Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?

 Isi nke 14

Ònye Bụ Onye Ozi Ala Ọzọ?

Ònye Bụ Onye Ozi Ala Ọzọ?

Amerịka

Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ọ dị na Patasịn

Panama

Ì nwere ike ịhapụ ndị ikwu gị gaa mba ọzọ ikwusa ozi ọma? Puku kwuru puku Ndịàmà Jehova na-eme otú ahụ. Ihe a ha na-eme yiri ihe ahụ Aịzaya onye amụma mere mgbe Jehova ziri ya ozi. Ọ sịrị: “Lee m! Ziga m.” (Aịzaya 6:8) Ha sikwa otú ahụ na-eme ihe Jizọs Kraịst mere. Ị manụ na Kraịst hapụrụ eluigwe bịa n’ụwa ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. N’ihi ya, e nwere ike ịsị na Jizọs bụ Onye Ozi Ala Ọzọ kacha ndị ozi ala ọzọ niile.—Jọn 7:29.

Ọ bụ onye na-eme ka Jizọs. Chineke zitere Jizọs n’ụwa ka ọ bịa soro ndị mmehie biri. Mgbe ọ bịara, ọ hụrụ na ndị mmadụ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi. Ma, ọ gaghị chọwa otú ọ ga-esi mee ka ihe niile gaziwe agazi. Kama, o lekwasịrị anya n’ozi ọma ọ bịara ikwusa n’ụwa. Ọ ma na ọ bụ naanị Alaeze ahụ ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha. (Luk 4:43) Ndịàmà Jehova, ndị a na-eziga ka ha gaa kwusaa ozi ọma n’ala ọzọ, na-eme otú ahụ Jizọs mere.

Ọ bụ onye na-ekwo maka ozi ọma eme ihe ndị ọ na-agaraghị eme. Onye ozi ala ọzọ ga-adị njikere ịga ebe omenala ha dị iche na nke obodo ya. E nwekwara ike, ụdị nri a na-eri n’obodo ha na ụdị ihe ndị dị n’obodo ha agaghị adị n’ebe ahụ a chọrọ iziga ya. N’agbanyeghị ihe a niile, ọ ga-ekweta ịga. Mgbe ụfọdụ, onye ozi ala ọzọ na-amụ asụsụ ndị ahụ ọ nọ n’obodo ha, ka o nwee ike iji ya na-ezi ha ozi ọma. E nweekwa ihe ọ bụla ndị ebe ahụ ji aga njem, ọ bụ ya ka ọ ga-eji na-aga ozi ọma ma ọ bụrụ na ọ gaghị ejili ụkwụ aga ebe dị anya. Ka onye ozi ala ọzọ nwee ike ime ihe a niile, ọ ga-ahụrịrị ndị ọ gara obodo ha n’anya.

A na-enye ndị na-aga ya ezigbote ọzụzụ. Ọtụtụ n’ime ndị ozi ala ọzọ na-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilied, bụ́ ebe a na-anọ enye ha ọzụzụ na-ewe ọnwa ise. Ihe ha na-amụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ na-eme ka okwukwe ha nwere na Jehova sikwuo ike. Ọ na-emekwa ka ha tụkwasị Baịbụl na ọgbakọ Jehova obi. (Ilu 3:5, 6) A na-akụzikwara ha ụdị àgwà ha kwesịrị ịna-akpa, ka ha nwee ike ịbụ ezigbo ndị ozi ala ọzọ. Ha na-amụkwa otú ha ga-esi na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl nke ọma. Ha gụchaa akwụkwọ n’ebe ahụ, obi na-esizi ha ike izisa ozi ọma “n’ebe kasị anya n’ụwa.”—Ọrụ Ndịozi 1:8.

  • Ònye bụ onye ozi ala ọzọ?

  • Olee ụlọ akwụkwọ pụrụ iche Ndịàmà Jehova chọrọ ịga ozi ala ọzọ na-aga?

GỤKWUO GBASARA YA

DOCUMENTARIES

Ndịàmà Jehova—Ndị A Haziri Ikwusa Ozi Ọma

A ma Ndịàmà Jehova ama na ha na-akụzi Baịbụl n’ụwa niile. Olee otú e si ahazi ọrụ a, olee otú e si eduzi ya, oleekwa ebe ha si enweta ego e ji arụ ya?

ALAEZE CHINEKE AMALITELA ỊCHỊ!

Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

Olee otú ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova sirila nyere anyị anyị aka ije ozi anyị nke ọma?