Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Eze 19:1-21

19  Ehab+ wee kọọrọ Jezibel+ ihe niile Ịlaịja mere na ihe niile banyere otú o si jiri mma agha gbuo ndị amụma ahụ niile.+  Jezibel wee ziga onye ozi ka o zie Ịlaịja, sị, “Ka chi m mee otú ahụ,+ ka ha tụkwasịkwa ihe na ya,+ ma ọ bụrụ na n’ụdị ugbu a echi emeghị m ka mkpụrụ obi gị dị ka mkpụrụ obi onye nke ọ bụla n’ime ha!”  Egwu wee tụwa ya. O wee bilie gbapụ n’ihi mkpụrụ obi+ ya wee bịarute Bia-shiba+ nke Juda.+ O wee hapụ onye na-ejere ya ozi n’ebe ahụ.  Ya onwe ya wee banye n’ala ịkpa gaa njem otu ụbọchị, n’ikpeazụ, ọ bịara nọdụ ọdụ n’okpuru otu osisi brum.+ O wee malite ịrịọ ka mkpụrụ obi ya nwụọ wee sị: “O zuwo! Ugbu a, Jehova, wepụ mkpụrụ obi m,+ n’ihi na akaghị m nna nna m hà mma.”  N’ikpeazụ, o dinara ala, ụra wee buru ya n’okpuru osisi brum ahụ.+ Ma, lee! otu mmụọ ozi+ nọ na-emetụ ya aka.+ O wee sị ya: “Bilie rie ihe.”  Mgbe o lere anya, lee, n’akụkụ isi ya, e nwere achịcha+ nke dị n’elu nkume chara ọkụ na otu ihe mmiri nke mmiri dị n’ime ya. O wee malite iri ihe na ịṅụ mmiri, e mesịa, o dinara ala ọzọ.  E mesịa, mmụọ ozi+ Jehova bịara nke ugboro abụọ wee metụ ya aka, sị: “Bilie rie ihe, n’ihi na njem ị ga-eme dị ukwuu.”+  O wee bilie rie ihe, ṅụọkwa mmiri, o wee jiri ike ihe ahụ o riri na-aga ruo ụbọchị iri anọ,+ ehihie na abalị, ruo n’ugwu nke ezi Chineke, bụ́ Horeb.+  N’ikpeazụ, ọ banyere n’otu ọgba n’ebe ahụ,+ ka o wee nọọ n’ebe ahụ n’abalị ahụ; ma, lee! okwu Jehova ruru ya ntị, o wee sị ya: “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme n’ebe a?”+ 10  O wee zaa, sị: “Anọwo m na-ekworo Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha ekworo+ nke ukwuu; n’ihi na ụmụ Izrel ahapụwo ọgbụgba ndụ gị,+ ha etidawo ebe ịchụàjà gị,+ ha ejiriwokwa mma agha gbuo ndị amụma gị,+ nke mere na ọ fọdụrụ naanị m;+ ha wee malite ịchọ mkpụrụ obi m ka ha wepụ ya.”+ 11  Ma ọ sịrị: “Pụọ, guzokwa n’ugwu a n’ihu Jehova.”+ Ma, lee! Jehova na-agafe,+ oké ifufe dị ike wee na-agbawa ugwu, na-agbawakwa nkume dị elu n’ihu Jehova.+ (Jehova anọghị n’ifufe ahụ.) Mgbe ifufe ahụ kwụsịrị, e nwere ala ọma jijiji.+ (Jehova anọghị n’ala ọma jijiji ahụ.) 12  Mgbe ala ọma jijiji ahụ kwụsịrị, e nwere ọkụ.+ (Jehova anọghị n’ọkụ ahụ.) Mgbe ọkụ ahụ nyụrụ, e nwere olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ.+ 13  O wee ruo na ngwa ngwa Ịlaịja nụrụ ya, o weere uwe e jiri mara ya+ fụchie ihu ya ozugbo wee pụọ guzoro n’ọnụ ọgba ahụ; ma, lee! otu olu ruru ya ntị, o wee sị ya: “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme n’ebe a?”+ 14  O wee zaa, sị: “Anọwo m na-ekworo Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha ekworo nke ukwuu; n’ihi na ụmụ Izrel ahapụwo ọgbụgba ndụ gị,+ ha etidawo ebe ịchụàjà gị, ha ejiriwokwa mma agha gbuo ndị amụma gị, nke mere na ọ fọdụrụ naanị m; ha wee malite ịchọ mkpụrụ obi m ka ha wepụ ya.”+ 15  Jehova wee sị ya: “Gawa, laghachi n’ala ịkpa Damaskọs;+ ị ga-abatakwa wee tee Hazel+ mmanụ+ ịbụ eze Siria. 16  Ị ga-etekwa Jihu+ nwa nwa Nimshaị+ mmanụ ịbụ eze Izrel; ị ga-etekwa Ịlaịsha+ nwa Shefat bụ́ onye si Ebel-mehola+ mmanụ ịbụ onye amụma nke ga-anọchi gị.+ 17  Ọ ga-erukwa na onye gbanahụrụ mma agha Hazel,+ Jihu ga-egbu ya;+ onye gbanahụkwara mma agha Jihu, Ịlaịsha ga-egbu ya.+ 18  Emewokwa m ka puku mmadụ asaa fọdụ n’Izrel,+ bụ́ ikpere niile na-egbubereghị Bel n’ala,+ na ọnụ ọ bụla nke na-esusubeghị ya.”+ 19  N’ihi ya, o si n’ebe ahụ pụọ wee hụ Ịlaịsha nwa Shefat ka ọ na-akọ ọrụ,+ ehi iri abụọ na anọ e jikọrọ abụọ abụọ na-akọkwa ọrụ n’ihu ya, ya onwe ya ji abụọ nke ikpeazụ. Ya mere, Ịlaịja gafetara n’ebe ọ nọ wee wụkwasị ya uwe e ji mara ya.+ 20  O wee hapụ ehi ndị ahụ chụsoo Ịlaịja wee sị: “Biko, ka m susuo nna m na nne m ọnụ.+ M ga-esowekwa gị.” O wee sị ya: “Gawa, laghachi; ò nwere ihe m mere gị?” 21  Ya mere, ọ kwụsịrị iso ya, wee laghachi, kpụrụkwa ehi abụọ gbuo,*+ wee jiri osisi e ji jikọta+ ehi ndị ahụ sie anụ ha ma nye ya ndị mmadụ, ha wee rie. E mesịa, o biliri sowe Ịlaịja wee malite ijere ya ozi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

1Ez 19:21*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “chụọ àjà.”