Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Kọrịnt 11:1-33

11  Ọ ga-adị m nnọọ mma ma ọ bụrụ na unu ga-edi ezi uche m na-enwechaghị.+ Ma, n’eziokwu, unu na-edi ya!  N’ihi na ana m ekworo unu ekworo yiri ekworo Chineke,+ n’ihi na mụ onwe m kwere unu nkwa na otu di+ ga-alụ unu+ ka m wee chee unu n’ihu Kraịst+ dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-emerụghị emerụ.+  Ma egwu na-atụ m na e nwere ike merụọ+ obi unu, o wee ghara izi ezi, gharakwa ịdị ọcha dị ka o kwesịrị Kraịst,+ dị ka agwọ ahụ ji aghụghọ ya rafuo Iv.+  N’ihi na, dị ka o si dị, ọ bụrụ na mmadụ abịa na-ekwusa Jizọs nke dị iche na nke ahụ anyị kwusara,+ ma ọ bụ, ọ bụrụ na unu anata mmụọ dị iche na nke unu nataworo,+ ma ọ bụ, ozi ọma+ dị iche na nke unu nabatara, unu na-anabata onye ahụ ngwa ngwa.+  N’ihi na echere m na ọ dịghị otu mkpụrụ ihe m ji dị ala+ n’ebe ndịozi ọkasị mma+ unu nọ.  Ma ọ bụrụgodị na abụghị m ọkà n’ikwu okwu,+ n’ezie, adịghị m otú ahụ n’ihe ọmụma;+ kama n’ụzọ niile, anyị mere ka ọ pụtara unu ìhè n’ihe niile.+  Ka m̀ mere mmehie site n’iweda onwe m ala+ ka e wee bulie unu elu, n’ihi na eji m ọṅụ zisaara unu ozi ọma Chineke n’anaghị unu ihe ọ bụla?+  Apụnaara m ọgbakọ ndị ọzọ ihe site n’ịnara ha ihe ka m wee jeere unu ozi;+  ma, mgbe mụ na unu nọ, m wee nwee mkpa, abụrụghị m onye ọ bụla ibu arọ,+ n’ihi na ụmụnna ndị si Masedonia+ bịa wetara ihe dị ukwuu n’ihi ihe kọrọ m. Ee, n’ụzọ niile, emere m onwe m ka m ghara ịbụrụ unu ibu arọ, m ga-adịkwa otú a.+ 10  Ebe eziokwu+ nke Kraịst dị n’ime m, a gaghị akwụsị isi a m na-anya+ n’ógbè ndị dị n’Akeya. 11  N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ n’ihi na ahụghị m unu n’anya? Chineke maara na m hụrụ unu n’anya.+ 12  M ga na-eme ihe m na-eme,+ ka m wee mee ka ha ghara inwe ihe ha ga-ekonye aka, bụ́ ndị na-achọ ihe ha ga-ekonye aka wee sị na anyị na ha hà n’ọkwá ahụ nke ha ji na-anya isi. 13  N’ihi na ndị dị otú ahụ bụ ndịozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ,+ ha na-eme onwe ha ka ha yie ndịozi Kraịst.+ 14  Ọ bụghịkwa ihe ijuanya, n’ihi na Setan n’onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.+ 15  Ya mere, ọ bụghị oké ihe ma ọ bụrụ na ndị ozi+ ya na-eme onwe ha ka ha yie ndị ozi nke ezi omume. Ma ọgwụgwụ ha ga-abụ dị ka ọrụ ha si dị.+ 16  Ana m ekwu ọzọ, sị, Ka onye ọ bụla ghara iche na mụ enweghị ezi uche. Ma, ọ bụrụ na unu chere otú ahụ n’ezie, nabatanụ m, ọ bụrụgodị dị ka onye na-enweghị ezi uche, ka mụ onwe m kwa wee nyatụ isi.+ 17  M na-ekwu ihe m na-ekwu, ọ bụghị n’iso ihe nlereanya nke Onyenwe anyị, kama dị ka à ga-asị na mụ ejighị ezi uche na-ekwu ya, n’obi ike a nke gabigara ókè a na-eji anya isi.+ 18  Ebe ọ bụ na ọtụtụ na-anya isi dị ka anụ ahụ́ si dị,+ mụ onwe m ga-anyakwa isi. 19  N’ihi na unu ji ọṅụ na-anabata ndị na-enweghị ezi uche, ebe unu bụ ndị nwere ezi uche. 20  N’eziokwu, unu na-anabata onye ọ bụla nke ji unu mere ohu,+ onye ọ bụla nke na-eripịa ihe unu nwere, onye ọ bụla nke na-apụnara unu ihe unu nwere, onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu n’ebe unu nọ, onye ọ bụla nke na-ama unu ụra.+ 21  Ọ bụụrụ anyị ihe ihere ikwu nke a, dị ka à ga-asị na anyị enweghị ikike. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ọzọ nwere anya ike n’ihe ọ bụla—ana m ekwu okwu n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya+—mụ onwe m nwekwara anya ike n’ihe ahụ. 22  Hà bụ ndị Hibru? Mụ onwe bụkwa. Hà bụ ndị Izrel? Mụ onwe m bụkwa.+ Hà bụ mkpụrụ Ebreham? Abụkwa m.+ 23  Hà bụ ndị ozi Kraịst? Ana m aza dị ka onye ara, mụ onwe m bụkwa n’ụzọ pụtara ìhè karị:+ ana m adọgbu onwe m n’ọrụ nke ukwuu karị,+ anọrọ m n’ụlọ mkpọrọ ọtụtụ ugboro karị,+ e tiri m ihe gabiga ókè, anọrọ m n’ọnụ ọnwụ ugboro ugboro.+ 24  Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri anọ+ e wepụrụ otu, 25  ugboro atọ ka a pịara m ụtarị,+ otu ugboro ka a tụrụ m nkume,+ ugboro atọ ka ụgbọ m nọ na ya kpuru,+ otu ụbọchị, ka m nọrọ n’ogbu mmiri, ehihie na abalị; 26  anọ m na njem ugboro ugboro, anọ m n’ihe ize ndụ n’osimiri, n’ihe ize ndụ n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe n’okporo ụzọ,+ n’ihe ize ndụ n’aka ndị agbụrụ m,+ n’ihe ize ndụ n’aka ndị mba ọzọ,+ n’ihe ize ndụ n’obodo ukwu,+ n’ihe ize ndụ n’ala ịkpa, n’ihe ize ndụ n’oké osimiri, n’ihe ize ndụ n’etiti ụmụnna ụgha, 27  n’ịdọgbu onwe m n’ọrụ nakwa ná ndọlị, n’ịmụ anya abalị ugboro ugboro,+ n’agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ,+ n’erighị nri ọtụtụ ugboro,+ n’oyi na ịgba ọtọ. 28  E wezụga ihe ndị ahụ, ọ dị ihe na-anyịgbu m n’obi kwa ụbọchị, nchegbu maka ọgbakọ niile.+ 29  Ònye bụ onye na-adịghị ike,+ m wee ghara ịbụ onye na-adịghị ike? Ònye sụrụ ngọngọ, iwe wee ghara iwe m? 30  Ọ bụrụ na ịnya isi ga-adịrịrị, aga m eji ihe ndị metụtara adịghị ike m nyaa isi.+ 31  Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs, ya bụ, Onye ahụ a ga-enye otuto ruo mgbe ebighị ebi, maara na ọ bụghị ụgha ka m na-agha. 32  Na Damaskọs, onye ọchịchị nke nọ n’okpuru Aritas bụ́ eze nọ na-eche obodo Damaskọs nche ka o jide m,+ 33  ma e ji nkata si na windo dị ná mgbidi butuo m,+ m wee gbanahụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji