Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 25:1-18

25  Ka ọ dị ugbu a, Izrel bi na Shitim.+ Ha na ndị inyom Moab wee malite inwe mmekọahụ rụrụ arụ.+  Ndị inyom ahụ wee bịa kpọọ ndị Izrel ka ha bịa maka àjà ha na-achụrụ chi ha,+ ndị Izrel wee malite iri ihe oriri na ịkpọrọ chi ha isiala.+  Izrel wee rapara n’ahụ́ Bel nke Piọ;+ Jehova wee weso Izrel iwe dị ọkụ.+  N’ihi ya, Jehova gwara Mozis, sị: “Kpọrọ ndị isi niile nke ndị m ma gbaa ozu ha n’anwụ n’ihu Jehova,+ ka iwe dị ọkụ Jehova na-eweso Izrel dajụọ.”  Mozis wee sị ndị ikpe Izrel:+ “Onye ọ bụla n’ime unu ya gbuo+ ndị ikom ya bụ́ ndị rapaara n’ahụ́ Bel nke Piọ.”  Ma, lee! otu nwoke+ n’ime ụmụ Izrel bịara, ọ kpọkwa nwaanyị+ Midian na-abịa nso n’ebe ụmụnne ya nọ n’ihu Mozis nakwa n’ihu nzukọ ụmụ Izrel dum, ka ha nọ na-akwa ákwá n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.  Mgbe Finihas+ nwa Elieza nwa Erọn onye nchụàjà hụrụ ya, o biliri ozugbo n’etiti nzukọ ahụ ma were ube.  O wee sochie nwoke Izrel ahụ azụ wee banye n’ụlọikwuu ahụ magbuo ha abụọ, nwoke Izrel ahụ na nwaanyị ahụ, ube ahụ wee si n’ihe o ji bụrụ nwaanyị gafere. E wee kwụsị ihe otiti ahụ a na-eti ụmụ Izrel.+  Ndị nwụrụ n’ihe otiti ahụ wee dịrị puku mmadụ iri abụọ na anọ.+ 10  Jehova wee gwa Mozis, sị: 11  “Finihas+ nwa Elieza bụ́ nwa Erọn onye nchụàjà emewo ka iwe+ m na-eweso Izrel dajụọ site n’ekweghị ka a maa m aka n’etiti ha,+ nke mere na ekpochapụghị m ụmụ Izrel ka m nọgidesiri ike na-achọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.+ 12  N’ihi nke ahụ, kwuo, sị, ‘Lee, mụ na ya ga-agba ọgbụgba ndụ udo. 13  Ọ ga-abụrụ ya na ụmụ ya ga-anọchi ya+ ọgbụgba ndụ nke ịbụ ndị nchụàjà ruo mgbe a na-akaghị aka, n’ihi na o kweghị ka a maa Chineke ya aka,+ o wee kpuchiere ụmụ Izrel mmehie ha.’”+ 14  Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwaanyị Midian ahụ bụ Zimraị nwa Selu, otu n’ime ndị isi+ ọnụmara ụmụ Simiọn. 15  Aha nwaanyị Midian ahụ e gburu bụ Kọzbaị nwa Zọọ;+ Zọọ bụ onyeisi ọnụmara ụlọ nna ya n’obodo Midian.+ 16  E mesịa, Jehova gwara Mozis, sị: 17  “Wakponụ ndị Midian, gbuokwanụ ha,+ 18  n’ihi na ha ji omume aghụghọ+ ha wakpo unu, bụ́ nke ha ji aghụghọ meso unu n’ihe ahụ mere na Piọ+ nakwa n’ihe metụtara Kọzbaị+ nwa otu onyeisi na Midian, bụ́ nwanne ha nwaanyị onye e gburu+ n’ụbọchị ihe otiti ahụ e tiri n’ihi ihe ahụ mere na Piọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji