Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 NdịTesalonaịka 2:1-17

2  Otú ọ dị, ụmụnna anyị, banyere ọnụnọ+ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa nzukọ a ga-eme ka anyị zukọọ n’ebe ọ nọ,+ anyị na-arịọ unu  ka unu ghara ikwe ka e mee ka unu maa jijiji ọsọ ọsọ wee bụrụ ndị na-enweghị uche ma ọ bụ bụrụ ndị a kpaliri site n’okwu nke si n’aka mmụọ+ ma ọ bụ site n’ozi ọnụ+ ma ọ bụ site n’akwụkwọ ozi+ nke yiri ka ò si n’aka anyị, ime ka unu chee na ụbọchị+ Jehova abịawo.  Unu ekwela ka onye ọ bụla rafuo unu n’ụzọ ọ bụla, n’ihi na ọ gaghị abịa ma ọ bụrụ na e bughị ụzọ nwee ndapụ n’ezi ofufe,+ e kpugheekwa+ onye ahụ na-emebi iwu,+ nke bụ́ nwa mbibi.+  Ọ bụ onye mmegide,+ ọ na-ebulikwa onwe ya ka ọ dị elu karịa onye ọ bụla a na-akpọ “chi” ma ọ bụ ihe a na-efe ofufe. O wee nọdụ ala n’ụlọ nsọ nke Chineke, na-egosi n’ihu ọha na ya bụ chi.+  Ọ̀ bụ na unu echetaghị na m na-agwa+ unu ihe ndị a mgbe mụ na unu ka nọ?  Ugbu a kwa, unu maara ihe ahụ+ nke bụ́ ihe mgbochi,+ ka e wee kpughee ya n’oge ya a kara aka.+  N’eziokwu, ihe omimi nke mmebi iwu a amalitelarị ịrụ ọrụ;+ ma ọ ga-abụ ihe omimi naanị ruo mgbe onye ahụ nke na-arụ ọrụ ugbu a dị ka ihe mgbochi na-agakwaghị anọ.+  Mgbe ahụ, a ga-ekpughe onye ahụ na-emebi iwu, onye Onyenwe anyị Jizọs ga-eji mmụọ nke ọnụ+ ya gbuo, bibiekwa ya site n’ime ka ọnụnọ ya+ pụta ìhè.+  Ma ọnụnọ nke onye ahụ na-emebi iwu bụ dị ka ọrụ+ Setan si dị, nke ọ na-arụ site n’ịrụ ọrụ niile dị ike na ime ihe ịrịba ama ụgha na ịrụ ọrụ ebube ụgha,+ 10  sitekwa n’iji ụdị ajọ omume niile+ na-eduhie ndị na-ala n’iyi,+ ka ọ bụrụ ihe e ji kwụọ ha ụgwọ n’ihi na ha anabataghị ịhụnanya+ maka eziokwu ahụ ka e wee zọpụta ha.+ 11  Ọ bụ ya mere Chineke ji kwe ka ọrụ njehie rute n’ebe ha nọ, ka ha wee kwere ihe bụ́ ụgha,+ 12  ka e wee kpee ha niile ikpe n’ihi na ha ekwereghị eziokwu ahụ,+ kama ọ bụ ajọ omume na-atọ ha ụtọ.+ 13  Otú ọ dị, anyị aghaghị ịdị na-ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu, ụmụnna anyị ndị Jehova hụrụ n’anya, n’ihi na Chineke họọrọ unu+ site ná mmalite ka e wee zọpụta unu, site n’iji mmụọ nsọ+ doo unu nsọ,+ sitekwa n’okwukwe unu nwere n’eziokwu ahụ.+ 14  Ihe mere o ji kpọọ unu site n’ozi ọma nke anyị na-ezisa+ bụ ka unu nweta ebube nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 15  Ya mere, ụmụnna anyị, guzosienụ ike,+ jidesiekwanụ aka ike n’omenala+ ndị a kụziiri unu, ma ọ̀ bụ site n’ozi ọnụ ma ọ̀ bụ site n’akwụkwọ ozi anyị. 16  Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Chineke bụ́ Nna anyị, onye hụrụ anyị n’anya+ ma nye nkasi obi ebighị ebi na ezi olileanya+ site n’obiọma na-erughịrị mmadụ, 17  kasiekwa unu obi ma mee ka unu guzosie ike n’omume ọma niile nakwa n’okwu ọma niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji