Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Eze 8:1-66

8  N’oge ahụ, Sọlọmọn+ kpọrọ+ ndị okenye+ Izrel, ndị isi niile nke ebo dị iche iche,+ ndị isi nke ndị bụ́ nna,+ nke ụmụ Izrel, ka ha zukọta n’ebe Eze Sọlọmọn nọ na Jeruselem, iji si n’Obodo Devid,+ ya bụ, Zayọn+ bugote igbe ọgbụgba ndụ+ Jehova.  Ndị Izrel niile wee gbakọọ n’ebe Eze Sọlọmọn nọ n’ọnwa Etanim n’oge ememme,+ ya bụ, n’ọnwa nke asaa.+  Ndị okenye niile nke Izrel wee bịa, ndị nchụàjà wee buru+ Igbe ahụ.+  Ha wee bugote igbe Jehova na ụlọikwuu+ nzute,+ ha bugotekwara arịa niile dị nsọ dị n’ụlọikwuu ahụ; ndị nchụàjà na ndị Livaị+ wee bugote ha.+  Eze Sọlọmọn na nzukọ Izrel dum ya na ha nọ, bụ́ ndị zara òkù ọ kpọrọ, nọ n’ihu Igbe ahụ, na-achụ+ atụrụ na ehi n’àjà. A pụghị ịgụta anụ ndị ahụ ọnụ ma ọ bụ ịmata ole ha dị n’ihi na ha dị ọtụtụ.+  Ndị nchụàjà wee bubata igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova n’ebe ọ ga na-adị,+ n’ọnụ ụlọ dị n’ime ime ụlọ ahụ, bụ́ Ebe Kasị Nsọ, n’okpuru nku cherọb ndị ahụ.+  N’ihi na nku cherọb ndị ahụ gbasara agbasa n’ebe a dọbara Igbe ahụ, nke mere na cherọb ndị ahụ si n’elu kpuchie Igbe ahụ na okporo osisi ya.+  Ma okporo osisi+ ndị ahụ dị ogologo, nke mere na a na-anọ n’Ebe Nsọ, n’ihu ọnụ ụlọ dị n’ime ime, ahụ ọnụ ọnụ okporo osisi ndị ahụ anya, ma a naghị anọ n’èzí ahụ ha anya. N’ebe ahụ ka ha dị ruo taa.+  Ọ dịghị ihe dị n’Igbe ahụ ma e wezụga mbadamba nkume abụọ+ nke Mozis debere+ na ya na Horeb, mgbe Jehova na ụmụ Izrel gbara ndụ,+ ka ha si n’ala Ijipt na-apụta.+ 10  O wee ruo na mgbe ndị nchụàjà si n’ebe nsọ ahụ pụta, ígwé ojii+ jupụtara n’ụlọ Jehova. 11  Ndị nchụàjà+ enweghịkwa ike iguzo jee ozi+ ha n’ihi ígwé ojii ahụ, n’ihi na ebube+ Jehova jupụtara n’ụlọ Jehova.+ 12  Mgbe ahụ Sọlọmọn sịrị: “Jehova kwuru na ya gaje ibi n’ígwé ojii.+ 13  Enwewo m ihe ịga nke ọma n’iwuru gị ụlọ nke bụ́ ebe obibi dị elu,+ ebe guzosiri ike,+ ka i biri na ya ruo mgbe a na-akaghị aka.”+ 14  Eze wee tụgharịa chee ha ihu malite ịgọzi+ ọgbakọ Izrel dum, ka ọgbakọ Izrel dum guzo ọtọ. 15  O wee gaa n’ihu ịsị: “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi,+ bụ́ onye ji aka ya mezuo+ ihe o ji ọnụ ya gwa Devid+ nna m, sị, 16  ‘Malite n’ụbọchị m si n’Ijipt kpọpụta ndị m bụ́ Izrel, ọ dịghị obodo m họọrọ+ n’ime ebo niile nke Izrel iwu ụlọ+ ka aha m+ wee dịgide na ya; ma m ga-ahọrọ Devid ka ọ bụrụ onyeisi nke ndị m bụ́ Izrel.’+ 17  O wee dịrị Devid nna m n’obi iwuru aha Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ.+ 18  Ma Jehova gwara Devid nna m, sị, ‘Ebe ọ bụ na ọ dị gị n’obi iwuru aha m ụlọ, i mere nke ọma, n’ihi na ọ dị gị n’obi.+ 19  Ọ bụ naanị na ọ bụghị gị ga-ewu ụlọ ahụ, kama ọ bụ nwa gị nke ga-esi n’úkwù gị pụta ga-ewuru aha m ụlọ.’+ 20  Jehova wee mezuo ihe o kwuru+ na m ga-anọchi Devid nna m, nọkwasịkwa n’ocheeze Izrel,+ dị nnọọ ka Jehova kwuru, nakwa na m ga-ewuru aha Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ,+ 21  nakwa na m ga-ewepụta n’ebe ahụ ebe m ga-adọba Igbe e tinyere ọgbụgba ndụ+ nke Jehova na nna nna anyị hà gbara mgbe ọ na-akpọpụta ha n’ala Ijipt.” 22  Sọlọmọn wee guzoro n’ihu ebe ịchụàjà+ Jehova n’ihu ọgbakọ Izrel dum, o wee gbasapụ ọbụ aka ya chee n’eluigwe;+ 23  o wee gaa n’ihu ịsị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel,+ ọ dịghị Chi dị ka gị+ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, gị onye na-edebere ndị ohu+ gị ọgbụgba ndụ, bụ́ ndị ji obi ha dum na-eje ije n’ihu gị,+ gị onye na-egosikwa ha obiọma,*+ 24  gị onye mezuwooro ohu gị Devid bụ́ nna m ihe i kwere ya ná nkwa. I ji ọnụ gị kwe nkwa, i wee jiri aka gị mezuo ya taa.+ 25  Ugbu a kwa, Jehova bụ́ Chineke Izrel, mezuoro ohu gị Devid bụ́ nna m ihe ahụ i kwere ya ná nkwa, sị, ‘Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe nwoke si n’ahụ́ gị nke ga-anọkwasị n’ocheeze Izrel,+ ma ọ bụrụhaala na ụmụ gị elezie ụzọ ha anya site n’ije ije n’ihu m dị nnọọ ka i jere n’ihu m.’ 26  Ma ugbu a, Chineke Izrel, biko, ka nkwa+ i kwere ohu gị Devid bụ́ nna m mezuo. 27  “Ma Chineke ọ̀ ga-ebi n’elu ala n’ezie?+ Lee! Eluigwe,+ ee, eluigwe nke eluigwe+ apụghị ịba gị,+ ma ya fọdụzie ụlọ+ a m wuru! 28  Jehova bụ́ Chineke m, chee ihu n’ekpere+ ohu gị na-ekpe nakwa n’arịrịọ ọ na-arịọ ka i meere ya amara,+ ka i gee ntị n’ákwá ohu gị na-ebesara gị na ekpere ọ na-ekpe n’ihu gị taa;+ 29  ka anya gị dịrị+ n’ebe ụlọ a dị abalị na ehihie, n’ebe i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị na ya,’+ ka i gee ntị n’ekpere ohu gị chere ihu n’ebe a na-ekpe.+ 30  Gee ntị n’arịrịọ ohu gị na-arịọ ka i meere ya amara+ nakwa nke ndị gị Izrel chere ihu n’ebe a na-arịọ; gị onwe gị nọrọkwa n’ebe obibi gị n’eluigwe nụrụ,+ nụrụ ya ma gbaghara.+ 31  “Mgbe mmadụ mehiere mmadụ ibe ya,+ onye ahụ e mehiere ewee mee ka ọ ṅụọ iyi ka iyi ọ ṅụrụ ree n’ahụ́ ya,+ o wee buru iyi ahụ e mere ka ọ ṅụọ bịa n’ihu ebe ịchụàjà gị dị n’ụlọ a, 32  mgbe ahụ, gị onwe gị nọrọ n’eluigwe nụrụ, meekwa ihe ma kpee ndị ohu gị ikpe site n’ịkpọ onye ajọ omume onye ajọ omume site n’ime ka o buru ihe o metara,+ nakwa site n’ịkpọ onye ezi omume onye ezi omume+ site n’ịkwụ ya ụgwọ dị ka ezi omume ya si dị.+ 33  “Mgbe ndị iro meriri ndị gị bụ́ Izrel,+ n’ihi na ha na-emehie gị,+ ha ewee lọghachikwute gị+ n’ezie ma nọrọ n’ụlọ a too aha gị+ ma kpee ekpere+, rịọkwa gị arịrịọ ka i meere ha amara,+ 34  mgbe ahụ, gị onwe gị nọrọ n’eluigwe nụrụ, gbagharakwa mmehie ndị gị bụ́ Izrel+ ma kpọghachite+ ha n’ala i nyere ndị nna nna ha.+ 35  “Mgbe e mechiri eluigwe, mmiri ewee ghara izo,+ n’ihi na ha nọ na-emehie+ gị, ha wee chee ihu n’ebe a kpee ekpere+ ma too aha gị, sikwa ná mmehie ha chigharịa, n’ihi na ị nọ na-emekpa ha ahụ́,+ 36  mgbe ahụ, gị onwe gị, nọrọ n’eluigwe nụrụ, gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, ya bụ, mmehie nke ndị gị bụ́ Izrel, n’ihi na ị na-ezi+ ha ụzọ dị mma nke ha kwesịrị ije ije na ya;+ mee ka mmiri zoo+ n’ala gị nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha. 37  “Ọ bụrụ na ụnwụ+ adaa n’ala a, ọ bụrụ na e nwee ọrịa na-efe efe,+ ọ bụrụ na ihe ọkụkụ akpọnwụọ, e nweekwa ịma ebu,+ igurube+ na ọchịcha;+ ọ bụrụ na ndị iro ha anọchibido ha n’ọnụ ụzọ ámá nke ala ha, ụdị ihe otiti ọ bụla, ụdị ọrịa ọ bụla, 38  ekpere+ ọ bụla onye ọ bụla ma ọ bụ ndị gị niile bụ́ Izrel+ ga-ekpe ma ọ bụ arịrịọ ọ bụla ha ga-arịọ ka i meere ha amara,+ n’ihi na onye ọ bụla n’ime ha maara ihe na-egbu ya mgbu n’obi,+ ha ewee gbasapụ ọbụ aka ha chee n’ebe ụlọ a dị,+ 39  mgbe ahụ, gị onwe gị nọrọ n’eluigwe,+ bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike,+ nụrụ, gbagharakwa+ wee mee ihe+ ma kwụọ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya niile si dị,+ n’ihi na ị maara obi ya+ (n’ihi na ọ bụ naanị gị maara obi ụmụ mmadụ niile nke ọma);+ 40  ka ha wee tụọ egwu+ gị n’ụbọchị niile ha dị ndụ n’elu ala nke i nyere ndị nna nna anyị.+ 41  “Tinyere onye mba ọzọ,+ onye na-esoghị ná ndị gị Izrel, onye sikwa n’ala dị anya bịa n’ihi aha gị+ 42  (n’ihi na ha ga-anụ banyere aha ukwu+ gị na banyere aka gị dị ike+ nakwa banyere ogwe aka gị ị gbatịrị agbatị), o wee bịa chee ihu n’ụlọ a kpee ekpere,+ 43  gị onwe gị, nọrọ n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike,+ nụrụ, meekwa ihe niile mere onye mba ọzọ ahụ ji na-akpọku gị;+ ka ndị niile nke ụwa wee mara aha gị+ wee tụọ egwu gị dị ka ndị gị Izrel na-eme, ka ha wee mara na a kpọkwasịwo aha gị n’ụlọ a m wuru.+ 44  “Ọ bụrụ na ndị gị agaa ibuso ndị iro ha agha+ n’ebe i zigara ha,+ ha ewee chee ihu n’obodo a ị họọrọ+ nakwa n’ụlọ a m wuuru aha gị+ wee kpekuo Jehova ekpere,+ 45  nọrọ n’eluigwe nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha ga-arịọ ka i meere ha amara, meekwara ha ihe e kpere n’ikpe.+ 46  “Ọ bụrụ na ha emehie gị+ (n’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-adịghị eme mmehie),+ i wee weso ha oké iwe ma nyefee ha n’aka ndị iro, ndị meriri ha ewee dọrọ ha n’agha laa n’ala ndị iro n’ebe dị anya ma ọ bụ n’ebe dị nso;+ 47  anya ewee doo ha n’ala ebe a dọọrọ ha n’agha laa,+ ha ewee lọghachi+ ma rịọ gị arịrịọ+ ka i meere ha amara n’ala ndị dọọrọ ha n’agha,+ sị, ‘Anyị emehiewo+ ma jehie,+ anyị emewo ajọ omume’;+ 48  ha ewee nọrọ n’ala ndị iro ha, bụ́ ndị dọọrọ ha n’agha, jiri obi ha dum+ na mkpụrụ obi ha dum lọghachikwute gị, ha ewee chee ihu n’ala ha bụ́ nke i nyere ndị nna nna ha, bụ́ obodo ị họọrọ nakwa n’ụlọ a m wuuru aha gị, kpekuo gị ekpere;+ 49  nọrọkwa n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike,+ nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha na-arịọ ka i meere ha amara, meekwara ha ihe e kpere n’ikpe,+ 50  gbaghara+ ndị gị bụ́ ndị mehiere+ gị, gbagharakwa ha iwu gị niile+ ha mebiri;+ meekwa ka ha ghọọ ndị kwesịrị imere ebere+ n’anya ndị dọọrọ ha n’agha, ha ga-emekwara ha ebere 51  (n’ihi na ha bụ ndị gị na ihe nketa gị,+ ndị i si n’Ijipt,+ n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè, kpọpụta),+ 52  ka anya gị wee ghere oghe n’arịrịọ ohu gị na-arịọ ka e meere ya amara nakwa n’arịrịọ ndị gị bụ́ Izrel na-arịọ ka e meere ha amara,+ site n’ige ha ntị n’ihe niile mere ha ji na-akpọku gị.+ 53  N’ihi na gị onwe gị kewapụtara ha ka ha bụrụ ihe nketa gị n’ime ndị niile nke ụwa,+ dị nnọọ ka i kwuru site n’ọnụ Mozis+ bụ́ ohu gị mgbe i si n’Ijipt na-akpọpụta ndị nna nna anyị, gị Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova.” 54  O wee ruo na ozugbo Sọlọmọn kpekusịrị Jehova ekpere a dum, rịọkwa arịrịọ ka o meere ya amara, o si n’ihu ebe ịchụàjà Jehova, bụ́ ebe o gburu ikpere+ n’ala gbasapụ ọbụ aka ya chee n’eluigwe,+ bilie; 55  o wee guzoro ọtọ+ ma jiri oké olu gọzie+ ọgbakọ Izrel dum, sị: 56  “Ka Jehova, bụ́ onye nyere ndị ya Izrel ebe izu ike dị ka ihe niile o kwere ná nkwa si dị,+ bụrụ onye a gọziri agọzi.+ Ọ dịghị otu okwu nke na-emezubeghị+ n’ime nkwa ọma ya niile o kwere site n’ọnụ Mozis bụ́ ohu ya.+ 57  Ka Jehova bụ́ Chineke anyị nọnyere anyị+ dị nnọọ ka ọ nọnyeere nna nna anyị hà.+ Ya ahapụla anyị ma ọ bụ gbahapụ anyị,+ 58  ka o wee mee ka obi anyị dịrị+ n’ebe ọ nọ ije ije n’ụzọ ya niile+ na idebe ihe ndị o nyere n’iwu+ na ụkpụrụ+ ya na mkpebi ikpe ya,+ bụ́ ndị o nyere nna nna anyị hà n’iwu. 59  Ka ihe ndị a m kwuru n’arịrịọ m rịọrọ n’ihu Jehova ka o meere m amara bụrụ nke Jehova bụ́ Chineke anyị ga na-echeta+ ehihie na abalị, ka o wee meere ohu ya ihe e kpere n’ikpe, meekwara ndị ya bụ́ Izrel ihe e kpere n’ikpe dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa kwa ụbọchị;+ 60  ka ndị niile nke ụwa wee mara+ na Jehova bụ ezi Chineke.+ Ọ dịghị ọzọ dịnụ.+ 61  Obi unu dum ga-adịkwa+ n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ site n’ije ije n’ụkpụrụ ya, sitekwa n’idebe ihe ndị o nyere n’iwu dị ka ọ dị taa.” 62  Eze na Izrel dum nọ na-achụ àjà dị ukwu n’ihu Jehova.+ 63  Sọlọmọn wee chụọ àjà udo+ ndị o kwesịrị ịchụrụ Jehova, ya bụ, ehi dị puku iri abụọ na puku abụọ na atụrụ dị otu narị puku na iri puku abụọ,+ ka eze na ụmụ Izrel niile wee rara ụlọ Jehova nye.+ 64  N’ụbọchị ahụ eze doro etiti ogige nke dị n’ihu ụlọ Jehova nsọ,+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ chụrụ àjà nsure ọkụ na àjà ọka,* werekwa abụba anụ àjà udo chụọ àjà; n’ihi na ebe ịchụàjà ahụ e ji ọla kọpa mee+ nke dị n’ihu Jehova dị nnọọ obere nke na ọ baghị àjà nsure ọkụ ahụ na àjà ọka ahụ na abụba+ anụ àjà udo ahụ. 65  Sọlọmọn wee mee ememme+ ahụ n’oge ahụ, ya na Izrel dum, bụ́ ọgbakọ dị ukwuu,+ malite n’ebe e si abanye Hemat+ gbadaruo ndagwurugwu Ijipt,+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị ụbọchị asaa nakwa ụbọchị asaa ọzọ,+ ya bụ, ụbọchị iri na anọ. 66  N’ụbọchị nke asatọ, ọ hapụrụ ndị ahụ ka ha lawa;+ ha wee malite ịgọzi eze, ha jikwa ọṅụ+ na obi ụtọ+ laa n’ụlọ ha, n’ihi ihe ọma+ niile Jehova meere Devid bụ́ ohu ya na Izrel bụ́ ndị ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”
Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.