Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?

 Isi nke 5

Olee Uru Ị Ga-erite ma Ị Bịa Ọmụmụ Ihe Anyị?

Olee Uru Ị Ga-erite ma Ị Bịa Ọmụmụ Ihe Anyị?

Ajentina

Siera Liọn

Beljọm

Maleshia

Ọtụtụ ndị akwụsịla ịga chọọchị n’ihi na o nweghị ihe ha mụtara ná ndị nke ha garala aga, o nweghịkwa onye na-agba ha ume. Ma, olee ihe mere o ji dị mma ka ị na-abịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova? Oleekwa uru ị ga-erite ma ị na-abịa ya?

Obi ga-adị gị ụtọ na gị na ndị hụrụ ibe ha n’anya nọ. N’oge ochie, Onye Kraịst ọ bụla nwere ọgbakọ ọ na-eso amụ ihe. N’ọmụmụ ihe ndị ahụ, ha na-efe Chineke, na-amụ Akwụkwọ Nsọ, ma na-agba ibe ha ume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ha gaa ọmụmụ ihe, obi na-eru ha ala na ha na ndị enyi ha nọ. (2 Ndị Tesalonaịka 1:3; 3 Jọn 14) Anyị na-amụ ihe otú ahụ Ndị Kraịst oge ochie si amụ, obi na-adịkwa anyị ụtọ ka ha.

Ị ga-amụta otú e si eme ihe Baịbụl kwuru. N’oge ochie, ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka na-anọkọ mụọ Okwu Chineke. Otú ahụkwa ka anyị na-eme. Ndị ma akụzi ihe na-eji Baịbụl eme ka anyị ghọta otú anyị ga-esi na-eme ihe Okwu Chineke kwuru. (Diuterọnọmi 31:12; Nehemaya 8:8) Onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova nwere ike itinye ọnụ ma e nwee okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ, o nwekwara ike soro bụọ abụ. Ha so n’ụzọ ndị anyị si ekwupụta olileanya anyị nwere na Chineke.—Ndị Hibru 10:23.

A ga-eme ka okwukwe i nwere na Chineke sikwuo ike. Mgbe Pọl onyeozi nọ n’ụwa, ọ gwara otu ọgbakọ, sị: “Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, . . . ka anyị wee gbarịta ibe anyị ume, onye ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya, ma nke unu ma nke m.” (Ndị Rom 1:11, 12) Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na ụmụnna anyị na-akparịta. Nke a na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike, obi esiekwa anyị ike ịna-eme ihe Baịbụl kwuru.

Gbalịa bịa ọmụmụ ihe ọzọ anyị ga-enwe ka ị hụ na ihe ndị a anyị kwuru bụ eziokwu. Anyị ga-eji obi anyị niile nabata gị. Anyị anaghị ana ndị bịara ọmụmụ ihe anyị ụtụ ọ bụla.

  • Olee ndị anyị na-amụ ihe ka ha?

  • Olee uru ị ga-erite ma ị bịa ọmụmụ ihe anyị?

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?

Lee vidio a ka ị hụ ihe a na-eme na ya.

Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova

Chọpụta ebe anyị na-amụ ihe na otú anyị si amụ ihe.