Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọpụpụ 11:1-10

11  Jehova wee gwa Mozis, sị: “M gaje iti Fero na Ijipt otu ihe otiti ọzọ. E mesịa, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.+ N’oge ọ ga-ahapụ unu kpamkpam ka unu laa, ọ ga na-achụ unu achụ ka unu si n’ebe a pụọ.+  Ugbu a, kwuo okwu ná ntị ndị m, ka nwoke ọ bụla na nwaanyị ọ bụla n’ime ha rịọ onye agbata obi ya ka o nye ya ihe e ji ọlaọcha mee na ihe e ji ọlaedo mee.”+  Jehova wee mee ka ndị Izrel nweta ihu ọma ndị Ijipt.+ Nwoke ahụ bụ́ Mozis bụ nnọọ nnukwu mmadụ n’ala Ijipt, n’anya ndị na-ejere Fero ozi nakwa n’anya ndị Ijipt.+  Mozis wee sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘N’ihe dị ka n’etiti abalị, m ga-apụ banye n’etiti Ijipt,+  nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt ga-anwụ,+ malite n’ọkpara Fero bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ruo n’ọkpara nwaanyị na-eje ozi bụ́ onye na-egwe ihe na nkume igwe nri nakwa nwa anụ ụlọ ọ bụla e bu ụzọ mụọ.+  Oké mkpu ákwá ga-ada n’ala Ijipt dum, nke ụdị ya na-adatụbeghị, nke ọ na-enweghịkwa mgbe ụdị ya ga-ada ọzọ.+  Ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel nkịta ga-agbọ ụja, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ;+ ka unu wee mara na Jehova nwere ike ịkpa ókè n’agbata ndị Ijipt na ụmụ Izrel.’+  Ndị a niile na-ejere gị ozi ga-agbadata bịakwute m wee daara m n’ala,+ sị, ‘Gawa, gị na ndị niile na-agbaso nzọụkwụ gị.’ E mesịa, m ga-agawa.” O wee jiri oké iwe si n’ebe Fero nọ pụọ.  Jehova wee gwa Mozis, sị: “Fero agaghị ege unu ntị,+ ka ọrụ ebube m wee mụbaa n’ala Ijipt.”+ 10  Mozis na Erọn rụkwara ọrụ ebube ndị a niile n’ihu Fero;+ ma Jehova kwere ka obi Fero kpọchie, nke mere na ọ hapụghị ụmụ Izrel ka ha si n’ala ya pụọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji