Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọpụpụ 24:1-18

24  O wee sị Mozis: “Gbagoo gakwuru Jehova, gị na Erọn, Nedab na Abaịhu+ na mmadụ iri asaa+ n’ime ndị okenye Izrel, unu ga-anọkwa n’ebe dịtụ anya kpọọ isiala.  Naanị Mozis ga-abịa Jehova nso; ma ha onwe ha agaghị abịaru nso, ndị Izrel agaghịkwa eso ya gbagoo.”+  Mozis wee bịa kọọrọ ụmụ Izrel ihe niile Jehova kwuru na mkpebi ikpe ya niile,+ mmadụ niile wee jiri otu olu zaa, sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.”+  Mozis wee dee ihe niile Jehova kwuru n’akwụkwọ.+ O wee bilie n’isi ụtụtụ wuo ebe ịchụàjà n’ala ala ugwu ahụ, wuokwa ogidi iri na abụọ bụ́ nke kwekọrọ n’ọnụ ọgụgụ ebo iri na abụọ nke Izrel.+  E mesịa, o zipụrụ ụmụ okorobịa bụ́ ụmụ Izrel, ha wee chụọ àjà nsure ọkụ, jirikwa oké ehi dị iche iche chụọrọ Jehova àjà nkịtị na àjà udo.+  Mozis wee were ọkara ọbara oké ehi ndị ahụ gbanye n’ọkwá,+ o fesara ọkara nke ọzọ fọdụrụ n’ime ọbara ahụ n’elu ebe ịchụàjà.+  N’ikpeazụ, o weere akwụkwọ ọgbụgba ndụ+ ahụ gụọ ná ntị ndị Izrel.+ Ha wee sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru, anyị ga-erubekwa isi.”+  Mozis wee were ọbara ahụ fesa ndị Izrel,+ sị: “Ihe a bụ ọbara nke ọgbụgba ndụ+ unu na Jehova gbaworo n’okwu a niile.”  Mozis na Erọn, Nedab na Abaịhu na mmadụ iri asaa n’ime ndị okenye Izrel wee gbagoo, 10  ha wee hụ Chineke Izrel.+ N’okpuru ụkwụ ya, e nwere ihe dị ka ihe e ji mbadamba nkume safaya mee, nke dị ọcha ka eluigwe.+ 11  Ma o setịpụghị aka ya megide ndị ikom ahụ a na-akwanyere ùgwù n’etiti ụmụ Izrel,+ kama ha hụrụ ezi Chineke n’ọhụụ,+ riekwa nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ.+ 12  Jehova wee sị Mozis: “Gbagote bịakwute m n’ugwu, nọrọkwa na ya, n’ihi na m chọrọ inye gị mbadamba nkume na iwu na ntụziaka m ga-ede iji zie ha ihe.”+ 13  Mozis na Jọshụa onye ozi ya wee bilie, Mozis wee gbagoo n’ugwu nke ezi Chineke.+ 14  Ma ọ gwara ndị okenye ahụ, sị: “Cherenụ anyị n’ebe a ruo mgbe anyị ga-alọghachikwute unu.+ Lee! Erọn na Họọ+ so unu nọrọ. Onye ọ bụla nke nwere okwu ikpe, ya gakwuru ha.”+ 15  Mozis wee gbagoo n’ugwu ahụ ka ígwé ojii kpuchiri ugwu ahụ.+ 16  Ebube Jehova+ wee dịgide n’Ugwu Saịnaị,+ ígwé ojii wee kpuchie ya ruo ụbọchị isii. N’ikpeazụ, n’ụbọchị nke asaa, o si n’ígwé ojii kpọọ Mozis.+ 17  N’anya ụmụ Izrel, ebube Jehova dị ka ọkụ na-erepịa ihe+ n’elu ugwu ahụ. 18  Mozis wee banye n’ime ígwé ojii ahụ ma gbagoo n’ugwu ahụ.+ Mozis wee nọgide n’ugwu ahụ ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji