Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Eze 22:1-53

22  Ruo afọ atọ, ha nọ na-ebi n’enweghị agha n’etiti Siria na Izrel.  O wee ruo n’afọ nke atọ na Jehọshafat+ bụ́ eze Juda gakwuuru eze Izrel.  Eze Izrel wee gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “Ùnu maara n’ezie na ọ bụ anyị nwe Remọt-gilied?+ Ma o nweghị ihe anyị na-eme ịnapụta ya n’aka eze Siria.”  O wee gwa Jehọshafat, sị: “Ị̀ ga-eso m gaa buo agha na Remọt-gilied?+ Jehọshafat wee sị eze Izrel: “Mụ na gị bụ otu. Ndị m na ndị gị bụkwa otu.+ Ịnyịnya m na ịnyịnya gị bụ otu.”  Otú ọ dị, Jehọshafat sịrị eze Izrel: “Biko, burugodị ụzọ jụta+ ihe Jehova ga-ekwu.”  Eze Izrel wee kpọkọta+ ndị amụma, ihe dị ka narị ndị ikom anọ, wee sị ha: “Ọ̀ bụ m gaa buso Remọt-gilied agha, ka ọ̀ bụ mụ agala?” Ha wee na-asị: “Gawa,+ Jehova ga-enyefekwa ya n’aka eze.”  Ma Jehọshafat sịrị: “Ọ̀ bụ na e nweghị onye ọzọ bụ́ onye amụma Jehova n’ebe a? Ka anyị jụọkwa ase site n’ọnụ ya.”+  Eze Izrel wee sị Jehọshafat: “A ka nwere otu nwoke a ga-esi n’ọnụ ya jụọ Jehova ase;+ ma akpọrọ m ya asị,+ n’ihi na ọ dịghị eburu m amụma ihe ọma kama ọ bụ amụma ihe ọjọọ ka ọ na-eburu m+—Mịkaya nwa Imla.” Otú ọ dị, Jehọshafat sịrị: “Eze, ekwula otú ahụ.”+  Eze Izrel wee kpọọ otu onye na-eje ozi n’obí eze+ wee sị: “Kpọta Mịkaya nwa Imla ọsọ ọsọ.”+ 10  Eze Izrel na Jehọshafat eze Juda nọ, onye nke ọ bụla n’ocheeze ya, yirikwa uwe ndị eze,+ n’ebe nzọcha mkpụrụ nke dị n’ọnụ ụzọ ámá Sameria; ndị amụma niile ahụ nọ na-eme dị ka ndị amụma n’ihu ha.+ 11  Zedekaya nwa Keneana meere onwe ya mpi ígwè wee sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru,+ ‘Ị ga-eji mpi ndị a na-asọ ndị Siria ruo mgbe i kpochapụrụ ha.’”+ 12  Ndị amụma niile ọzọ nọkwa na-ebu otu ihe ahụ n’amụma, na-asị: “Gbagoo Remọt-gilied nwee ihe ịga nke ọma; Jehova ga-enyefekwa ya n’aka eze.”+ 13  Onye ozi ahụ nke gara ịkpọ Mịkaya gwara ya, sị: “Lee! Okwu ndị amụma na-agwa eze dịcha mma. Biko, ka okwu gị dịrị ka nke otu n’ime ha, kwuo ihe dị mma.”+ 14  Ma Mịkaya sịrị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ ọ bụ ihe Jehova ga-agwa m ka m ga-ekwu.”+ 15  O wee bịakwute eze, eze wee sị ya: “Mịkaya, ọ̀ bụ anyị gaa Remọt-gilied buo agha, ka ọ̀ bụ anyị agala?” Ozugbo ahụ ọ sịrị ya: “Gbagoo nwee ihe ịga nke ọma; Jehova ga-enyefekwa ya n’aka eze.”+ 16  Eze wee sị ya: “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị naanị eziokwu n’aha Jehova?”+ 17  O wee sị: “N’ezie, m na-ahụ ka a chụsasịrị+ ndị Izrel niile n’ugwu, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ Jehova wee sị: ‘Ọ dịghị ndị nwe ndị a. Ka onye ọ bụla n’ime ha laghachi n’ụlọ ya n’udo.’”+ 18  Eze Izrel wee sị Jehọshafat: “Ọ̀ bụ na mụ agwaghị gị, sị, ‘Ọ gaghị ebu amụma ọma banyere m, kama ọ bụ amụma ọjọọ’?”+ 19  O wee gaa n’ihu ịsị: “Ya mere, nụrụ okwu Jehova:+ M na-ahụ ka Jehova nọ ọdụ n’ocheeze ya+ nakwa ka ụsụụ ndị agha niile nke eluigwe guzo n’akụkụ ya, n’aka nri ya nakwa n’aka ekpe ya.+ 20  Jehova wee sị, ‘Ònye ga-arafu Ehab, ka o wee gaa nwụọ na Remọt-gilied?’ Onye nke a kwuo nke a, onye nke a ekwuo nke a.+ 21  N’ikpeazụ, otu mmụọ+ pụtara wee guzo n’ihu Jehova, sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’ Jehova wee sị ya, ‘Olee otú ị ga-esi rafuo ya?’+ 22  O wee zaa, sị, ‘M ga-aga, m ga-aghọkwa mmụọ nrafu n’ọnụ ndị amụma ya niile.’+ O wee sị, ‘Ị ga-arafu ya, ị ga-emerikwa.+ Gaa mee otú ahụ.’+ 23  Lee, Jehova etinyewo mmụọ nrafu n’ọnụ ndị amụma gị niile a;+ ma Jehova ekwuwo na ọdachi ga-adakwasị gị.”+ 24  Zedekaya nwa Keneana wee bịaruo nso maa Mịkaya ụra,+ sị: “Olee nnọọ otú mmụọ Jehova si hapụ m gaa gwawa gị okwu?”+ 25  Mịkaya wee sị: “Lee! Ị ga-ahụ otú o si mee n’ụbọchị ahụ mgbe ị ga-abanye n’ọnụ ụlọ gị dị n’ime ime+ zoo.”+ 26  Eze Izrel wee sị: “Kpọrọ Mịkaya kpọghachiri Emọn bụ́ onyeisi obodo nakwa Joash nwa eze.+ 27  Ị ga-asịkwa, ‘Nke a bụ ihe eze kwuru:+ “Tụbanụ onye a n’ụlọ mkpọrọ,+ na-enyekwanụ ya obere ihe oriri+ nakwa obere mmiri ruo mgbe m lọtara n’udo.”’”+ 28  Mịkaya wee sị: “Ọ bụrụ na e nwee ka i si lọta n’udo, mara na Jehova agwaghị m okwu.”+ O kwukwara, sị: “Nụrụnụ ya, unu niile.”+ 29  Eze Izrel na Jehọshafat eze Juda wee gbagoo Remọt-gilied.+ 30  Eze Izrel wee sị Jehọshafat: “M ga-ejigharị ejiji wee banye n’ọgbọ agha,+ ma gị onwe gị, yiri uwe gị.”+ Eze Izrel wee jigharịa ejiji+ banye n’ọgbọ agha.+ 31  Ma eze Siria nyere ndị isi iri atọ na abụọ+ nke ụgbọ ịnyịnya ya iwu, sị: “Unu alụsola ma onye nta ma onye ukwu ọgụ, ma e wezụga naanị eze Izrel.”+ 32  O wee ruo na ozugbo ndị isi ụgbọ ịnyịnya ahụ hụrụ Jehọshafat, ha kwuru n’obi ha, sị: “N’ezie, ọ bụ eze Izrel.”+ Ha wee tụgharịa ibuso ya agha; Jehọshafat wee malite iti mkpu enyemaka.+ 33  O wee ruo na ngwa ngwa ndị isi ụgbọ ịnyịnya hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ozugbo ahụ ha kwụsịrị ịchụ ya wee laghachi.+ 34  E nwere otu nwoke nke gbara ụta n’ebughị onye ọ bụla n’obi, ma ọ gbatara ya eze Izrel n’agbata ebe ejiji agha ya nwere njikọ, o wee sị onye na-anya ụgbọ ịnyịnya ya:+ “Tụgharịa, bupụ m n’ọgbọ agha a, n’ihi na e merụwo m ahụ́ nke ukwuu.” 35  Agha ahụ wee na-esiwanye ike n’ụbọchị ahụ, e wee kwụwa eze ọtọ n’ụgbọ ịnyịnya ahụ chee ya ihu n’ebe ndị Siria nọ, o wee nwụọ+ ná mgbede; ọbara nke na-agbapụta n’ebe e merụrụ ya ahụ́ nọ na-awụba n’ime ụgbọ ịnyịnya agha ahụ.+ 36  E wee malite iti oké mkpu gazuo ebe ha mara ụlọikwuu n’ihe dị ka mgbe anyanwụ na-ada, sị: “Onye ọ bụla laa n’obodo ya, onye ọ bụla laakwa n’ala ya!”+ 37  Otú ahụ ka eze si nwụọ. Mgbe e butere eze na Sameria, ha liri ya na Sameria.+ 38  Ha wee malite ịsacha ụgbọ ịnyịnya agha ahụ n’akụkụ ọdọ mmiri Sameria, nkịta wee rachaa ọbara ya+ dị ka Jehova kwuru, (ndị akwụna na-asakwa ahụ́ n’ebe ahụ).+ 39  Ma ihe ndị ọzọ metụtara Ehab na ihe niile o mere na ụlọ ọdụ́+ o wuru na obodo niile o wuru, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Izrel? 40  N’ikpeazụ, Ehab sooro nna nna ya hà dinaa;+ Ehazaya+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya. 41  Ma Jehọshafat+ nwa Esa ghọrọ eze Juda n’afọ nke anọ nke ọchịchị Ehab bụ́ eze Izrel. 42  Jehọshafat dị afọ iri atọ na ise mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịrị afọ iri abụọ na ise na Jeruselem; aha nne ya bụ Azuba, ada Shilhaị. 43  O wee na-eje ije n’ụzọ niile Esa nna ya jere. Ọ hapụghị ya, site n’ime ihe ziri ezi n’anya Jehova.+ Ọ bụ naanị na e bibighị ebe ndị dị elu. Ndị mmadụ ka na-achụ àjà ma na-esure ihe nsure ọkụ n’ebe ndị dị elu.+ 44  Jehọshafat mere ka ya na eze Izrel na-adị n’udo.+ 45  Ma ihe ndị ọzọ metụtara Jehọshafat na ike ọ kpara na otú o si buo agha, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Juda? 46  O kpochapụkwara n’ala ahụ ndị ikom bụ́ ndị akwụna ụlọ arụsị,+ bụ́ ndị a hapụrụ n’ụbọchị Esa nna ya.+ 47  Ma e nweghị eze n’Idọm,+ ọ bụ onye na-anọchite anya eze bụ eze.+ 48  Jehọshafat rụrụ ụgbọ mmiri Tashish+ ka ha gaa Ofa bute ọlaedo; ma ha agaghị, n’ihi na ụgbọ mmiri ndị ahụ kpuru n’Iziọn-giba.+ 49  Ọ bụ mgbe ahụ ka Ehazaya nwa Ehab gwara Jehọshafat, sị: “Ka ndị na-ejere m ozi soro ndị na-ejere gị ozi jiri ụgbọ mmiri gaa,” ma Jehọshafat ekweghị.+ 50  N’ikpeazụ, Jehọshafat sooro nna nna ya hà dinaa,+ e wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid+ bụ́ nna nna ya; Jehoram+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya. 51  Ma Ehazaya+ nwa Ehab, ọ bụ n’afọ nke iri na asaa nke ọchịchị Jehọshafat bụ́ eze Juda ka ọ ghọrọ eze Izrel n’ime Sameria, o wee na-achị Izrel ruo afọ abụọ. 52  O wee na-eme ihe jọrọ njọ+ n’anya Jehova ma na-eje ije n’ụzọ nna ya+ nakwa n’ụzọ nne ya+ nakwa n’ụzọ Jeroboam+ nwa Nibat, bụ́ onye mere ka Izrel mehie.+ 53  O wee na-efe Bel+ ma na-akpọrọ ya isiala, na-akpasukwa Jehova bụ́ Chineke Izrel iwe+ dị ka ihe niile nna ya mere si dị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji