Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 18:1-32

18  Jehova wee gwa Erọn, sị: “Gị na ụmụ gị ndị ikom na ụlọ nna gị ga-aza ajụjụ mgbe e mebiri iwu na-achị ebe nsọ ahụ,+ gị na ụmụ gị ndị ikom ga-azakwa ajụjụ mgbe e mebiri iwu na-achị ọrụ unu dị ka ndị nchụàjà.+  Kpọrọkwa ụmụnne gị ndị si n’ebo Livaị, bụ́ ọnụmara nna gị, bịa nso, ka ha sonyere gị wee na-ejere gị ozi,+ na-ejere ma gị onwe gị ma ụmụ gị ozi, n’ihu ụlọikwuu Ihe Àmà.+  Ha ga na-arụ ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ gị na ọrụ ha kwesịrị ịrụ n’ụlọikwuu ahụ dum.+ Ọ bụ naanị na ha agaghị abịaru arịa ndị dị n’ebe nsọ ahụ nso, ha agaghịkwa abịa nso n’ebe ịchụàjà ahụ ka ha ghara ịnwụ,+ ma ha ma unu onwe unu.  Ha ga-esonyere gị, ha ga na-arụkwa ọrụ ha kwesịrị ịrụ n’ụlọikwuu nzute n’ihe metụtara ozi niile a na-eje n’ụlọikwuu ahụ, onye nkịtị agaghị abịa unu nso.+  Unu ga na-arụkwa ọrụ unu kwesịrị ịrụ n’ebe nsọ ahụ,+ na ọrụ unu kwesịrị ịrụ n’ebe ịchụàjà ahụ,+ ka m ghara iweso ụmụ Izrel iwe+ ọzọ.  Lee! Mụ onwe m esiwo n’etiti ụmụ Izrel+ kpọrọ ụmụnne unu, bụ́ ndị Livaị, ka ha bụụrụ unu onyinye,+ dị ka ndị e nyere Jehova ka ha na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute.+  Gị na ụmụ gị ga-echekwa ọrụ unu na-arụ dị ka ndị nchụàjà n’ihe ọ bụla metụtara ebe ịchụàjà nakwa n’ihe metụtara ihe dị n’ime ákwà mgbochi ahụ;+ unu ga na-eje ozi.+ M ga-enye unu ọrụ ịbụ ndị nchụàjà dị ka onyinye, onye nkịtị nke bịara nso, a ga-egbu ya.”+  Jehova wee gwa Erọn okwu ọzọ, sị: “Lee, mụ onwe m enyewo gị ọrụ ịhụ maka onyinye a na-enye m.+ Ọ bụ ya bụ òkè m nyere gị na ụmụ gị n’ime ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel, ka ọ bụrụ òkè unu ruo mgbe a na-akaghị aka.+  Nke a ga-abụ nke gị n’ime ihe ndị kasị nsọ, n’ime àjà a na-esure n’ọkụ, onyinye ha ọ bụla, ya na àjà ọka+ ha ọ bụla na àjà mmehie+ ha ọ bụla na àjà ikpe ọmụma+ ha ọ bụla, bụ́ ndị ha ga na-ewetara m. Ọ ga-abụrụ gị na ụmụ gị ihe kasị nsọ. 10  Ọ bụ n’ebe dị nnọọ nsọ ka ị ga-eri ya.+ Onye ọ bụla bụ́ nwoke ga-eri ya.+ Ọ ga-abụrụ gị ihe dị nsọ.+ 11  Nke a bụ nke gị: onyinye+ ha n’ime ihe ha na-eweta, tinyere àjà niile a na-efegharị efegharị+ nke ụmụ Izrel. Ọ bụ gị na ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom ka m nyere ihe ndị a,+ ka ha bụrụ òkè unu ruo mgbe a na-akaghị aka. Onye ọ bụla dị ọcha n’ụlọ gị pụrụ iri ya.+ 12  “Mmanụ niile kasị mma na mmanya ọhụrụ niile kasị mma nakwa ọka,* bụ́ mkpụrụ mbụ ha,+ ndị ha ga-enye Jehova, gị ka m nyere ha.+ 13  Mkpụrụ mbụ kara aka n’ime ihe niile dị n’ala ha, nke ha ga na-ewetara Jehova, ga-abụ nke gị.+ Onye ọ bụla nke dị ọcha nọ n’ụlọ gị nwere ike iri ya. 14  “Ihe niile bụ́ ihe a raara nye n’Izrel ga-abụ nke gị.+ 15  “Ihe niile nke meghere akpa nwa,+ nke ụdị anụ ahụ́ ọ bụla, ma mmadụ ma anụmanụ, nke ha ga-ewetara Jehova, ga-aghọ nke gị. Otú ọ dị, ị ghaghị ịgbara nwa mbụ mmadụ mụrụ agbara;+ ị ga-agbarakwa nwa mbụ anụmanụ na-adịghị ọcha mụrụ.+ 16  Ị ga-eji ọnụ ahịa mgbapụta ya gbara ya malite mgbe ọ dị otu ọnwa gbagowe, n’ọnụ ego e kwuru na ọ ga-abụ, bụ́ shekel ọlaọcha ise ma e jiri shekel ebe nsọ tụọ ya.+ Ọ bụ gira iri abụọ.+ 17  Ọ bụ naanị oké ehi e bu ụzọ mụọ ma ọ bụ ebule e bu ụzọ mụọ ma ọ bụ ewu e bu ụzọ mụọ ka ị na-agaghị agbara agbara.+ Ha bụ ihe dị nsọ. Ị ga-efesa ọbara+ ha n’elu ebe ịchụàjà, ị ga-esurekwa abụba ha n’ọkụ dị ka àjà a na-esure n’ọkụ ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ nye Jehova.+ 18  Anụ ha ga-abụkwa nke gị. Dị ka obi anụ àjà a na-efegharị efegharị nakwa dị ka ụkwụ aka nri ya, ha ga-abụ nke gị.+ 19  Onyinye+ niile dị nsọ, nke ụmụ Izrel ga na-enye Jehova, ka m nyere gị na ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom, ka ọ bụrụ òkè unu ruo mgbe a na-akaghị aka.+ Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ruo mgbe a na-akaghị aka n’ihu Jehova maka gị na ụmụ gị.”+ 20  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Erọn, sị: “Ị gaghị enwe ihe nketa n’ala ha, ọ dịghịkwa òkè ị ga-enweta n’etiti ha.+ Abụ m òkè gị na ihe nketa gị n’etiti ụmụ Izrel.+ 21  “Lee, enyewo m ụmụ Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri+ ọ bụla n’Izrel ka ọ bụrụ ihe nketa maka ozi ha na-eje, bụ́ ozi ha na-eje n’ụlọikwuu nzute. 22  Ụmụ Izrel agaghịkwa abịarute ụlọikwuu nzute nso ka ha ghara ibutere onwe ha mmehie nke ga-eme ka ha nwụọ.+ 23  Ọ bụ ndị Livaị ga na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute, ọ bụkwa ha ga-aza ajụjụ maka njehie ha.+ Ọ bụ ụkpụrụ ga-adịru mgbe a na-akaghị aka n’ọgbọ unu niile, ya bụ, na ha agaghị enweta ihe nketa+ n’etiti ụmụ Izrel. 24  N’ihi na otu ụzọ n’ụzọ iri nke ụmụ Izrel ga na-enye Jehova dị ka onyinye ka m nyere ndị Livaị ka ọ bụrụ ihe nketa ha. Ọ bụ ya mere m ji sị ha, ‘Ha agaghị enweta ihe nketa+ n’etiti ụmụ Izrel.’” 25  Jehova wee gwa Mozis, sị: 26  “Gwa ndị Livaị okwu, sị ha, ‘Unu ga-anara ụmụ Izrel otu ụzọ n’ụzọ iri m nyere unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu,+ unu ga-esikwa na ya nye Jehova otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ụzọ n’ụzọ iri+ ahụ ka ọ bụrụ onyinye. 27  A ga-agụkwara ya unu dị ka onyinye unu, dị ka ọka nke si n’ebe nzọcha mkpụrụ+ nakwa dị ka ihe dị ukwuu e mepụtara n’ebe nzọchapụta mmanya ma ọ bụ n’ebe nzọchapụta mmanụ. 28  Unu onwe unu ga-esi otú a nye Jehova onyinye site n’otu ụzọ n’ụzọ iri niile unu ga na-anata ụmụ Izrel, unu ga-esi na ha nye Erọn onye nchụàjà onyinye Jehova. 29  Ọ bụ n’onyinye niile a na-enye unu ka unu ga-esi nye Jehova ụdị onyinye ọ bụla, bụ́ nke kasị mma n’ime ya,+ dị ka ihe dị nsọ site na ha.’ 30  “Sịkwa ha, ‘Mgbe unu nyere ihe kasị mma n’ime ha n’onyinye,+ a ga-agụrụ ya ndị Livaị dị ka mkpụrụ nke ebe nzọcha mkpụrụ nakwa dị ka ihe e mepụtara n’ebe nzọchapụta mmanya ma ọ bụ mmanụ. 31  Rienụ ya n’ebe ọ bụla, unu na ezinụlọ unu, n’ihi na ọ bụ ụgwọ ọrụ unu maka ozi unu na-eje n’ụlọikwuu nzute.+ 32  Unu agaghị ebutere onwe unu mmehie n’ihi ya ma ọ bụrụ na unu enye ihe kasị mma n’ime ha n’onyinye, unu emerụkwala ihe nsọ nke ụmụ Izrel, ka unu wee ghara ịnwụ.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọg 18:12*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.