Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 24:1-25

24  Mgbe Belam hụrụ na ọ dị mma n’anya Jehova ịgọzi Izrel, o sighị n’ebe ahụ pụọ dị ka ọ na-emebu+ ịga chọta mgbaàmà ihe ọjọọ,+ kama o chere ihu n’ala ịkpa.  Mgbe Belam lepụrụ anya hụ ka Izrel bi n’ụlọikwuu n’ebo n’ebo,+ mmụọ Chineke dakwasịrị ya.+  O wee jiri ilu malite ikwu,+ sị: “Nke a bụ ihe Belam nwa Biọ kwuru, Ihe dimkpa a na-ekechighị anya ya ekechi+ kwuru,   Ihe onye na-anụ okwu Chineke kwuru,+ Onye hụrụ ọhụụ nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ Onye anya ya na-emechighị emechi mgbe ọ na-ada:+  Lee ka ụlọikwuu gị si maa mma, Jekọb, ee, ebe obibi gị, Izrel!+  Dị ka ndagwurugwu, ọ gbatịpụrụ ruo ebe dị anya,+ Dị ka ubi ndị dị n’akụkụ osimiri.+ Dị ka ahịhịa alo nke Jehova kụrụ, Dị ka osisi sida ndị dị n’akụkụ mmiri.+   Mmiri si na bọket ya abụọ e ji akpụkpọ anụ mee na-atapụsị, Mkpụrụ ya dịkwa n’akụkụ ọtụtụ mmiri.+ Eze+ ya ga-akakwa Egag+ ukwuu, A ga-ebulikwa alaeze ya elu.+   Chineke si n’Ijipt na-akpọpụta ya; Ọ na-awụ ọsọ dị ka atụ́.+ Ọ ga-eripịa mba dị iche iche, bụ́ ndị na-emegbu ya,+ Ọ ga-atapịa+ ọkpụkpụ ha, ọ ga-eji akụ́ ya gbarie ha.+   O huuru ehuru, ọ makpu dị ka ọdụm, Dịkwa ka ọdụm, ònye ga-anwa anwa kpọtee ya?+ Ndị na-agọzi gị bụ ndị a gọziri agọzi,+ Ndị na-abụ gị ọnụ bụ ndị a bụrụ ọnụ.”+ 10  Belak wee weso Belam iwe dị ọkụ wee kụọ aka,+ Belak wee gaa n’ihu ịsị Belam: “Ọ bụ ka ị bụọ ndị iro m ọnụ+ mere m ji kpọọ gị, ma, lee! ị gọziwo ha gabiga ókè ugboro atọ a. 11  Ugbu a, gbara lawa n’obodo gị. Ekwuru m na aghaghị m ịkwanyere gị ùgwù,+ ma, lee! Jehova egbochiwo gị inweta nkwanye ùgwù.” 12  Belam wee sị Belak: “Ọ̀ bụ na mụ asịghị ndị ozi gị i zipụrụ ka ha bịakwute m, 13  ‘Ọ bụrụ na Belak enye m ụlọ ya nke ọlaọcha na ọlaedo juru, agaghị m enwe ike ịda iwu Jehova wee mee ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ site n’obi m. Ọ bụ ihe ọ bụla Jehova ga-agwa m ka m ga-ekwu’?+ 14  Lee, alawala m ka m lakwuru ndị m. Bịa ka m gwa gị+ ihe ndị a ga-emesị mee ndị gị ná ngwụsị ụbọchị ndị a.”+ 15  O wee jiri ilu malite ikwu,+ sị: “Nke a bụ ihe Belam nwa Biọ kwuru, Ihe dimkpa a na-ekechighị anya ya ekechi+ kwuru, 16  Ihe onye na-anụ okwu Chineke kwuru,+ Onye nwe ihe ọmụma nke Onye Kasị Elu— Ọ hụrụ ọhụụ+ nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, Anya ya emechighị emechi mgbe ọ na-ada:+ 17  M ga-ahụ ya,+ ma ọ bụghị ugbu a; M ga-ahụ ya, ma ọ bụghị n’ebe dị nso. Kpakpando+ ga-esi na Jekọb pụta, Mkpanaka eze ga-esikwa n’Izrel pụta.+ Ọ ga-etiwa agba ntị abụọ nke Moab,+ Tiwaakwa okpokoro isi nke ụmụ mbibi niile. 18  Idọm ga-aghọ ihe nketa,+ Ee, Sia+ ga-aghọkwa ihe nketa nke ndị iro ya,+ Mgbe Izrel na-egosi obi ike ya. 19  Otu onye ga-esi na Jekọb pụta wee na-enwe mmeri,+ Ọ ga-ebibi onye ọ bụla fọdụrụ n’obodo ahụ.”+ 20  Mgbe ọ hụrụ Amalek, ọ gara n’ihu iji ilu kwuo, sị:+ “Amalek bụ mba mbụ n’ime mba dị iche iche,+ Ma e mesịa, ikpeazụ ya ga-abụ ịla n’iyi.”+ 21  Mgbe ọ hụrụ ndị Kenaịt,+ ọ gara n’ihu iji ilu kwuo, sị: “Ebe obibi gị na-adịgide adịgide, e wuru ebe obibi gị n’elu nkume dị elu. 22  Ma a ga-enwe onye ga-agba Keyin+ ọkụ. Gịnị ka ọ fọdụrụ Asiria ewee dọrọ gị n’agha?”+ 23  O wee gaa n’ihu iji ilu kwuo, sị: “Ewoo! Ònye ga-alanahụ mgbe Chineke ga-eme ya?+ 24  Ụgbọ mmiri ga-esi n’ụsọ osimiri Kitim+ bịa, Ha ga-emekpa Asiria ahụ́,+ Ha ga-emekpakwa Iba ahụ́. Ma ya onwe ya ga-emesị laa n’iyi.” 25  E mesịa, Belam biliri lawa.+ Belak lawakwara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji