2 Ndị Kọrịnt 2:1-17
2 N’ihi na ihe m kpebiri ime bụ na agaghị m abịakwute unu ọzọ ná mwute.+
2 N’ihi na ọ bụrụ na mụ emee ka unu nwee mwute,+ ònye n’ezie ga-eme m obi ụtọ ma ọ́ bụghị onye ahụ nke m meworo ka o nwee mwute?
3 Ọ bụkwa ya mere m ji dee ihe a, ka m wee ghara inwe mwute+ mgbe m bịara n’ihi ndị ahụ m kwesịrị ịṅụrị ọṅụ+ n’ihi ha; n’ihi na enwere m obi ike+ n’ebe unu niile nọ na ihe na-enye m ọṅụ bụ ihe na-enye unu niile ọṅụ.
4 N’ihi na site n’oké mkpagbu na ihe na-ewute m n’obi ka m ji ọtụtụ anya mmiri+ detara unu akwụkwọ, ọ bụghị ka o wee wute+ unu, kama ka unu wee mara ịhụnanya nke m nwere karịsịa n’ebe unu nọ.
5 Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla emewo ihe na-akpata mwute,+ o mewo ihe wutere unu niile ruo n’ókè ụfọdụ, ọ bụghị ihe wutere m—ka m ghara ikwu okwu ga-ewutebiga unu okè.
6 Mba a+ ọtụtụ ndị baara onye dị otú ahụ ezuwo,
7 kama ịbara ya mba, jirinụ obiọma gbaghara+ ya ma kasie ya obi, ka onye dị otú ahụ wee ghara ịda mbà n’ụzọ ọ bụla n’ihi inwebiga mwute ókè.+
8 Ya mere, ana m agba unu ume ka unu gosi ya na unu hụrụ ya n’anya.+
9 Ọ bụ ya mere m ji na-edetara unu akwụkwọ ozi a iji chọpụta ihe àmà unu nwere, ma ùnu na-erube isi n’ihe niile.+
10 Ihe ọ bụla unu ji obiọma gbaghara onye ọ bụla, mụ onwe m agbagharawo ya.+ N’eziokwu, ihe ọ bụla mụ onwe m ji obiọma gbaghara, ma ọ bụrụ na mụ ejiriwo obiọma gbaghara ihe ọ bụla, ọ bụ n’ihi unu n’ihu Kraịst;
11 ka Setan wee ghara ịghọgbu anyị,+ n’ihi na anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ ya.+
12 Mgbe m bịarutere na Troas+ izisa ozi ọma banyere Kraịst, e meghekwaara m ọnụ ụzọ n’ime Onyenwe anyị,+
13 ezughị m ike ọ bụla n’ime mmụọ m n’ihi na ahụghị m Taịtọs+ nwanna m, ma m sịrị ha ka e mesịa, wee gawa Masedonia.+
14 Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edu+ anyị mgbe niile ná ngagharị mmeri ná mmekọrịta+ anyị na Kraịst ma na-eme ka e nwee ike ịnụ ísìsì ihe ọmụma banyere ya n’ebe niile+ site n’aka anyị!
15 N’ihi na n’ebe Chineke nọ, anyị bụ ísìsì ụtọ+ nke Kraịst n’etiti ndị a na-azọpụta nakwa n’etiti ndị na-ala n’iyi;+
16 n’ebe ndị na-ala n’iyi nọ, ọ bụ ísìsì ọnwụ nke na-eduga n’ọnwụ,+ n’ebe ndị a na-azọpụta nọ, ọ bụ ísìsì ndụ nke na-eduga ná ndụ. Ọ̀ bụ onye ruru eru nke ọma maka ihe ndị a?+
17 Ọ bụ anyị; n’ihi na anyị abụghị ndị na-ere okwu Chineke ere+ dị ka ọtụtụ ndị bụ,+ kama anyị na-ekwu okwu+ dị ka ndị nwere obi eziokwu, ee, dị ka ndị e si n’ebe Chineke nọ zipụ, n’ihu Chineke, ná mmekọrịta anyị na Kraịst.