Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 14:1-45

14  Nzukọ ahụ dum wee malite ibe ákwá, ha wee na-eti mkpu, na-akwakwa ákwá+ n’abalị ahụ dum.  Ụmụ Izrel niile wee malite ịtamu ntamu megide Mozis na Erọn,+ nzukọ ahụ dum wee malite ikwu okwu megide ha, sị: “A sị nnọọ na anyị nwụrụ n’ala Ijipt, ma ọ bụ, a sị nnọọ na anyị nwụrụ n’ala ịkpa a!  Gịnị mere Jehova ji kpọrọ anyị na-abịa n’ala a ka e jiri mma agha gbuo anyị?+ A ga-achịkọrọ+ ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị. Ọ́ kaghị mma ka anyị laghachi n’Ijipt?”+  Ha gwara ibe ha, sị: “Ka anyị mee otu onye onyeisi, ka anyị laghachikwa n’Ijipt!”+  Mozis na Erọn wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala,+ n’ihu ọgbakọ dum nke nzukọ ụmụ Izrel.  Jọshụa nwa Nọn+ na Keleb nwa Jefọne,+ bụ́ ndị so ná ndị gara ledo ala ahụ, wee dọwaa uwe ha,+  ha wee gwa nzukọ ụmụ Izrel dum, sị: “Ala ahụ anyị gara ledo bụ nnọọ ezi ala.+  Ọ bụrụ na ihe anyị dị Jehova mma,+ ọ ga-akpọba anyị n’ala a wee nye anyị ya, bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.+  Ma, unu enupụrụla Jehova isi;+ unu atụla ndị ala ahụ egwu,+ n’ihi na ha bụụrụ anyị ihe oriri. Ihe nchebe ha adịkwaghị,+ Jehova nọnyeere anyị.+ Unu atụla ha egwu.”+ 10  Otú ọ dị, nzukọ ahụ dum kwuru ka a tụọ ha nkume.+ Ebube Jehova wee pụta ìhè n’ụlọikwuu nzute, n’ihu ụmụ Izrel niile.+ 11  N’ikpeazụ, Jehova gwara Mozis, sị: “Ruo ole mgbe+ ka ndị a ga na-akparị m,+ ruokwa ole mgbe ka ha ga-anọ na-abụ ndị na-enweghị okwukwe n’ebe m nọ n’agbanyeghị ihe ịrịba ama niile m mere n’etiti ha?+ 12  Ka m tie ha ọrịa na-efe efe wee chụpụ ha, ka m meekwa ka ị bụrụ mba dị ukwuu, dịkwa ike karịa ha.”+ 13  Ma Mozis gwara Jehova, sị: “Ndị Ijipt, bụ́ ndị i ji ike gị si n’etiti+ ha dupụta ndị a, aghaghị ịnụ ya. 14  Ha aghaghịkwa ịkọrọ ya ndị bi n’ala a. Ha anụwo na gị onwe gị, Jehova, nọ n’etiti ndị a,+ gị onye pụtara ìhè n’etiti ha ihu na ihu.+ Ha anụwo na ị bụ Jehova, ígwé ojii gị dịkwa n’elu isi ha, ị na-eji ogidi ígwé ojii ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị.+ 15  Ọ bụrụ na i gbuchapụ ndị a otu mgbe,+ mba ndị nụrụ ude gị ga-ekwu, sị, 16  ‘Ihe mere Jehova ji gbuo ndị a n’ala ịkpa+ bụ na o nweghị ike ịkpọba ha n’ala nke ọ ṅụụrụ ha iyi inye ha.’ 17  Ugbu a, biko, Jehova, gosi ike gị dị ukwuu,+ dị nnọọ ka i kwuru, sị, 18  ‘Jehova, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye obiọma* ya dị ukwuu,+ onye na-agbaghara njehie na mmebi iwu,+ ma ọ gaghị anwa anwa hapụ inye ntaramahụhụ,+ ọ na-enye ndị bụ́ ụmụ ntaramahụhụ maka njehie ndị nna ha, na-enyekwa ọgbọ nke atọ na ọgbọ nke anọ.’+ 19  Biko, gbaghara njehie nke ndị a dị ka obiọma gị si dị ukwuu, dịkwa nnọọ ka ị gbaghaara ndị a malite n’Ijipt ruo ugbu a.”+ 20  Jehova wee sị: “Agbagharawo m ha dị ka i kwuru.+ 21  N’aka nke ọzọ, dị nnọọ ka m dị ndụ, ebube Jehova ga-ejupụta n’ụwa dum.+ 22  Ma ndị niile nọ na-ahụ ebube+ m na ihe ịrịba ama+ m mere n’Ijipt nakwa n’ala ịkpa ma nọrọ na-ele m ule+ ugboro iri a, gharakwa ige ntị n’olu m,+ 23  agaghị ahụ ala ahụ ma ọlị nke m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi inye ha, ee, ndị niile na-akparị m agaghị ahụ ya.