Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Jọn 3:1-24

3  Leenụ ụdị ịhụnanya+ Nna ahụ gosiri anyị, ka e wee kpọọ anyị ụmụ Chineke;+ ọ bụkwa ihe anyị bụ. Ọ bụ ya mere na ụwa+ amaghị anyị, n’ihi na ụwa amaghị Ya.+  Ndị m hụrụ n’anya, ugbu a, anyị bụ ụmụ Chineke,+ ma e mebeghị ka ihe anyị ga-abụ pụta ìhè.+ Anyị maara na mgbe ọ bụla e mere ka onye ahụ pụta ìhè,+ anyị ga-adị ka ya,+ n’ihi na anyị ga-ahụ ya otú ọ dị.+  Onye ọ bụla nke nwere olileanya a n’ebe ọ nọ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha+ dị nnọọ ka onye ahụ dị ọcha.+  Onye ọ bụla nke na-eme mmehie+ na-emebikwa iwu,+ n’ihi ya, mmehie+ bụ mmebi iwu.  Unu makwaara na e mere ka onye ahụ pụta ìhè ka o wee wepụ mmehie anyị,+ ọ dịghịkwa mmehie+ dị n’ime ya.  Onye ọ bụla nke ya na ya dị n’otu+ adịghị anọ na-eme mmehie;+ ọ dịghị onye na-eme mmehie nke hụworo ya ma ọ bụ mara ya.+  Ụmụntakịrị, unu ekwela ka onye ọ bụla duhie unu; onye na-eme ezi omume bụ onye ezi omume, dị nnọọ ka onye ahụ bụ onye ezi omume.+  Onye na-eme mmehie sitere n’Ekwensu, n’ihi na Ekwensu anọwo na-emehie site ná mmalite.+ Ọ bụ ihe a mere e ji mee ka Ọkpara Chineke pụta ìhè,+ ya bụ, ka o wee bibie ọrụ Ekwensu.+  Onye ọ bụla a mụrụ site na Chineke adịghị anọ na-eme mmehie,+ n’ihi na mkpụrụ Ya nke na-enye ndụ na-adịgide n’ime onye dị otú ahụ, ọ pụghịkwa ịnọ na-eme mmehie, n’ihi na a mụrụ ya site na Chineke.+ 10  Ụmụ Chineke na ụmụ Ekwensu pụtara ìhè site n’ihe a: Onye ọ bụla nke na-adịghị eme ezi omume+ esiteghị na Chineke, onye na-ahụghị nwanna ya n’anya esiteghịkwa na Ya.+ 11  N’ihi na ozi ahụ unu nụrụ site ná mmalite+ bụ na anyị kwesịrị ịhụ ibe anyị n’anya;+ 12  ọ bụghị dị ka Ken, onye sitere n’ajọ onye ahụ wee gbuo+ nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ n’ihi na ọrụ ya jọrọ njọ,+ ma ọrụ nwanne ya ziri ezi.+ 13  Ụmụnna m, ya ejula unu anya na ụwa kpọrọ unu asị.+ 14  Anyị maara na anyị esiwo n’ọnwụ gafere ná ndụ,+ n’ihi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya.+ Onye na-ahụghị ụmụnna ya n’anya ka nọ n’ọnwụ.+ 15  Onye ọ bụla nke kpọrọ+ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ,+ unu makwaara na ọ dịghị ogbu mmadụ+ nke nwere ndụ ebighị ebi n’ime ya.+ 16  Anyị si otú a mara ihe bụ́ ịhụnanya,+ n’ihi na onye ahụ tọgbọrọ mkpụrụ obi ya n’ihi anyị;+ anyị jikwa ụgwọ ịtọgbọ mkpụrụ obi anyị n’ihi ụmụnna anyị.+ 17  Ma onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa a nke e ji ebi ndụ+ ma hụ nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa,+ ma o nweghị ọmịiko n’ebe ọ nọ,+ olee otú ịhụnanya maka Chineke si dịrị n’ime ya?+ 18  Ụmụntakịrị, ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya,+ ọ bụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire,+ kama n’omume+ nakwa n’eziokwu.+ 19  Anyị ga-eji ihe a mara na anyị sitere n’eziokwu ahụ,+ anyị ga-emekwa ka obi sie anyị ike n’ihu ya 20  banyere ihe ọ bụla obi anyị nwere ike ịma anyị ikpe na ya,+ n’ihi na Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.+ 21  Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ na obi anyị adịghị ama anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu n’ebe Chineke nọ;+ 22  anyị na-anatakwa ihe ọ bụla anyị rịọrọ ya,+ n’ihi na anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu, na-emekwa ihe dị mma n’anya ya.+ 23  N’ezie, nke a bụ ihe o nyere n’iwu, ka anyị nwee okwukwe n’aha Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst+ ma hụ ibe anyị n’anya,+ dị nnọọ ka o nyere anyị n’iwu. 24  Ya na onye na-edebe ihe o nyere n’iwu dị n’otu, onye ahụ na ya onwe ya dị n’otu;+ anyị jikwa nke a mara na anyị na ya dị n’otu,+ n’ihi mmụọ ya+ nke o nyere anyị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji