Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ihe E Mere 16:1-43

16  Ha wee bubata igbe ezi Chineke+ ma dọba ya n’ime ụlọikwuu ahụ Devid mara maka ya;+ ha wee malite ịchụ àjà nsure ọkụ na àjà udo n’ihu ezi Chineke.+  Mgbe Devid chụsịrị àjà nsure ọkụ+ ahụ na àjà udo+ ahụ, ọ gọziri+ ìgwè mmadụ ahụ n’aha Jehova.+  O nyekwara+ onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel, ma nwoke ma nwaanyị, otu ogbe achịcha na achịcha mkpụrụ osisi det nakwa achịcha mkpụrụ vaịn a mịrị amị.  O wee debe ụfọdụ n’ime ndị Livaị+ n’ihu igbe Jehova ka ha bụrụ ndị na-eje ozi,+ ka ha wee na-echetara ndị mmadụ ihe dị iche iche Jehova bụ́ Chineke Izrel mere,+ na-ekelekwa+ ya ma na-enye ya otuto,+  Esaf+ bụ onyeisi ha, Zekaraya bụ onye na-esote ya, tinyere Jeayel na Shemiramọt na Jehayel na Matitaya na Elayab na Benaya na Obed-idọm na Jeayel,+ maka ịkpọ une na ụbọ akwara,+ nakwa Esaf+ maka itisi ájà ike,+  nakwa Benaya na Jahazayel bụ́ ndị nchụàjà maka ịfụ opi+ mgbe niile n’ihu igbe ọgbụgba ndụ nke ezi Chineke.  Ụbọchị ahụ bụ nke mbụ Devid nyere onyinye+ iji kelee+ Jehova site n’ọnụ Esaf+ na ụmụnne ya, sị:   “Keleenụ Jehova,+ kpọkuonụ aha ya;+ Meenụ ka a mara ọrụ ya n’etiti ndị dị iche iche!+   Bụkuonụ ya abụ,+ bụkuonụ ya abụ olu ụtọ,+ Chebaranụ ọrụ ya niile dị ebube echiche.+ 10  Jirinụ aha+ nsọ ya+ na-anya isi, Ka obi ndị na-achọ Jehova ṅụrịa ọṅụ.+ 11  Chọọnụ Jehova na ike ya,+ Na-achọnụ ihu ya mgbe niile.+ 12  Chetanụ ọrụ dị ebube ndị ọ rụrụ,+ Bụ́ ọrụ ebube ya nakwa mkpebi ikpe ndị o ji ọnụ ya kwupụta,+ 13  Unu ụmụ Izrel bụ́ ohu ya,+ Unu ụmụ Jekọb, bụ́ ndị ọ họọrọ.+ 14  Ọ bụ ya bụ Jehova Chineke anyị;+ mkpebi ikpe ya dị n’ụwa dum.+ 15  Chetanụ ọgbụgba ndụ ya ọbụna ruo mgbe a na-akaghị aka,+ Chetakwanụ ihe o nyere n’iwu, ruo otu puku ọgbọ,+ 16  Bụ́ ọgbụgba ndụ ya na Ebreham,+ Nakwa iyi ọ ṅụụrụ Aịzik.+ 17  Bụ́ nke o mere ka ọ dịgide dị ka ụkpụrụ nye Jekọb,+ Ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ga-adịru mgbe a na-akaghị aka nye Izrel,+ 18  Sị, ‘Ọ bụ gị ka m ga-enye ala Kenan,+ Ka ọ bụrụ òkè e kenyere unu dị ka ihe nketa.’+ 19  Nke a bụ mgbe unu dị ole na ole,+ Ee, unu dị nnọọ ole na ole, bụrụkwa ndị mbịarambịa na ya.+ 20  Ha wee na-aga site ná mba ruo ná mba,+ Sitekwa n’otu alaeze gakwuru ndị obodo ọzọ.+ 21  O kweghị ka onye ọ bụla rigbuo ha,+ Kama ọ baara ndị eze mba n’ihi ha,+ 22  Sị, ‘Unu akpala ndị m tere mmanụ aka, Unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.’+ 23  Bụkuonụ Jehova abụ, unu ndị niile bi n’ụwa!+ Kwa ụbọchị, kpọsaanụ nzọpụta ọ na-enye!+ 24  Kọsaanụ ebube ya n’etiti mba niile, Kọsaakwanụ ọrụ ya ndị dị ebube n’etiti ndị niile dị iche iche. 25  N’ihi na Jehova dị ukwuu, kwesịkwa nnọọ ka e too ya,+ E kwesịrị ịtụ ya egwu karịa chi niile ọzọ.+ 26  N’ihi na chi niile nke ndị dị iche iche bụ chi na-abaghị uru.+ Ma, ọ bụ Jehova kere eluigwe.+ 27  Ebube na ịma mma dị n’ihu ya,+ Ike na ọṅụ dịkwa n’ebe ọ nọ.+ 28  Nyenụ Jehova otuto, unu ezinụlọ nke ndị dị iche iche, Nyenụ Jehova otuto, kwuokwanụ na ọ dị ike.+ 29  Nyenụ Jehova otuto kwesịrị aha ya,+ Burunụ onyinye bata n’ihu ya.+ Yirinụ uwe mara mma nke dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.+ 30  Nọrọnụ n’oké ihe mgbu n’ihi ya, unu ndị niile bi n’ụwa! E mekwara ka ala guzosie ike: Ọ dịghị mgbe a ga-eme ka ọ maa jijiji.+ 31  Ka eluigwe ṅụrịa ọṅụ, ka ụwa nweekwa aṅụrị,+ Ka ha kwuokwa n’etiti mba niile, sị, ‘Jehova aghọwo eze!’+ 32  Ka oké osimiri bigbọọ, ya na ihe jupụtara n’ime ya,+ Ka ọhịa ṅụrịa ọṅụ, ya na ihe niile dị n’ime ya.+ 33  Ka osisi ndị dị n’oké ọhịa tiekwa mkpu ọṅụ n’ihi Jehova,+ N’ihi na ọ bịawo ikpe ụwa ikpe.+ 34  Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma,+ N’ihi na obiọma* ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+ 35  Kwuokwanụ, sị, ‘Zọpụta anyị, Chineke nke nzọpụta anyị,+ Chịkọta anyị ma napụta anyị n’aka mba niile,+ Ka anyị nye aha nsọ+ gị ekele, jirikwa ọṅụ too gị.+ 36  Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi malite na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.’”+ Mmadụ niile wee sị, “Amen!” tookwa Jehova.+ 37  O wee hapụ Esaf+ na ụmụnne ya n’ihu igbe ọgbụgba ndụ Jehova ka ha na-eje ozi+ mgbe niile n’ihu Igbe ahụ, dị ka ihe a chọrọ kwa ụbọchị si dị;+ 38  ọ hapụkwara Obed-idọm na ụmụnne ya, mmadụ iri isii na asatọ, hapụkwa Obed-idọm nwa Jedutọn na Hosa dị ka ndị nche ọnụ ụzọ ámá; 39  hapụkwa Zedọk+ bụ́ onye nchụàjà na ụmụnne ya bụ́ ndị nchụàjà n’ihu ụlọikwuu Jehova n’ebe dị elu nke dị na Gibiọn,+ 40  ka ha na-achụrụ Jehova àjà nsure ọkụ mgbe niile n’ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ ma n’ụtụtụ ma ná mgbede, dị ka ihe dum e dere n’iwu Jehova si dị, nke o nyere Izrel n’iwu;+ 41  ha na Himan+ na Jedutọn, tinyere ndị ọzọ a họọrọ, bụ́ ndị a kpọrọ aha+ ka ha na-enye Jehova ekele,+ n’ihi na “obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi”;+ 42  ha na Himan+ na Jedutọn,+ ka ha na-afụ opi,+ na-etikwa ájà na ihe ndị e ji abụrụ ezi Chineke abụ; tinyere ụmụ+ Jedutọn bụ́ ndị nọ n’ọnụ ụzọ ámá. 43  Mmadụ niile wee laa, onye nke ọ bụla n’ụlọ ya.+ Devid wee laa ka ọ gọzie ụlọ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”