Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọrụ Ndịozi 13:1-52

13  N’Antiọk, e nwere ndị amụma+ na ndị ozizi n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ, Banabas ya na Simiọn onye a kpọrọ Naịja, na Lushiọs+ onye Saịrini, na Manen onye ya na Herọd onye na-achị ógbè ahụ gụkọrọ akwụkwọ, tinyere Sọl.  Ka ha nọ na-ejere Jehova ozi n’ihu ọha+ ma na-ebu ọnụ, mmụọ nsọ sịrị: “N’etiti mmadụ niile, dooro m Banabas na Sọl+ iche maka ọrụ m kpọrọ ha ka ha rụọ.”  Mgbe ahụ ha buru ọnụ ma kpee ekpere wee bikwasị ha aka+ n’isi wee hapụ ha ka ha gawa.  Ya mere, ndị ikom a, bụ́ ndị mmụọ nsọ zipụrụ, gbadara Seliushia, ha sikwa n’ebe ahụ jiri ụgbọ mmiri gaa Saịprọs.  Mgbe ha rutere Salamis, ha malitere ikwusa okwu Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ọ bụ Jọn+ na-ejere ha ozi.  Mgbe ha gazuru agwaetiti ahụ dum ruo Pefọs, ha zutere otu nwoke, bụ́ dibịa afa, onye amụma ụgha,+ onye Juu aha ya bụ Baa-Jizọs,  ya na onye na-achị ógbè ahụ bụ́ Sajiọs Pọlọs, bụ́ nwoke maara ihe, nọkwa. Mgbe nwoke a kpọrọ Banabas na Sọl ka ha bịakwute ya, ọ chọsiri ike ịnụ okwu Chineke.  Ma Elimas onye bụ́ dibịa afa (n’ezie, nke ahụ bụ otú e si asụgharị aha ya) malitere imegide ha,+ na-achọ ime ka onye ahụ na-achị ógbè ahụ ghara inwe okwukwe n’Onyenwe anyị.  Ma ebe Sọl, onye bụkwa Pọl, jupụtara na mmụọ nsọ, o legidere ya anya 10  wee sị: “Gị onye jupụtara n’ụdị aghụghọ ọ bụla na ụdị arụrụala ọ bụla, gị nwa Ekwensu,+ gị onye iro nke ihe ọ bụla ziri ezi, ị́ gaghị akwụsị ịgbagọ ụzọ ziri ezi nke Jehova? 11  Ugbu a kwa, lee! aka Jehova na-adịkwasị gị, ị ga-ekpukwa ìsì, n’ahụghị ìhè anyanwụ ruo oge ụfọdụ.” N’otu ntabi anya, oké alụlụụ na ọchịchịrị dakwasịrị ya, o wee na-agagharị na-achọ ndị ga-ejide ya n’aka wee na-edu ya.+ 12  Mgbe onye ahụ na-achị ógbè+ ahụ hụrụ ihe mere, ọ ghọrọ onye kwere ekwe, n’ihi na ozizi Jehova juru ya anya. 13  Ndị ikom ahụ na Pọl wee banye n’ụgbọ mmiri na Pefọs, rute Paga nke dị na Pamfilia.+ Ma Jọn+ hapụrụ ha wee laghachi+ Jeruselem. 14  Otú ọ dị, ha si na Paga gaa n’ihu wee bịa Antiọk dị na Pisidia, ka ha banyere n’ụlọ nzukọ+ n’ụbọchị izu ike, ha nọdụrụ ọdụ. 15  Mgbe a gụsịrị Iwu+ ahụ na Akwụkwọ Ndị Amụma n’ihu ọha, ndị isi oche+ ụlọ nzukọ zigaara ha ozi, sị: “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu agbamume ọ bụla unu ga-agwa ndị a, kwuonụ ya.” 16  Ya mere, Pọl biliri, fee aka,+ sị: “Ụmụ Izrel na unu ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke, nụrụnụ.+ 17  Chineke nke ndị a bụ́ ndị Izrel họọrọ nna nna anyị hà, o bulikwara ha elu n’oge ha biri dị ka ndị ala ọzọ n’ala Ijipt ma jiri ogwe aka dị ike kpọpụta ha na ya.+ 18  O diri ụzọ ha si mee omume n’ala ịkpa ruo ihe dị ka afọ iri anọ.+ 19  Mgbe o bibisịrị mba asaa n’ala Kenan, o kere ala ha site n’ife nza:+ 20  ihe ahụ niile mere n’ime ihe dị ka narị afọ anọ na iri ise. “Mgbe ihe ndị a gasịkwara, o nyere ha ndị ikpe ruo n’oge Samuel onye amụma.+ 21  Ma malite n’oge ahụ gaa n’ihu, ha kwuru ka e nye ha eze,+ Chineke wee nye ha Sọl nwa Kish, nwoke si n’ebo Benjamin,+ ruo afọ iri anọ. 22  Mgbe o wepụsịrị ya,+ o mere ka Devid bụrụ eze ha,+ bụ́ onye ọ gbara àmà banyere ya, sị, ‘Ahọrọwo m Devid nwa Jesi,+ nwoke obi m nabatara,+ onye ga-eme ihe niile m na-achọ.’+ 23  Chineke si n’ụmụ+ nwoke a wetara Izrel onye nzọpụta,+ bụ́ Jizọs, dị ka o kwere ná nkwa, 24  mgbe Jọn+ kwusasịịrị ndị Izrel niile baptizim n’ihu ọha dị ka ihe na-egosi nchegharị, tupu Onye+ ahụ abata. 25  Ma mgbe ozi Jọn na-agwụcha, ọ sịrị, ‘Gịnị ka unu chere na m bụ? Ọ bụghị m bụ ya. Kama, lee! e nwere onye na-abịa n’azụ m nke m na-erughị eru ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ ya.’+ 26  “Ụmụnna m, unu ndị si n’agbụrụ Ebreham nakwa ndị ọzọ n’ime unu bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, ọ bụ anyị ka e ziteere ozi nzọpụta a.+ 27  N’ihi na ndị bi na Jeruselem na ndị na-achị ha amaghị Onye a,+ ma mgbe ha na-ekpe ya ikpe, ha mezuru ihe Ndị Amụma kwuru,+ bụ́ ihe a na-agụpụta kwa Ụbọchị Izu Ike, 28  ọ bụ ezie na ha ahụghị ihe kwesịrị ọnwụ o mere,+ ha gwara Paịlet ka e gbuo ya.+ 29  Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya,+ ha si n’elu osisi budata+ ya ma lie ya n’ili ncheta.+ 30  Ma Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie;+ 31  o mere ka ndị ha na ya si na Galili gaa Jeruselem na-ahụ ya ruo ọtụtụ ụbọchị. Ọ bụ ha na-agbara ndị Juu àmà banyere ya ugbu a.+ 32  “N’ihi ya, anyị na-ezisara unu ozi ọma banyere nkwa ahụ e kwere nna nna anyị hà,+ 33  na Chineke emezuworo ya anyị kpamkpam, anyị bụ́ ụmụ ha, ebe ọ bụ na ọ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ;+ ọbụna dị ka e dere n’abụ ọma nke abụọ, sị, ‘Ị bụ ọkpara m, aghọwo m Nna gị taa.’+ 34  Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ gaghị alaghachi ọzọ n’ire ure. O gosiri nke a site n’ikwu, sị, ‘M ga-egosi unu obiọma* na-adịghị ada ada m nwere n’ebe Devid nọ.’+ 35  Ya mere, o kwukwara n’abụ ọma ọzọ, sị, ‘Ị gaghị ekwe ka onye na-eguzosi ike n’ebe ị nọ ree ure.’+ 36  N’ihi na n’ọgbọ nke ya, Devid+ mezuru uche Chineke nke Chineke kwupụtara ekwupụta, ọ dakwara n’ụra ọnwụ, e wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà, o wee ree ure.+ 37  N’aka nke ọzọ, onye ahụ nke Chineke kpọlitere ereghị ure.+ 38  “Ya mere, maranụ, ụmụnna m, na a na-ekwusara unu mgbaghara mmehie site n’Onye a;+ 39  marakwanụ na site n’Onye a, a na-akpọ onye ọ bụla kwere ekwe onye ikpe na-amaghị+ n’ihe niile a na-apụghị isite n’iwu Mozis+ kpọọ unu ndị ikpe na-amaghị. 40  N’ihi ya, hụnụ na ihe e kwuru n’Akwụkwọ Ndị Amụma emeghị unu, 41  ‘Hụnụ ya, unu ndị nlelị, ya jukwa unu anya, pụọkwanụ n’anya, n’ihi na ọ dị ọrụ m na-arụ n’ụbọchị unu, bụ́ ọrụ nke unu na-agaghị ekwere ma ọlị ọ bụrụgodị na mmadụ akọọrọ ya unu n’ụzọ zuru ezu.’”+ 42  Mgbe ha na-apụ, ndị Juu malitere ịrịọsi ha arịrịọ ike ka ha gwa ha okwu banyere ihe ndị a n’ụbọchị izu ike na-abịanụ.+ 43  Ya mere, mgbe ndị zukọrọ n’ụlọ nzukọ gbasara, ọtụtụ n’ime ndị Juu na ndị a tọghatara atọghata, bụ́ ndị na-efe Chineke, sooro Pọl na Banabas.+ Ha gwara ha okwu, malitekwa ịgba ha ume+ ka ha jigidesie obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ ike.+ 44  N’ụbọchị izu ike nke sochirinụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ obodo ahụ dum zukọtara ka ha nụrụ okwu Jehova.+ 45  Mgbe ndị Juu hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, ekworo juru ha obi,+ ha wee malite ikwu okwu iji gbaghaa ihe Pọl na-ekwu.+ 46  Pọl na Banabas wee kwuo okwu n’atụghị egwu, sị: “Ọ dị mkpa na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke.+ Ebe ọ bụ na unu na-ajụ ya,+ ebe ọ bụkwa na unu na-ewere onwe unu ná ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, lee! anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ.+ 47  N’eziokwu, Jehova enyewo anyị iwu site n’ikwu, sị, ‘Ahọpụtawo m gị ka ị bụrụ ìhè nke ndị mba ọzọ,+ ka i wee bụrụ nzọpụta ruo nsọtụ ụwa.’”+ 48  Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe a, ha malitere ịṅụrị ọṅụ na ito okwu Jehova,+ ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị kwere ekwe.+ 49  E wee buru okwu Jehova na-agazu mba ahụ dum.+ 50  Ma ndị Juu+ kpaliri ụmụ nwaanyị a na-akwanyere ùgwù, bụ́ ndị na-efe Chineke, ha na ndị isi obodo, ha wee mee ka a malite ịkpagbu+ Pọl na Banabas ma chụpụ ha n’ókèala ha. 51  Ha tichapụụrụ ha ájá dị ha n’ụkwụ+ ma jee Aịkoniọm. 52  Ndị na-eso ụzọ Jizọs jupụtakwara n’ọṅụ+ na mmụọ nsọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọrụ 13:34*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”