Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?

 Isi nke 17

Gịnị Bụ Ọrụ Ndị Nlekọta Sekit na Ndị Nlekọta Distrikti?

Gịnị Bụ Ọrụ Ndị Nlekọta Sekit na Ndị Nlekọta Distrikti?

Malawi

Ha na-ahazi ndị pụtara ozi ọma

Ha na-eso anyị aga ozi ọma

Ha na ndị okenye na-enwe nnọkọ

N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e kwuru ọtụtụ ihe gbasara Banabas na Pọl onyeozi. Ha bụ ndị okenye, ndị na-aga eleta ọgbakọ ndị e nwere n’oge ahụ. Gịnị mere ha ji aga eleta ha? Ọ bụ maka na ha chọrọ ka ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ na Chineke na-adị ná mma. Pọl gwara Banabas ka ha “laghachi gaa leta ụmụnna,” ka ha hụ otú ha mere. Ha abụọ kwo maka ileta ụmụnna ha gaa ebe ndị dị ezigbo anya. N’ọgbakọ ọ bụla ha ruru, ha agbaa ụmụnna ha ume ma mee ka okwukwe ha sikwuo ike. (Ọrụ Ndịozi 15:36) Ọ bụkwa otu ihe ahụ mere ndị anyị na-akpọ ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti ji aga eleta ọgbakọ anyị taa.

Ha na-abịa agba anyị ume. Onye nlekọta sekit bụ okenye nke na-aga eleta ihe dị ka ọgbakọ iri abụọ. Ọ na-eleta ọgbakọ nke ọ bụla ugboro abụọ n’afọ. Ọ na-anọkwa otu izu ma ọ gaa ileta ha. Onye nlekọta distrikti bụ okenye na-aga eleta ihe ruru sekit iri. Ọ na-eso onye nlekọta sekit eleta ọgbakọ. Ọ bụkwa ya na-abụ onyeisi oche n’afọ ọ bụla ma a gaa mgbakọ sekit. Anyị na-amụta ọtụtụ ihe n’aka ha nakwa n’aka ndị nwunye ha, ma ọ bụrụ na ha lụrụ nwaanyị. Ha na ndị nwunye ha na-agbalị ịmata ma ndị na-eto eto ma ndị agadi nọ n’ọgbakọ. Ha na-esokwa anyị aga ozi ọma. Ha na-eso ndị okenye aga eleta ụmụnna ndị e kwesịrị inyere aka. Ihe ndị ha na-akụziri anyị ma ha bịa ileta anyị na ihe ha na-akụzi ma anyị gaa mgbakọ na-agba anyị ume.—Ọrụ Ndịozi 15:35.

Ha hụrụ mmadụ niile nọ n’ọgbakọ n’anya. Ha na-enyere ọgbakọ aka ka ha na-eme nke ọma n’ofufe Chineke. Ha bịa ileta ọgbakọ, ha na ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-anọkọ leba anya n’otú ihe si na-aga. Ha na-agwakwa ha ihe ndị ha ga-eme ka ha nwee ike na-arụkwu ọrụ ha nke ọma. Ha na-agwa ndị ọsụ ụzọ ihe ndị ga-enyere ha aka ịna-aga ozi ha nke ọma. Ha na-agbakwa mbọ mata ndị ọhụrụ na-abịa ọmụmụ ihe anyị ma chọpụta otú ha si na-eme n’ọgbakọ. Ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti na-eji obi ha niile arụ ọrụ ha. Baịbụl kpọrọ ha ndị ọrụ ‘ibe anyị maka ọdịmma anyị.’ (2 Ndị Kọrịnt 8:23) Anyị kwesịrị iṅomi okwukwe ha.—Ndị Hibru 13:7.

  • Gịnị mere ndị nlekọta sekit na ndị nlekọta distrikti ji aga eleta ọgbakọ?

  • Olee ihe i nwere ike ime ka ọbịbịa ha baara gị uru?

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?

Kwa afọ, anyị na-aga mgbakọ ugboro atọ. Olee uru anyị na-erite ma anyị gaa mgbakọ ndị a?

Olee Otú E Si Hazie Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa?

Anyị na-eme ihe Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa. Olee otú anyị si ekwusa ozi ọma?