+ 24  Ma ebe ọ bụ na ohu m Keleb+ nwere mmụọ dị iche, o wee na-eso m n’ụzọ zuru ezu,+ m ga-akpọba ya n’ala ahụ ọ gaworo, ụmụ ya ga-enwetakwa ya.+ 25  Ebe ọ bụ na ndị Amalek na ndị Kenan+ bi na ndagwurugwu a, tụgharịanụ echi kwalie gaa n’ala ịkpa nke dị n’ụzọ Oké Osimiri Uhie.”+ 26  Jehova wee gwa Mozis na Erọn, sị: 27  “Ruo ole mgbe ka nzukọ ọjọọ a ga na-atamu ntamu a ha na-atamu megide m?+ Anụwo m ntamu ụmụ Izrel na-atamu megide m.+ 28  Gwa ha, sị, “Dị nnọọ ka m dị ndụ,” ka Jehova kwuru, “unu ga-ahụ ma ọ̀ bụ na mụ agaghị eme unu kpọmkwem dị ka unu kwuru ná ntị m!+ 29  N’ala ịkpa a ka ozu unu ga-atọgbọrọ,+ ee, unu ndị tamuru ntamu megide m,+ ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime unu malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe. 30  Ma unu onwe unu agaghị abanye n’ala ahụ m weliri aka+ m ṅụọ iyi na mụ na unu ga-ebi n’ime ya, ma e wezụga Keleb nwa Jefọne na Jọshụa nwa Nọn.+ 31  “‘“Ụmụntakịrị unu, ndị unu sịrị na a ga-achịkọrọ,+ ọ bụ ha ka m ga-akpọba na ya, ha ga-amatakwa ala ahụ nke unu jụrụ.+ 32  Ma ozu unu onwe unu ga-atọgbọrọ n’ala ịkpa a.+ 33  Ụmụ unu ndị ikom ga-aghọ ndị na-azụ atụrụ n’ala ịkpa+ a ruo afọ iri anọ, ha aghaghịkwa ịza ajụjụ maka ịkwa iko+ unu, ruo mgbe ozu onye ọ bụla n’ime unu tọgbọọrọ n’ala ịkpa a.+ 34  Ụbọchị ole unu ledoro ala ahụ, bụ́ ụbọchị iri anọ,+ otu ụbọchị maka otu afọ, otu ụbọchị maka otu afọ,+ unu ga-aza ajụjụ maka njehie unu ruo afọ iri anọ,+ unu ga-amata ihe nkewapụ m ga-ekewapụ onwe m n’ebe unu nọ pụtara.+ 35  “‘“Mụ onwe m bụ́ Jehova ekwuwo ya na ọ bụ ihe a ka m na-aghaghị ime nzukọ+ ọjọọ a, bụ́ ndị zukọtara imegide m: N’ala ịkpa a ka ha ga-agwụ, n’ebe a kwa ka ha ga-anwụ.+ 36  Ndị ikom ahụ Mozis zipụrụ ka ha gaa ledo ala ahụ, bụ́ ndị malitere ime ka nzukọ a dum tamuwe ntamu megide m, site n’ikwu okwu ọjọọ banyere ala ahụ+ mgbe ha lọtara, 37  ee, ndị ikom ahụ kwuru okwu ọjọọ banyere ala ahụ ga-anwụ n’ihu Jehova n’ihi ihe otiti.+ 38  Ma n’ime ndị ikom ahụ gara ledo ala ahụ, ọ bụ Jọshụa nwa Nọn na Keleb nwa Jefọne ga-adị ndụ.”’”+ 39  Mgbe Mozis gwara ụmụ Izrel niile ihe ndị a, ha malitere iru uju nke ukwuu.+ 40  Ha bilikwara n’isi ụtụtụ wee nwaa ịgbago n’elu ugwu, sị, “Lee anyị, anyị ga-agbago ebe ahụ Jehova kwuru maka ya. N’ihi na anyị emehiewo.”+ 41  Ma Mozis kwuru, sị: “Gịnị mere unu ji na-ada iwu Jehova?+ Ma ọ gaghị agara unu nke ọma. 42  Unu agbagola, n’ihi na Jehova anọghị n’etiti unu, ka ndị iro unu wee ghara imeri unu.+ 43  N’ihi na ndị Amalek na ndị Kenan nọ n’ebe ahụ n’ihu unu;+ a ga-ejikwa mma agha gbuo unu, n’ihi na unu kwụsịrị iso Jehova, Jehova agaghị anọnyere unu.”+ 44  Otú ọ dị, ha ji mpako gbagoo n’elu ugwu ahụ,+ ma Mozis na igbe ọgbụgba ndụ Jehova esighị n’etiti ebe ha mara ụlọikwuu pụọ.+ 45  Ndị Amalek+ na ndị Kenan bụ́ ndị bi n’ugwu ahụ wee gbadata malite igbu ha, ha wee chụsasịa ha ruo Họma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọg 14:18*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”