Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 2:1-34

2  Jehova wee gwa Mozis na Erọn, sị:  “Onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe ìgwè+ ya nke ebo atọ mejupụtara mara, n’akụkụ ihe ịrịba ama nke ụlọ ndị nna ha. Ha ga-ama ụlọikwuu ha gburugburu ụlọikwuu nzute, cheekwa ya ihu.  “Ndị ga-ama ụlọikwuu n’ebe ọwụwa anyanwụ bụ ìgwè nke Juda nke ebo atọ mejupụtara, n’ụsụụ ha, onyeisi ụmụ Juda bụ Nashọn+ nwa Aminadab.  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri asaa na anọ na narị isii.+  Ndị ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ ya bụ ebo Ịsaka,+ onyeisi ụmụ Ịsaka bụ Netanel+ nwa Zua.  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri ise na anọ na narị anọ.+  Ebo nke ọzọ bụ ebo Zebulọn; onyeisi ụmụ Zebulọn bụ Elayab+ nwa Hilọn.  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri ise na asaa na narị anọ.+  “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ìgwè nke Juda dị otu narị puku, iri puku asatọ na isii na narị anọ, n’ụsụụ ha. Ha ga-abụ ndị mbụ+ ga na-akwali. 10  “Ìgwè nke ebo atọ mejupụtara, bụ́ ìgwè nke Ruben,+ n’ụsụụ ha, ga-ama ụlọikwuu n’ebe ndịda, onyeisi ụmụ Ruben bụ Elaịzọ+ nwa Shedeọ. 11  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri anọ na isii na narị ise.+ 12  Ndị ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ ya bụ ebo Simiọn, onyeisi ụmụ Simiọn bụ Shelumiel+ nwa Zurishadaị. 13  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri ise na itoolu na narị atọ.+ 14  Ebo nke ọzọ bụ ebo Gad; onyeisi ụmụ Gad bụ Elayasaf+ nwa Ruel. 15  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri anọ na ise, narị isii na iri ise.+ 16  “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ìgwè nke Ruben dị otu narị puku, iri puku ise na otu, narị anọ na iri ise, n’ụsụụ ha, ha ga-abụ ndị nke abụọ ga na-akwali.+ 17  “Mgbe unu ga-eburu ụlọikwuu nzute+ kwalie, ụlọikwuu ndị Livaị+ ga-adị n’etiti ebe ndị ọzọ mara ụlọikwuu. “Otú ha si maa ụlọikwuu ka ha ga-esi na-akwali,+ onye nke ọ bụla n’ebe ọ mara ụlọikwuu, dị ka ìgwè ha nke ebo atọ mejupụtara si dị. 18  “Ìgwè nke ebo atọ mejupụtara, bụ́ ìgwè nke Ifrem,+ n’ụsụụ ha, ga-ama ụlọikwuu n’ebe ọdịda anyanwụ, onyeisi ụmụ Ifrem bụ Elishama+ nwa Amaịhọd. 19  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri anọ na narị ise.+ 20  Ebo Manase+ ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ ya, onyeisi ụmụ Manase bụ Gameliel+ nwa Pedazọ. 21  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri atọ na abụọ na narị abụọ.+ 22  Ebo nke ọzọ bụ ebo Benjamin;+ onyeisi ụmụ Benjamin bụ Abidan+ nwa Gidionaị. 23  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri atọ na ise na narị anọ.+ 24  “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ìgwè nke Ifrem dị otu narị puku, puku asatọ na otu narị, n’ụsụụ ha, ha ga-abụ ndị nke atọ ga na-akwali.+ 25  “Ìgwè nke ebo atọ mejupụtara, bụ́ ìgwè nke Dan, n’ụsụụ ha, ga-ama ụlọikwuu n’ebe ugwu, onyeisi ụmụ Dan bụ Ahayiza+ nwa Amishadaị. 26  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri isii na abụọ na narị asaa.+ 27  Ndị ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ ya bụ ebo Asha, onyeisi ụmụ Asha bụ Pegiel+ nwa Ọkran. 28  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri anọ na otu na narị ise.+ 29  Ebo ọzọ bụ ebo Naftalaị;+ onyeisi ụmụ Naftalaị bụ Ahaịra+ nwa Inan. 30  Ndị agha ya, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri ise na atọ na narị anọ.+ 31  “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ìgwè nke Dan dị otu narị puku, iri puku ise na asaa na narị isii. Ha ga-abụ ndị ikpeazụ+ ga na-akwali—dị ka ìgwè ha nke ebo atọ mejupụtara si dị.” 32  Ọ bụ ndị a bụ ụmụ Izrel e debara aha ha n’akwụkwọ dị ka ụlọ ndị nna ha si dị; ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ìgwè ahụ, n’ụsụụ ha, dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise.+ 33  Ma e debaghị aha ndị Livaị n’akwụkwọ+ mgbe e debara aha ụmụ Izrel, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu. 34  Ụmụ Izrel wee mee ihe niile Jehova nyere Mozis n’iwu.+ Ọ bụ otú ahụ ka ha si maa ụlọikwuu ha n’ìgwè+ dị iche iche ebo atọ mejupụtara, ọ bụkwa otú ahụ ka ha si na-akwali,+ onye ọ bụla n’ezinụlọ ya, dị ka ụlọ ndị nna ya si dị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji