Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Samuel 11:1-15

11  Nehash onye Amọn+ wee gbagoo, maa ụlọikwuu iji buso Jebesh+ nke dị na Gilied agha. Ndị Jebesh niile wee sị Nehash: “Ka anyị na gị gbaa ndụ ka anyị jewere gị ozi.”+  Nehash onye Amọn wee sị ha: “Mụ na unu ga-agba ndụ naanị ma ọ bụrụ na m ghụpụ+ anya aka nri unu, m ga-emekwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-akọcha Izrel dum.”+  Ndị okenye Jebesh wee sị ya: “Nye anyị ụbọchị asaa, anyị ga-eziga ndị ozi n’ókèala dum nke Izrel, ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-azọpụta+ anyị, anyị ga-apụkwute gị.”  Ka oge na-aga, ndị ozi ahụ bịara Gibia+ nke Sọl wee kwuo okwu ahụ ná ntị ndị Izrel, mmadụ niile wee malite ịkwa ákwá n’olu dara ụda.+  Ma, lee, Sọl so ìgwè ehi ya n’azụ si n’ubi na-alọta, Sọl wee sị: “Gịnị na-eme ndị a, nke mere ha ji na-akwa ákwá?” Ha wee malite ịkọrọ ya ihe niile ndị Jebesh kwuru.  Mmụọ+ Chineke wee kpawa ike n’ahụ́ Sọl mgbe ọ nụrụ okwu ndị a, iwe ya wee dị ọkụ nke ukwuu.+  O wee kpụrụ oké ehi abụọ bọkasịa ha wee ziga ha n’ókèala dum nke Izrel+ site n’aka ndị ozi, sị: “Onye ọ bụla n’ime anyị nke na-apụtaghị wee soro Sọl na Samuel, otú a ka a ga-eme ehi ya!”+ Egwu+ Jehova+ wee malite ijide ndị mmadụ nke mere na ha pụtara dị ka otu onye.+  O wee gụọ ha ọnụ+ na Bizek, ụmụ Izrel wee dị narị puku mmadụ atọ, ndị Juda dịkwa puku iri atọ.  Ha wee gwa ndị ozi ahụ bịaranụ, sị: “Nke a bụ ihe unu ga-agwa ndị Jebesh nke dị na Gilied, ‘Unu ga-enweta nzọpụta echi mgbe anyanwụ chasiwere ike.’”+ Ndị ozi ahụ wee bịa gwa ndị Jebesh, ha wee malite ịṅụrị ọṅụ. 10  Ndị Jebesh wee sị: “Anyị ga-apụkwute unu echi, unu ga-emekwa anyị ihe ọ bụla dị unu mma.”+ 11  O wee ruo n’echi ya na Sọl+ haziri ndị Izrel n’ìgwè atọ;+ ha wee banye n’etiti ebe ha mara ụlọikwuu n’oge nche ụtụtụ+ wee na-egbu ndị Amọn+ ruo mgbe ụbọchị kpowere ọkụ. Mgbe e nwere ndị ka fọrọnụ, a chụsasịrị ha, a hapụghịkwa mmadụ abụọ nọkọtara ọnụ n’etiti ha.+ 12  Ndị Izrel wee malite ịsị Samuel: “Olee onye na-asị, ‘Ọ̀ bụ Sọl ga-abụ eze anyị?’+ Kpọpụtanụ ha, ka anyị gbuo ha.”+ 13  Otú ọ dị, Sọl sịrị: “Ọ dịghị onye a ga-egbu taa,+ n’ihi na Jehova emewo ka e nwee nzọpụta n’Izrel taa.”+ 14  Mgbe e mesịrị, Samuel sịrị ndị Izrel: “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal+ ka anyị wee mee ya eze ọzọ n’ebe ahụ.”+ 15  Ndị Izrel niile wee gaa Gilgal, ha wee mee Sọl eze n’ebe ahụ n’ihu Jehova n’ime Gilgal. Ha wee chụọ àjà udo n’ebe ahụ n’ihu Jehova,+ n’ebe ahụkwa ka Sọl na ndị Izrel niile nọ na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji