ nwanna ọ bụla nke na-adịghị agazi agazi,+ nke na-adịghịkwa eso omenala unu natara n’aka anyị.+  N’ihi na unu onwe unu maara ụzọ unu kwesịrị isi na-eṅomi anyị,+ n’ihi na anyị abụghị ndị na-adịghị agazi agazi mgbe anyị nọ n’etiti unu,+  anyị erighịkwa nri onye ọ bụla n’efu.+ Kama nke ahụ, site n’ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ nakwa ná ndọlị+ abalị na ehihie, anyị nọ na-arụ ọrụ ka anyị wee ghara ibo onye ọ bụla n’ime unu oké ibu arọ.+  Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ime otú ahụ,+ kama ọ bụ ka anyị wee were onwe anyị meere unu ihe nlereanya ka unu ṅomie anyị.+ 10  N’eziokwu, mgbe anyị na unu nọkwa, anyị na-enye unu iwu a:+ “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya erila ihe.”+ 11  N’ihi na anyị na-anụ na ụfọdụ ndị adịghị agazi agazi+ n’etiti unu, ha adịghịkwa arụ ọrụ ma ọlị, kama ha na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha.+ 12  Anyị na-enye ndị dị otú ahụ iwu na ndụmọdụ n’ime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na site n’iji obi nwayọọ na-arụ ọrụ, ha kwesịrị iri nri ha onwe ha rụtara.+ 13  Unu onwe unu, ụmụnna anyị, unu adala mbà n’ime ihe ziri ezi.+ 14  Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị erube isi n’okwu anyị kwuru+ site n’akwụkwọ ozi a, rịbanụ onye ahụ ama,+ unu na ya kwụsị ịkpakọrịta,+ ka ihere wee mee ya.+ 15  Ma unu ewerela ya dị ka onye iro, kama na-adụnụ ya ọdụ+ dị ka nwanna. 16  Ka Onyenwe udo nye unu udo mgbe dum n’ụzọ niile.+ Ka Onyenwe anyị nọnyere unu niile. 17  Nke a bụ ekele m, nke mụ onwe m bụ́ Pọl ji aka m dee,+ nke bụ́ ihe ịrịba ama n’akwụkwọ ozi ọ bụla; otú a ka m si ede ihe. 18  Ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ+ dịnyere unu niile.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji