Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Eze 4:1-44

4  E nwere otu nwaanyị n’ime ndị nwunye ụmụ+ ndị amụma nke tikuru Ịlaịsha, sị: “Di m bụ́ ohu gị anwụwo; gị onwe gị makwaara nke ọma na ohu gị nọ na-atụ egwu+ Jehova, onye anyị ji ụgwọ+ abịawokwa ịkpọrọ ụmụ m abụọ ka ha bụrụ ndị ohu ya.”  Ịlaịsha wee sị ya: “Gịnị ka m ga-emere gị?+ Gwa m; gịnị ka i nwere n’ụlọ?” O wee zaa, sị: “Ohu gị nwaanyị enweghị ihe ọ bụla n’ụlọ ma e wezụga otu ite mmanụ.”+  O wee sị: “Gaa rịọta ite n’èzí, n’aka ndị agbata obi gị niile, ite ndị ihe na-adịghị. Ewetala ole na ole.  Gị na ụmụ gị banye n’ụlọ mechie ụzọ, gbanyekwa mmanụ n’ite ndị a niile, dọwakwa ndị juru n’ọnụ iche.  Nwaanyị ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ. Mgbe ya na ụmụ ya banyere n’ụlọ mechie ụzọ, ha nọ na-ewetara ya ite ndị ahụ, ya onwe ya wee na-agbanye agbanye.+  O wee ruo na ozugbo ite ndị ahụ juru n’ọnụ, ọ gwara nwa ya, sị: “Wetara m ite ọzọ.”+ Ma ọ sịrị ya: “E nweghị ite ọzọ dịnụ.” Mmanụ ahụ wee kwụsị.+  O wee bata kọọrọ onye nke ezi Chineke, o wee sị: “Gaa ree mmanụ ahụ, kwụọ ụgwọ i ji,+ gị na ụmụ gị ga-ewerekwa ihe fọdụrụ na-eri nri.”+  O wee ruo otu ụbọchị na Ịlaịsha gawara ruo Shunem,+ bụ́ ebe e nwere otu nwaanyị a ma ama, o wee malite ịrịọ+ ya ka o rie nri. O wee bụrụ na mgbe ọ bụla ọ na-agafe, ọ na-abanye n’ebe ahụ iri nri.  E mesịa, nwaanyị ahụ sịrị di ya:+ “Lee, amaara m nke ọma na ọ bụ onye dị nsọ nke Chineke+ na-agafe anyị mgbe niile. 10  Biko, ka anyị rụọ otu obere ọnụ ụlọ n’elu ụlọ a+ n’ahụ́ ájá ma debere ya ihe ndina na tebụl na oche na ihe ndọba oriọna n’ebe ahụ;+ ọ ga-erukwa na mgbe ọ bụla ọ bịakwutere anyị, ọ pụrụ ịbanye n’ebe ahụ.”+ 11  O wee ruo otu ụbọchị, dị ka ọ na-eme, na ọ batara n’ebe ahụ wee banye n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu ụlọ ma dinara ala n’ebe ahụ. 12  O wee sị Gehezaị+ bụ́ onye na-ejere ya ozi: “Kpọọ nwaanyị Shunem+ ahụ.” O wee kpọọ ya ka o guzoro n’ihu ya. 13  O wee sị ya: “Biko, sị ya, ‘Lee, i sogbuwo onwe gị nke ukwuu n’ihi anyị.+ Gịnị ka a ga-emere gị?+ Ò nwere ihe a ga-agwara gị eze+ ma ọ bụ onyeisi+ ndị agha?” O wee zaa, sị: “Ọ bụ n’etiti ndị m ka m bi.”+ 14  O wee gaa n’ihu ịsị: “Gịnịzi ka a ga-emere ya?” Gehezaị wee sị: “N’eziokwu, o nweghị nwa,+ di ya emewokwa agadi.” 15  Ozugbo ahụ, ọ sịrị: “Kpọọ ya.” O wee kpọọ ya, o wee guzoro n’ọnụ ụzọ. 16  O wee sị: “N’ụdị oge a n’afọ ọzọ ị ga na-amakụ nwa.”+ Ma ọ sịrị: “Ee e, nna m ukwu, onye nke ezi Chineke! Aghala ụgha n’ihe banyere nwaanyị na-ejere gị ozi.” 17  Otú ọ dị, nwaanyị ahụ tụụrụ ime wee mụọ nwa nwoke+ n’ụdị oge ahụ n’afọ sochiri ya, dị nnọọ ka Ịlaịsha gwara ya.+ 18  Nwata ahụ wee na-etolite, o wee ruo otu ụbọchị, dị ka o si eme, na ọ gakwuuru nna ya na ndị na-ewe ihe ubi.+ 19  O wee na-asị nna ya: “Isi m o, isi m o!”+ N’ikpeazụ, ọ sịrị onye na-ejere ya ozi: “Kuru ya gakwuru nne ya.”+ 20  O wee kutere ya nne ya. O wee nọdụ ọdụ n’ikpere ya ruo ehihie, o wee nwụọ.+ 21  O wee gbagoo nyiwe ya n’ihe ndina+ nke onye nke ezi Chineke,+ mechibidokwa ya ụzọ wee pụọ. 22  O wee kpọọ di ya, sị: “Biko, zitere m otu n’ime ndị na-eje ozi na otu n’ime nne ịnyịnya ibu ka m gbara gakwuru onye nke ezi Chineke ma lọghachi.”+ 23  Ma ọ sịrị: “Gịnị mere i ji agakwuru ya taa? Taa abụghị ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ ọ bụghịkwa ụbọchị izu ike.” Otú ọ dị, nwaanyị ahụ sịrị: “Nsogbu adịghị.” 24  O wee dokwasị ihe o ji anọkwasị n’elu nne ịnyịnya ibu+ wee sị onye na-ejere ya ozi: “Gbara gawa. Akwụsịla n’ihi m, ọ gwụla ma m̀ gwara gị otú ahụ.” 25  O wee gawa, bịakwute onye nke ezi Chineke n’Ugwu Kamel. O wee ruo na ngwa ngwa onye nke ezi Chineke hụrụ ya ka ọ na-abịa, ozugbo ahụ, ọ gwara Gehezaị bụ́ onye na-ejere ya ozi, sị:+ “Lee nwaanyị Shunem n’ebe ahụ! 26  Biko, gbara gakwuru ya, sị ya, “Ahụ́ ọ̀ dịkwa gị mma? Ahụ́ ọ̀ dịkwa di gị mma? Ahụ́ ọ̀ dịkwa nwa gị mma?’” Nwaanyị ahụ wee zaa, sị: “Nsogbu adịghị.” 27  Mgbe ọ bịakwutere onye nke ezi Chineke n’ugwu ahụ, o jidere ya n’ụkwụ ozugbo.+ Gehezaị wee bịa ka ọ kwapụ ya,+ ma onye nke ezi Chineke+ sịrị: “Hapụ ya,+ n’ihi na ihe na-ewute ya ná mkpụrụ obi;+ Jehova ezochiwokwara+ m ya wee ghara ịgwa m.” 28  Nwaanyị ahụ wee sị: “Ọ̀ dị mgbe m si n’aka onyenwe m rịọ ka e nye m nwa? Ọ̀ bụ na mụ asịghị, ‘Emela ka m nwee olileanya ụgha’?”+ 29  Ọ sịrị Gehezaị+ ozugbo: “Kee ájị̀ n’úkwù,+ werekwa mkpara+ m gawa. Ọ bụrụ na i zute onye ọ bụla, ekelela ya;+ ọ bụrụkwa na onye ọ bụla ekelee gị, ekwela ya ekele. Tụkwasị mkpara m n’ihu nwa okoro ahụ.”+ 30  Nne nwa okoro ahụ wee sị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ dịkwa nnọọ ka mkpụrụ obi gị dị ndụ,+ agaghị m ahapụ gị.”+ Ya mere, o biliri soro ya gawa. 31  Gehezaị bu ha ụzọ gawa wee tụkwasị mkpara ahụ n’ihu nwa okoro ahụ, ma o kwughị okwu, o meghịkwa ụṅara.+ O wee laghachi zute ya ma kọọrọ ya, sị: “Nwa okoro ahụ etetaghị.”+ 32  N’ikpeazụ, Ịlaịsha batara n’ụlọ ahụ, lee, nwa okoro ahụ anwụwo, e nyiwekwara ya n’ihe ndina ya.+ 33  O wee bata mechibido onwe ya na nwata ahụ ụzọ+ ma malite ikpeku Jehova ekpere.+ 34  N’ikpeazụ, ọ gara dinara n’elu nwata ahụ+ ma tụkwasị ọnụ ya n’ọnụ nwata ahụ nakwa anya ya n’anya ya, tụkwasịkwa ọbụ aka ya n’ọbụ aka nwata ahụ ma makpuru n’elu ya, ahụ́ nwata ahụ wee kporo ọkụ. 35  O wee malite ịgagharị ọzọ n’ụlọ ahụ, ya gaa ebe a, ya agaa ebe a, e mesịa, ọ gara makpuru n’elu ya. Nwa okoro ahụ wee zee uzere ihe ruru ugboro asaa, mgbe nwa okoro ahụ zesịrị uzere, o meghere anya ya.+ 36  O wee kpọọ Gehezaị, sị: “Kpọọ nwaanyị Shunem+ ahụ.” O wee kpọọ ya, nwaanyị ahụ wee bịakwute ya. O wee sị: “Kuru nwa gị.”+ 37  O wee bata daa n’ụkwụ ya wee kpọọrọ ya isiala.+ E mesịa, o kuuru nwa ya wee pụọ.+ 38  Ịlaịsha wee laghachi Gilgal,+ ma ụnwụ+ dị n’ala ahụ. Ka ụmụ+ ndị amụma nọ ọdụ n’ihu ya,+ o mesịrị gwa onye na-ejere ya ozi, sị:+ “Sinye nnukwu ite e ji esi nri n’ọkụ ma siere ụmụ ndị amụma ofe.”+ 39  Ya mere, otu onye gara n’ọhịa ịghọrọ mkpụrụ malo,+ o wee hụ osisi vaịn ọhịa wee gaa ghọrọ aṅara ọhịa ọ mịrị, ghọjuo uwe ya, o wee bịa binye ya n’ite ofe ahụ, n’ihi na ha amaghị ihe ọ bụ. 40  E mesịa, ha wụpụtara ya ka ndị ikom ahụ rie. O wee ruo na ozugbo ha ritụrụ ofe ahụ, ha tiri mkpu wee malite ịsị: “Onye nke ezi Chineke,+ ọnwụ dị n’ite a.”+ O kweghị ha oriri. 41  O wee sị ha: “Kpotenụ ntụ ọka.”* Mgbe ọ wụnyesịrị ya n’ite ahụ, ọ gara n’ihu ịsị: “Wụpụtaranụ ya ndị a ka ha rie.” Ọ dịghịkwa ihe na-emerụ ahụ́ dị n’ite ahụ.+ 42  Ọ dịkwa otu nwoke si Bel-shalisha+ bịa, o wee jiri akpa nri ya butere+ onye nke ezi Chineke achịcha nke mkpụrụ mbụ kara aka,+ ogbe achịcha iri abụọ e ji ọka bali mee,+ nakwa ọka ọhụrụ. O wee sị: “Nye ya ndị a ka ha rie.”+ 43  Otú ọ dị, onye na-ejere ya ozi sịrị: “Olee otú m ga-esi bute ihe a n’ihu otu narị ndị ikom?”+ O wee zaa, sị: “Nye ya ndị a ka ha rie, n’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘A ga-eri ihe oriri, a ga-enwekwa ihe a ga-erifọ.’”+ 44  O wee bute ya n’ihu ha, ha wee malite iri, ha rifọkwara ya dị ka Jehova kwuru.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

2Ez 4:41*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.