Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Kọrịnt 4:1-21

4  Ka mmadụ were anyị dị ka ndị nọ n’okpuru+ Kraịst na ndị na-elekọta+ ihe nzuzo dị nsọ+ nke Chineke.  N’ọnọdụ a, ihe a na-achọkwa n’aka ndị na-elekọta ụlọ+ bụ ka ha bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.+  O nweghị ihe ọ bụụrụ m na unu ma ọ bụ òtù ndị ikpe+ bụ́ mmadụ ga-enyocha m. Anaghịdị m enyocha onwe m.  N’ihi na ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla m maara+ m mere. Ma nke a adịghị egosi na m bụ onye ezi omume, kama, onye na-enyocha m bụ Jehova.+  N’ihi ya, unu ekpela ihe ọ bụla ikpe+ tupu oge a kara aka eruo, ruo mgbe Onyenwe anyị ga-abịa,+ bụ́ onye ga-eme ka ihe nzuzo dị iche iche nke ọchịchịrị pụta ìhè,+ meekwa ka ihe e bu n’obi pụta ìhè,+ mgbe ahụkwa ka onye ọ bụla ga-enweta otuto ya site n’aka Chineke.+  Ụmụnna m, ekwuru m ihe ndị a site n’iji mụ onwe m na Apọlọs+ mee ihe atụ maka ọdịmma unu, ka unu wee jiri anyị mụta ụkpụrụ a: “Unu agabigala ihe e dere ede,”+ ka e wee ghara ịfụli unu elu+ n’otu n’otu, unu ewee na-eche na otu onye ka onye ọzọ mma.+  N’ihi na ònye mere ka ị dị iche+ n’ebe onye ọzọ nọ? N’ezie, olee ihe i nwere nke a na-enyeghị gị enye?+ Ma, ọ bụrụ na e nyere gị ya enye n’ezie,+ gịnị mere i ji na-anya isi+ dị ka à ga-asị na e nyeghị gị ya enye?  Afọ ò juworị unu? Ùnu abaworị ọgaranya?+ Ùnu amalitewo ịchị achị dị ka ndị eze+ hapụ anyị? Ọ dị m ka ya bụrụ na unu amalitewo ịchị achị dị ka ndị eze, ka anyị wee soro unu na-achị achị dị ka ndị eze.+  N’ihi na o yiri m ka Chineke edebewo anyị bụ́ ndịozi ịbụ ndị ikpeazụ n’ihe ngosi+ dị ka ndị a mara ikpe ọnwụ,+ n’ihi na anyị aghọwo ihe nkiri n’ebe a na-eme ihe ngosi,+ n’anya ụwa, n’anya ndị mmụọ ozi,+ nakwa n’anya ụmụ mmadụ.+ 10  Anyị bụ ndị nzuzu+ n’ihi Kraịst, ma unu nwere uche+ n’ime Kraịst; anyị adịghị ike,+ ma unu dị ike;+ unu nwere ezi aha,+ ma a dịghị enye anyị nsọpụrụ.+ 11  Ruo oge awa a, anyị na-anọ agụụ,+ akpịrị na-akpọkwa anyị nkụ,+ anyị yikwa ákwà na-adịghị ekpuchicha anyị ahụ́,+ a na-akụkwa anyị ọkpọ,+ anyị bụkwa ndị na-enweghị ebe obibi,+ 12  anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ,+ anyị jikwa aka anyị na-arụ ọrụ.+ Mgbe a na-ekwujọ anyị, anyị na-agọzi agọzi;+ mgbe a na-akpagbu anyị, anyị na-atachi obi;+ 13  mgbe a na-ekwutọ anyị, anyị na-arịọsi arịrịọ ike;+ ruo ugbu a, anyị dị ka ihe ụwa kpofuru ekpofu, ihe e si n’ihe niile wụfuo.+ 14  Ana m ede ihe ndị a, ọ bụghị iji menye unu ihere, kama iji dụọ unu ọdụ dị ka ụmụ m m hụrụ n’anya.+ 15  N’ihi na ọ bụ ezie na unu pụrụ inwe puku ndị nduzi iri+ n’ime Kraịst, n’ezie, unu enweghị ọtụtụ nna;+ n’ihi na n’ime Kraịst Jizọs, aghọwo m nna unu site n’ozi ọma.+ 16  Ya mere, ana m arịọsi unu arịrịọ ike, bụrụnụ ndị na-eṅomi m.+ 17  Ọ bụ ya mere m ji na-ezitere unu Timoti,+ ebe ọ bụ nwa m m hụrụ n’anya nke kwesịrị ntụkwasị obi+ n’ime Onyenwe anyị; ọ ga-echetakwara unu otú m si eme ihe n’ime Kraịst Jizọs,+ dị nnọọ ka m na-akụzi n’ebe niile n’ọgbakọ niile. 18  Ụfọdụ na-afụli onwe ha elu+ dị ka à ga-asị n’ezie na agaghị m abịakwute unu. 19  Ma m ga-abịakwute unu n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ uche Jehova,+ m ga-amatakwa, ọ bụghị okwu ọnụ nke ndị ahụ na-afụli onwe ha elu, kama ike ha. 20  N’ihi na alaeze Chineke dabeere, ọ bụghị n’okwu ọnụ, kama n’ike.+ 21  Gịnị ka unu chọrọ? Ọ̀ bụ ka m jiri ụtarị bịakwute unu,+ ka ọ̀ bụ ka m jiri ịhụnanya na mmụọ dị nwayọọ?+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji