Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 32:1-42

32  Ụmụ Ruben+ na ụmụ Gad+ wee nwee ìgwè anụ ụlọ, anụ ụlọ ha dị nnọọ ọtụtụ n’ezie. Ha wee hụ ala Jeza+ na ala Gilied, ma, lee! ọ bụ ebe ịzụ anụ ụlọ.  N’ihi ya, ụmụ Gad na ụmụ Ruben bịara gwa Mozis na Elieza onye nchụàjà na ndị isi nzukọ ahụ, sị:  “Atarọt+ na Daịbọn+ na Jeza na Nimra+ na Heshbọn+ na Iliele+ na Sibam na Nibo+ na Bion,+  bụ́ ala Jehova meriri+ n’ihu nzukọ Izrel, bụ ala ịzụ anụ ụlọ, ndị ohu gị nwekwara anụ ụlọ.”+  Ha wee gaa n’ihu ịsị: “Ọ bụrụ na ihe anyị masịrị gị, ka e nye ndị ohu gị ala a ka ọ bụrụ nke ha. Emela ka anyị gafee Jọdan.”+  Mozis wee gwa ụmụ Gad na ụmụ Ruben, sị: “Ùnu ga-ebi ebe a ụmụnne unu agawa agha?+  Gịnị mere unu ga-eji kụda ụmụ Izrel obi ka ha ghara ịgafere banye n’ala ahụ Jehova ga-enye ha?  Otú ahụ ka nna unu hà mere+ mgbe m si na Kedesh-bania+ zipụ ha ka ha gaa hụ ala ahụ.  Mgbe ha ruru na ndagwurugwu Eshkọl+ wee hụ ala ahụ, ha kụdara ụmụ Izrel obi, ka ha ghara ịbanye n’ala ahụ Jehova gaje inye ha.+ 10  Iwe Jehova wee dị ọkụ n’ụbọchị ahụ, o wee ṅụọ iyi,+ sị: 11  ‘Ndị ikom ndị si n’Ijipt pụta, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe,+ agaghị ahụ ala ahụ m ṅụụrụ Ebreham, Aịzik na Jekọb n’iyi,+ n’ihi na ha esoghị m n’ụzọ zuru ezu, 12  ma e wezụga Keleb+ nwa Jefọne onye Kinaz, na Jọshụa+ nwa Nọn, n’ihi na ha soro Jehova n’ụzọ zuru ezu.’ 13  Jehova wee weso Izrel iwe dị ọkụ, o wee mee ka ha wagharịa n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ,+ ruo mgbe ọgbọ ahụ dum nke nọ na-eme ihe ọjọọ n’anya Jehova nwụchara.+ 14  Lee, unu anọchiwo nna unu hà dị ka ụmụ ndị ajọ omume iji mee ka iwe Jehova+ na-eweso Izrel dịkwuo ọkụ. 15  Ọ bụrụ na unu akwụsị iso ya,+ ọ ga-eme ọzọ ka ha nọtụkwuo n’ala ịkpa,+ unu ewee kpatara ndị a niile mbibi.”+ 16  E mesịa, ha bịaruru ya nso wee sị: “Ka anyị jiri nkume gbaara anụ ụlọ anyị ogige, wuokwara ụmụntakịrị anyị obodo. 17  Ma anyị onwe anyị ga-ejikere soro ná ndị na-ebu agha+ n’ihu ụmụ Izrel ruo mgbe ọ bụla anyị kpọgara ha n’obodo ha, ma ụmụntakịrị anyị ga-ebi n’obodo e wusiri ike ka ndị bi n’ala a ghara imetụ ha aka. 18  Anyị agaghị alaghachi n’ụlọ anyị ruo mgbe ụmụ Izrel nwetara ala, onye nke ọ bụla ewee nweta ihe nketa nke ya.+ 19  N’ihi na anyị agaghị eso ha nweta ihe nketa malite n’ofe Jọdan gawa, n’ihi na anyị enwetawo ihe nketa n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan.”+ 20  Mozis wee sị ha: “Ọ bụrụ na unu ga-eme ihe a, ọ bụrụ na unu ga-ejikere n’ihu Jehova ịga agha,+ 21  onye ọ bụla n’ime unu nke jikeere ewee gafee Jọdan n’ihu Jehova, ruo mgbe ọ chụpụrụ ndị iro ya n’ihu ya,+ 22  e wee merie ala ahụ n’ihu Jehova,+ e mesịa unu alọghachi,+ n’ezie, unu ga-abụ ndị ikpe na-amaghị n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe Izrel nọ; ala a ga-aghọkwa nke unu n’ihu Jehova.+ 23  Ma ọ bụrụ na unu emeghị otú a, unu emehiewo Jehova.+ Mgbe ahụ, maranụ na unu ga-ata ahụhụ mmehie unu.+ 24  Wuoronụ onwe unu obodo maka ụmụntakịrị unu, jirikwanụ nkume gbaara ìgwè ewu na atụrụ unu ogige, meekwanụ ihe si n’ọnụ unu pụta.”+ 25  Ụmụ Gad na ụmụ Ruben wee gwa Mozis, sị: “Ndị ohu gị ga-eme nnọọ dị ka onyenwe m na-enye anyị n’iwu.+ 26  Ụmụntakịrị anyị, ndị nwunye anyị, anụmanụ anyị na anụ ụlọ anyị niile ga-anọrọ n’ebe ahụ n’obodo ndị dị na Gilied,+ 27  ma ndị ohu gị, bụ́ onye ọ bụla a kwadebere ka o soro ná ndị agha,+ ga-agabiga n’ihu Jehova ịga agha, dị nnọọ ka onyenwe m kwuru.” 28  Mozis wee nye Elieza onye nchụàjà na Jọshụa nwa Nọn na ndị isi nke ndị bụ́ nna n’ebo dị iche iche nke ụmụ Izrel iwu banyere ha. 29  Mozis wee sị ha: “Ọ bụrụ na ụmụ Gad na ụmụ Ruben, onye ọ bụla a kwadebere ịga agha,+ esoro unu gabiga Jọdan n’ihu Jehova, e wee merie ala ahụ n’ihu unu, unu ga-enye ha ala Gilied ka ọ bụrụ nke ha.+ 30  Ma ọ bụrụ na ha akwadebeghị wee soro unu gabiga, a ga-eme ka ha biri n’etiti unu n’ala Kenan.”+ 31  Ụmụ Gad na ụmụ Ruben wee zaa, sị: “Ihe Jehova gwara ndị ohu gị bụ ihe anyị ga-eme.+ 32  Anyị onwe anyị ga-akwadebe gafere ruo ala Kenan+ n’ihu Jehova, ala anyị ga-eketa ga-adịrị anyị n’akụkụ a nke Jọdan.”+ 33  Mozis wee nye ụmụ Gad+ na ụmụ Ruben+ na ọkara ebo Manase+ nwa Josef ala nke Saịhọn+ bụ́ eze Amọraịt chịrị na ala nke Ọg+ bụ́ eze Beshan chịrị, ya bụ, ala nke obodo ndị dị n’ókèala ha, tinyere obodo ndị gbara ala ahụ gburugburu. 34  Ụmụ Gad wee wuo Daịbọn+ na Atarọt+ na Aroa,+ 35  na Atrọt-shofan na Jeza+ na Jọg-beha,+ 36  na Bet-nimra+ na Bet-heran,+ bụ́ obodo ndị e wusiri ike,+ ndị e ji nkume gbaa ogige anụ ụlọ ha.+ 37  Ụmụ Ruben wee wuo Heshbọn+ na Iliele+ na Kiriateyim,+ 38  na Nibo+ na Bel-mion+—a gbanwere aha ha agbanwe—tinyere Sibma; ha wee gụọ obodo ndị ahụ ha wuru aha ha. 39  Ụmụ Mekia+ nwa Manase wee garuo Gilied weghara ya ma chụpụ ndị Amọraịt bi ya. 40  Mozis wee were Gilied nye Mekia nwa Manase, o wee biri na ya.+ 41  Jeya nwa Manase wee gaa weghara obodo ụlọikwu ha, o wee gụọ ha Havọt-jeya.+ 42  Noba wee gaa weghara Kinat+ na obodo nta ya niile; o wee gụọ ya aha ya nke bụ́ Noba.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji