Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Pita 5:1-14

5  Ya mere, ana m enye ndị bụ́ okenye n’etiti unu ndụmọdụ a, n’ihi na mụ onwe m sokwa ha bụrụ okenye+ na onye àmà+ nke ahụhụ Kraịst, onye na-eketa òkè n’ebube nke a ga-ekpughe:+  Na-azụnụ+ ìgwè atụrụ Chineke+ nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha;+ ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ uru aghụghọ n’anya,+ kama n’ịnụ ọkụ n’obi;  ọ bụghịkwa ime ndị bụ́ ihe nketa nke Chineke+ dị ka ọ̀ bụ unu nwe ha,+ kama ghọọrọnụ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.+  Mgbe e mere ka onyeisi ọzụzụ atụrụ+ ahụ pụta ìhè, unu ga-anata okpueze+ ebube ahụ na-adịghị emebi emebi.+  Otú ahụkwa, unu ụmụ okorobịa, na-edonụ onwe unu n’okpuru+ ndị okenye. Ma unu niile, werenụ ịdị nwayọọ n’obi kee onwe unu n’otú unu si emeso ibe unu,+ n’ihi na Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.+  Ya mere, wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ruru;+  na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile,+ n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.+  Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche.+ Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.+  Ma guzogidenụ ya,+ sienụ ike n’okwukwe, ebe unu maara na òtù ụmụnna unu niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a unu na-ata.+ 10  Ma, mgbe unu tasịrị ahụhụ nwa oge,+ Chineke nke obiọma niile na-erughịrị mmadụ, onye kpọrọ unu ka unu nweta ebube ebighị ebi ya+ site n’ịdị n’otu+ nke unu na Kraịst, ga-enyesị unu ọzụzụ unu n’onwe ya, ọ ga-eme ka unu guzosie ike,+ ọ ga-eme ka unu sie ike.+ 11  Ka ike+ dịrị ya ruo mgbe ebighị ebi. Amen. 12  Ọ bụ site n’aka Silvenọs,+ bụ́ nwanna kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka m weere ya, ka m detaara unu akwụkwọ ozi a dị nkenke,+ iji gbaa unu ume, gbasiekwa àmà ike na nke a bụ ezi obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ; guzosienụ ike na ya.+ 13  Nwaanyị ahụ nke nọ na Babịlọn,+ onye a họọrọ dị ka unu, na-ekele unu. Mak+ nwa m na-ekelekwa unu. 14  Jirinụ nsusu ọnụ nke ịhụnanya kelee ibe unu.+ Ka udo dịrị unu niile ndị ha na Kraịst dị n’otu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji